Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Ọgọst p. 7
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ịhụ na Ọgbakọ Na-adị n’Udo ma Na-adị Ọcha
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ndụmọdụ Ị Na-enye Ọ̀ “Na-eme Ka Obi Dị Mmadụ Ụtọ”?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • ‘Na-akwanyerenụ Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike N’etiti Unu Ùgwù’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Ọgọst p. 7

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ndị Tesalonaịka nke Abụọ 3:14 kwuru ka ‘a hụwa ụfọdụ ndị ama.’ Ọ̀ bụ ndị okenye ka ọ̀ bụ ụmụnna nọ n’ọgbakọ ga-ekpebi onye a ga-ahụwa ama?

Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka akwụkwọ ozi, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye na-achọghị irube isi n’ihe anyị kwuru n’akwụkwọ ozi a, hụwanụ onye ahụ ama.” (2 Tesa. 3:14) Na mbụ, anyị kwuru na ọ bụ ndị okenye ka a gwara okwu a. Ọ bụrụ na mmadụ anaghị eme ihe Baịbụl kwuru n’agbanyeghị na a dụọla ya ọdụ gbasara ya ọtụtụ ugboro, ndị okenye nwere ike ikwu okwu a ga-eji gwa ọgbakọ ka ha kpachara anya. E kwuchaa okwu ahụ, ụmụnna ga-akwụsị ha na onye ahụ ịna-akpa.

Mana, e kwesịrị ịgbanwe ihe a. Ugbu a, anyị ghọtara na ihe Pọl na-ekwu okwu ya bụ mkpebi Onye Kraịst ọ bụla ga-eme ma ihe ụfọdụ mee. N’ihi ya, ọ dịghị mkpa ka ndị okenye kwuo okwu a ga-eji gwa ọgbakọ ka ha kpachara anya. Gịnị mere anyị ji gbanwee ihe a? Ka anyị lebara ihe ndị ọzọ gbara amaokwu ahụ gburugburu anya.

Pọl chọpụtara na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ “na-enupụ isi.” Ha jụrụ ndụmọdụ e si n’ike mmụọ nsọ nye ha. Oge mbụ Pọl letara ha, o nyere ha iwu, sị: “Onye ọ bụla na-achọghị ịrụ ọrụ, ya erila ihe.” N’agbanyeghị ya, ụfọdụ ndị ekweghị arụ ọrụ ha ga-eji na-elekọta onwe ha, ọ bụ eziokwu na ahụ́ gbasiri ha ike. Ihe ọzọkwa bụ na ha nọ na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha. Olee otú Ndị Kraịst ga-esi emeso ndị a na-anaghị eme ihe Baịbụl kwuru?​—2 Tesa. 3:6, 10-12.

Pọl sịrị: “Hụwanụ onye ahụ ama.” Okwu Grik e si sụgharịta ya pụtara ịchọpụta ụdị onye ahụ ma kpachara anya ka anyị ghara ịmụta àgwà ya. Ndị Pọl gwara ihe a bụ mmadụ niile nọ n’ọgbakọ, ọ bụghị naanị ndị okenye. (2 Tesa. 1:1; 3:6) N’ihi ya, Ndị Kraịst hụ ka Onye Kraịst ibe ha na-enupụrụ ndụmọdụ si n’ike mmụọ nsọ isi, ha ‘ga-akwụsị ha na ya ịkpa.’

Ihe a ọ̀ pụtara na ha ga-emeso onye a ka onye e kewapụrụ n’ọgbakọ? Mba. Pọl dere, sị: “Na-adụnụ ya ọdụ ka nwanna.” N’ihi ya, ya na ụmụnna ya ga na-akpakọrịta ma n’ozi ọma ma n’ọmụmụ ihe. Mana, ha na ya agaghị na-akpakọrịta ná nnọkọ oriri ma ọ bụ ná ntụrụndụ. N’ihi gịnị? Pọl sịrị: “Ka ihere wee mee ya.” Ọ bụrụ na a hụwa onye ahụ ama, àgwà ya nwere ike iwute ya, ya agbanwee.​—2 Tesa. 3:14, 15.

Olee otú Ndị Kraịst taa nwere ike isi ama mgbe ha ga-ahụwa mmadụ ama? Nke mbụ, anyị ga-achọ ijide n’aka na àgwà onye ahụ kpara bụ ‘inupụ isi’ n’eziokwu, dị ka Pọl kọwara. Ndị ọ na-ekwu okwu ha abụghị ndị na-eme ihe akọnuche anyị na-anabataghị, mana ya abụrụkwa na ha emebighị iwu Baịbụl. Ọ naghịkwanụ ekwu gbasara ndị mere ihe gbawara anyị obi. Kama, Pọl na-ekwu gbasara ndị kpachaara anya jụ aka ná ntị e si na Baịbụl dọọ ha.

Taa, anyị chọpụta na Onye Kraịst na-enupụ isi na ndụmọdụ e si na Baịbụl na-enye ya,a anyị ga-ekpebi na anyị na ya agaghị na-akpakọrịta ná nnọkọ oriri ma ọ bụ ná ntụrụndụ. Ebe ọ bụ na ihe a bụ ihe onye ọ bụla ga-ekpebiri onwe ya, anyị ekwesịghị ịgwa ya ndị na-abụghị ndị ezinụlọ anyị anyị na ha bi n’otu ụlọ. Anyị na nwanna ahụ ka ga na-akpakọrịta n’ọmụmụ ihe, na-arụkwa n’ozi ọma. O mechaa gbanwee, anyị na ya ga-emekọwakwa ihe ndị ọzọ.

a Dị ka ihe atụ, Onye Kraịst nwere ike ịjụ ịrụ ọrụ iji lekọta onwe ya n’agbanyeghị na ahụ́ dị ya. O nwere ike isi ọnwụ ya na onye ụwa ana-akpa maka ọlụlụ, na-agba ntụziaka a na-enye anyị n’ọgbakọ ụkwụ, na-ekwu na ihe Baịbụl na-akụzi abụghị eziokwu, ma ọ bụkwanụ na-agba asịrị. (1 Kọr. 7:39; 2 Kọr. 6:14; 2 Tesa. 3:11, 12; 1 Tim. 5:13) Ndị na-akwụsịghị ime ihe ndị a n’agbanyeghị ndụmọdụ e nyere ha “na-enupụ isi.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya