Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp25 nke 1 p. 6-8
  • Ụmụ Mmadụ Hà Ga-akwụsịli Agha?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụ Mmadụ Hà Ga-akwụsịli Agha?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ ỌCHỊCHỊ NA-AGBALỊ IME KA IHE DỊTỤRỤ NDỊ MMADỤ NÁ MMA
  • NDỊ ỌCHỊCHỊ NA-AGBALỊ IME KA MBA NDỊ NA-ESE OKWU NWEE NKWEKỌRỊTA
  • NDỊ ỌCHỊCHỊ NA-AGBALỊ IKWETA IBELATA NGWÁ AGHA
  • NDỊ ỌCHỊCHỊ NA-AGBALỊ KA HA NA MBA NDỊ ỌZỌ JIKỌỌ AKA IJI GBOCHIE AGHA
  • Ịgbalị Ịhụ na Mba na Mba Dị ná Mma Ọ̀ Ga-eweta Udo n’Ụwa?
    Teta!—2004
  • Gịnị Bụ Ọdịnihu nke Agha?
    Teta!—1999
  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Enweghị Ike Ime Ka Udo Dịrị n’Ụwa?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Olee Mgbe A Ga-akwụsị Ịlụ Agha Ndị A Na-alụ Ugbu A?—Gịnị Ka Baịbụl kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2025
wp25 nke 1 p. 6-8

Ụmụ Mmadụ Hà Ga-akwụsịli Agha?

E nwere ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji alụ agha. Ụfọdụ na-alụ agha iji gbanwee ọchịchị ma ọ bụ iji mee ka ihe isi ike ma ọ bụ mmegbu kwụsị. E nwekwara ndị na-alụ agha iji zọta ala na akụ̀ ndị dị n’ime ala. Ihe na-akpata ọtụtụ agha a na-alụ bụ esemokwu dịterela aka n’etiti otu agbụrụ na ibe ya ma ọ bụ otu okpukpe na okpukpe ọzọ. Gịnị ka ndị mmadụ na-eme iji kwụsị agha ma mee ka udo dị? Ànyị kwesịrị ịtụ anya na ụmụ mmadụ ga-emeli ka agha kwụsị?

Foto dọkara adọka nke na-egosi ebe ndị na-arụ ụlọ na-ekwurịta gbasara ọrụ ha na-arụ.

Drazen_/E+ via Getty Images

NDỊ ỌCHỊCHỊ NA-AGBALỊ IME KA IHE DỊTỤRỤ NDỊ MMADỤ NÁ MMA

Ihe ha bu n’obi: Ka e mee ka ndị mmadụ na-enweta ihe ndị e ji ebi ndụ. Ihe a nwere ike ime ka ịda ogbenye belata ma ọ bụkwanụ kwụsịchaa n’ihi na ịda ogbenye so n’ihe kacha akpata agha.

Ihe mere o ji esi ike: Ọ pụtara na ndị ọchịchị ga-agbanwe otú ha si emefu ego. N’afọ 2022, e mefuru ihe karịrị ijeri dọla iri atọ na anọ iji mee udo n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ma, ihe a erughịdị ọkara otu ụzọ n’ime ụzọ iri nke ego niile e mefuru n’ịlụ agha n’otu afọ ahụ.

“Anyị na-emefu ego buru ezigbo ibu n’inyere ndị a na-alụ agha n’obodo ha aka karịa ka anyị na-emefu n’igbochi agha na ime udo.”​—António Guterres, onyeisi Òtù Mba Ụwa.

Ihe Baịbụl kwuru: Ndị ọchịchị ụwa na òtù dị iche iche nwere ike inyere ndị ogbenye aka, ma ha agaghị emeli ka ndị mmadụ kwụsị ịda ogbenye.​—Diuterọnọmi 15:11; Matiu 26:11.

Foto dọkara adọka nke na-egosi ebe mmadụ abụọ na-ekwe n’aka iji gosi na ha ekwekọrịtala.

NDỊ ỌCHỊCHỊ NA-AGBALỊ IME KA MBA NDỊ NA-ESE OKWU NWEE NKWEKỌRỊTA

Ihe ha bu n’obi: Ka ndị na-ese okwu kwurịta okwu ma kwekọrịta otú a ga-esi edozi esemokwu ha ma ọ bụ gbochie ya n’emegbughị onye ọ bụla.

Ihe mere o ji esi ike: A na-enwekarị ndị kwe na ndị ekweghị. Ihe a na-eme ka ụfọdụ ndị ghara ịchọ ka e nwee nkwekọrịta ma ọ bụ ikweta ihe e kpebiri. Ihe ọzọ bụ na ọ naghị ara ahụ́ e mebie ihe e kwekọrịtara.

“Ọ bụghị mgbe niile ka inwe nkwekọrịta na-eme ka agha bie. Nkwekọrịta e nwere nwedịrị ike ime ka agha a na-alụ ka njọ maka na ihe e kwekọrịtara adabaghị adaba.”​—Raymond F. Smith, n’akwụkwọ bụ́ American Diplomacy.

Ihe Baịbụl kwuru: Ndị mmadụ kwesịrị ‘ịna-achọ udo.’ (Abụ Ọma 34:14) Ma, ọtụtụ ndị taa bụ “ndị na-agharịpụ ndị ọzọ, . . . ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla, . . . ndị na-eme ndị enyi ha ihe ọjọọ.” (2 Timoti 3:1-4) Àgwà ndị a ndị mmadụ nwere na-eme ka o siere ndị ọchịchị nwere ezi obi ike idozi esemokwu.

Foto dọkara adọka nke na-egosi égbè a kụjasịrị akụjasị.

NDỊ ỌCHỊCHỊ NA-AGBALỊ IKWETA IBELATA NGWÁ AGHA

Ihe ha bu n’obi: Ka e belata ngwá agha ma ọ bụ bibichaa ngwá agha niile, karịchaa, ngwá agha ọgwụrụmba na ndị nke e tinyere kemikal na-egbu mmadụ.

Ihe mere o ji esi ike: Ọtụtụ mba anaghị achọ ibelata ngwá agha ha n’ihi na ha na-atụ ụjọ na ibelata ya ga-eme ka ha gharazie isi ike ma ọ bụ ka ọ dịrị mba ndị ọzọ mfe ịlụso ha agha. Mba niile bibichagodị ngwá agha ha, ha agaghị ewepụli ihe mere ndị mmadụ ji alụ agha.

“Ọtụtụ mba emezughị nkwa ha kwere ibelata ngwá agha ha mgbe afọ 1991 gachara. Ha emezughịkwa nkwa ha kwere ime ihe ndị ha kwesịrị ime iji belata esemokwu mba na mba, nke ga-eme ka ụwa dịkwuo n’udo, obi erukwuo ndị mmadụ ala.”​—Mpempe akwụkwọ a kpọrọ “Securing Our Common Future: An Agenda for Disarmament.”

Ihe Baịbụl kwuru: Ndị mmadụ kwesịrị ‘ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè.’ (Aịzaya 2:4) Ma, ọ bụghị naanị ya ga-eme ka agha kwụsị n’ihi na ọ bụ n’obi ka echiche igbu onye ọzọ na-amalite.​—Matiu 15:19.

Foto dọkara adọka nke na-egosi ebe ndị isi mba dị iche iche nọ ọdụ n’oche gbaa otu tebụl gburugburu. Ha niile na-abịanye aka n’otu akwụkwọ.

NDỊ ỌCHỊCHỊ NA-AGBALỊ KA HA NA MBA NDỊ ỌZỌ JIKỌỌ AKA IJI GBOCHIE AGHA

Ihe ha bu n’obi: Ka mba dị iche iche jikọọ aka ọnụ ma kwekọrịta ịgbachitere ibe ha. Ha na-ekwu na ihe a ga-eme ka a ghara inwe mba ga-alụso mba ọzọ agha maka na ọ bụzi ọtụtụ mba ka ha na ya ga-achịpụ ya.

Ihe mere o ji esi ike: Ịtụ ụjọ na ọtụtụ mba ga-alụso otu mba agha anaghị emecha ka udo dị. Ụfọdụ mba anaghị emezu nkwa ha kwere ịgbachitere mba ha na ha jikọtara aka, ha anaghịkwa enwe otu olu gbasara otú ha ga-esi alụ agha ahụ na mgbe ha ga-alụ ya.

‘Njikọ Mba Niile gbasiri mbọ ike inyere mba dị iche iche aka ka ha jikọọ aka ọnụ, Òtù Mba Ụwa ka na-emekwa otu ihe ahụ ugbu a, ma mba dị iche iche ijikọta aka ọnụ emebeghị ka a kwụsị ịlụ agha.’​—Akwụkwọ bụ́ “Encyclopedia Britannica.”

Ihe Baịbụl kwuru: Ìgwè bụ ike. (Ekliziastis 4:12) Ma, ọchịchị ụmụ mmadụ na òtù dị iche iche agaghị emeli ka udo dịtee aka nakwa ka obi ruo ndị mmadụ ala. “Unu atụkwasịla ndị isi obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ. Ọ kwụsị iku ume, ọ na-alaghachi n’ájá. N’ụbọchị ahụ, ọ na-akwụsị iche echiche.”​—Abụ Ọma 146:3, 4.

N’agbanyeghị mbọ ọtụtụ mba na-agba ka udo dị, agha ka na-akpa mkpamkpa n’ebe dị iche iche.

Udo ọ̀ dị n’ụwa ugbu a karịa n’oge mbụ?

O nwere ndị na-ekwu na udo dị n’ụwa ugbu a karịa otú ọ dịtụrụla. Ha na-ekwu na a naghịzi alụte agha aka ugbu a nakwa na agha anaghịzi ata isi ọtụtụ ndị ma e jiri ya tụnyere ndị nke a lụrụ ọtụtụ afọ gara aga. Ma, e nwere ndị na-ekwetaghị. Ha chere na e nwere ihe ndị ọzọ e kwesịrị ichebara echiche ma e wepụ mmadụ ole na-anwụ n’agha.

N’agbanyeghị ihe ụfọdụ ndị na-ekwu, o doro ewu na ọkụkọ anya na agha na-akpa ọtụtụ ndị bi n’ụwa aka ọjọọ n’oge a, ọ na-emetụtakwa anyị niile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya