Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Disemba p. 30
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ozi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Disemba p. 30

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ndị bụ́ “ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ” e kwuru okwu ha na 1 Timoti 5:21?

Pọl onyeozi degaara Timoti, onye bụ́kwa okenye ibe ya, akwụkwọ ozi, sị: “Ana m agwasi gị ike n’ihu Chineke, na n’ihu Kraịst Jizọs, na n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ, ka i lezie anya na-eme ihe ndị a n’eleghị onye ọ bụla anya n’ihu.”​—1 Tim. 5:21.

Iji nyere anyị aka ịmata ndị bụ́ ndị mmụọ ozi a na-ekwu okwu ha ebe a, anyị ga-ekwu ndị mmụọ ozi na-esoghị na ha. O doro anya na ha abụghị ndị so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000). Mgbe Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi, a malitebeghị ịkpọlite ndị e tere mmanụ n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe. Ndịozi na ndị ọzọ e tere mmanụ aghọbeghị ndị mmụọ ozi. N’ihi ya, ọ bụghị ha bụ “ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ” a na-ekwu okwu ha.​—1 Kọr. 15:50-54; 1 Tesa. 4:13-17; 1 Jọn 3:2.

Ihe ọzọ bụ na “ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ” agaghị abụ ndị mmụọ ozi ndị ahụ nupụrụ isi n’oge Iju Mmiri. Ndị nke ahụ kwadoro Setan ma ghọọ ndị mmụọ ọjọọ, ndị bụ́ ndị iro Jizọs. (Jen. 6:2; Luk 8:30, 31; 2 Pita 2:4) N’ọdịnihu, a ga-atụ ha mkpọrọ n’abis ruo otu puku (1,000) afọ, e mechaa, e bibikọta ha na Ekwensu.​—Jud 6; Mkpu. 20:1-3, 10.

“Ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ” Pọl kwuru okwu ha ga-abụrịrị ndị mmụọ ozi na-akwado ‘Chineke na Jizọs Kraịst’ e kwuru okwu ha n’amaokwu ahụ.

E nwere ọtụtụ puku ndị mmụọ ozi na-erubere Chineke isi. (Hib. 12:22, 23) Anyị ekwesịghị iche na ha niile na-arụ otu ọrụ. (Mkpu. 14:17, 18) Cheta na e nwere mgbe e nyere otu mmụọ ozi ọrụ igbu ndị agha Asiria dị otu narị puku mmadụ na puku iri asatọ na puku ise (185,000). (2 Eze 19:35) Ọ ga-abụ na e nwere ụfọdụ ndị mmụọ ozi e nyere ọrụ isi “n’Alaeze [Jizọs] chịkọta ndị niile na-eme ka ndị ọzọ mee mmehie nakwa ụmụ mmadụ ndị na-emebi iwu.” (Mat. 13:39-41) Ọ ga-abụ na e nwekwara ndị nke e nyere ọrụ ‘ịchịkọta ndị ọ họọrọ’ gaa eluigwe. (Mat. 24:31) E nwekwara ndị e nyere ọrụ ‘ịna-eche anyị nche n’ebe ọ bụla anyị na-aga.’​—Ọma 91:11; Mat. 18:10; i nwere ike ịtụle Matiu 4:11; Luk 22:43.

Ebe otu mmụọ ozi du otu di na nwunye na-aga n’otu ụlọ mgbe ha nọ n’ozi ọma. Otu nwoke nọ n’ụlọ ahụ na-ekpe ekpere.

“Ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ” e kwuru okwu ha na 1 Timoti 5:21 ga-abụ ndị mmụọ ozi e nyere ọrụ pụrụ iche gbasara ndị Chineke. N’amaokwu ahụ, Pọl nyere ndụmọdụ banyere otú ndị okenye ga-esi na-arụ ọrụ ha nakwa na ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù. Ndị okenye n’onwe ha kwesịrị ịna-arụ ọrụ ha “n’eleghị onye ọ bụla anya n’ihu.” Ha ekwesịghịkwa ime mkpebi n’ebughị ụzọ chee ya nke ọma. Ihe dị mkpa mere ha ga-eji mee ihe Pọl kwuru bụ na ha nọ “n’ihu Chineke, na n’ihu Kraịst Jizọs, na n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ.” N’ihi ya, o doro anya na e nwere ndị mmụọ ozi e nyere ọrụ gbasara ọgbakọ, dị ka ichebe ha, ilekọta ozi ọma a na-ekwusa, nakwa ịgwa Jehova ihe ha hụrụ.​—Mat. 18:10; Mkpu. 14:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya