Gịnị Bụ Ọdịnihu nke Agha?
“KA AFỌ 4000 nke ime nnwale na imegharị nnwale na-agafe, ịlụ agha aghọọla àgwà,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere agha bụ́ John Keegan kwuru. À ga-ahapụ àgwà ahụ? E werewo ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ mmadụ chụọ àjà n’agha. Ume ọrụ dị ukwuu na ọtụtụ ihe ndị si n’okike akwalitewo ịlụ agha. Ruo ọtụtụ puku afọ, ndị nwere ọgụgụ isi etinyewo uche ha n’ịchọpụta ụzọ ndị ọhụrụ na ndị ka mma isi gbuo mmadụ ma bibie ihe. Ụmụ mmadụ hà na-egosipụta otu ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ n’ịkwalite udo? O sika ike! Ma, ọtụtụ ndị ji nlezianya na-eche na e nwere ụfọdụ ihe ndị mere a ga-eji nwee nchekwube.
Echiche Bụ́ na Agha Abaghị Uru
Nchekwube ahụ dabeere ná nkweta bụ́ na ndị mepere anya adịghịzi ele agha anya dị ka ha leburu ya. Na narị afọ nke 13, a kọrọ na dike ndị Mongol bụ́ Genghis Khan kwuru, sị: “Obi ụtọ na-esite ná mmadụ imeri ndị iro ya, n’ịchụgharị ha n’ihu ya, n’ịkwakọrọ ihe onwunwe ha, n’inwe ọṅụ n’ihi obi nkoropụ ha, n’idina nwunye ha na ụmụ ha ndị inyom n’ike.”
O sika ike mmadụ iche n’echiche na onye ndú ụwa ga-ekwu ihe dị otú ahụ taa! Akwụkwọ bụ́ A History of Warfare na-ekwu, sị: “Ịkpali nkwado ezi uche dị na ya nke echiche ahụ bụ́ na agha bụ ihe omume ziri ezi, fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-apụghị ikwe omume n’ebe ọ bụla n’ụwa taa.” A dịghịzi ele agha anya n’ebe nile dị ka ihe dị otú o kwesịrị, ebumpụta ụwa, ihe kwesịrị otuto, ma ọ bụ ihe ziri ezi. Oké mgbukpọ weere ọnọdụ n’agha ndị a lụrụ na narị afọ nke 20 emewo ka ihe a kpọrọ mmadụ nwee echiche ịtụ ihe agha na-akpata egwu na ịkpọ ya asị. Otu onye kwupụtara na asị a a kpọrọ ime ihe ike edujewo n’ịkagbu amamikpe ogbugbu n’ọtụtụ mba, ọ kwalitewokwa inwe ọmịiko n’ahụ ndị jụrụ ikere òkè n’ihe omume ndị metụtara agha.
Ịkpọasị siri ike a kpọrọ mgbuchapụ ahụ abụghị nanị ihe kpatara mgbanwe àgwà. E nwekwara okwu dị mkpa banyere nchebe onwe onye. Ikike ibibi ihe nke ngwá agha ndị ọgbara ọhụrụ, ma nke nuklia ma ndị na-abụghị nke nuklia, dị nnọọ ukwuu nke na agha ọ bụla dara n’etiti mba ndị kasị bụrụ dike taa ga-akpata ihe ize ndụ nke igbuchapụrịta onwe ha. Ịkpata agha nke ga-emetụta ọtụtụ ndị bụ ịwị ara, igbu onwe onye. Ọ bụ nkweta a, ka ọtụtụ na-arụ n’ụka, bụ ihe gbochiworo agha nuklia kemgbe ihe karịrị afọ 50.
E nwekwara ihe ọzọ mere ndị mmadụ ji enwe echiche dị iche banyere ọdịnihu. A na-ele agha metụtara ọtụtụ ndị anya dị ka ihe na-abaghị uru, ọ bụghị nanị n’ihi na a pụrụ ịtụfu ihe nile kamakwa n’ihi na a pụrụ inweta ihe dị nnọọ nta. Arụmụka metụtara ọnọdụ akụ̀ na ụba bụ́ nke na-akagbu ohere e nwere ịlụ agha bụ nke a: Mba ndị bara ọgaranya ma sie ike n’ụwa na-erite uru dị ukwuu site ná mmekọrịta akụ̀ na ụba ha na ndị ọzọ. A pụghị iji ihe onwunwe nke mba ndị a na-enweta n’oge udo tụnyere nke ọ bụla ha pụrụ inweta n’oge agha. Ya mere, e nwere ezi ihe mere mba ndị siri ike na ibe ha ga-eji nọgide na-adị n’udo. Ọzọkwa, ijikọta aka ọnụ kwụsị agha n’etiti mba ndị na-esirughị ike ka ha bụ́ nke na-eyi ọnọdụ akụ̀ na ụba e nwere ugbu a egwu, ga-abara ha uru.
Mgbalị Zuru Ụwa Ọnụ Iji Weta Udo
E gosipụtara ọchịchọ e nwere ịkwụsị agha n’okwu mmalite dị n’akwụkwọ nguzobe nke Mba Ndị Dị n’Otu. N’ebe ahụ anyị na-agụ banyere mkpebisi ike nke mba ndị so n’òtù ahụ “ichebe ọgbọ ndị na-abịa n’ihu pụọ n’ihe otiti nke agha, bụ́ nke wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ oké iru újú ugboro abụọ n’oge ndụ anyị [n’agha ụwa abụọ ndị ahụ a lụrụ].” E gosipụtara mkpebisi ike ichebe ọgbọ ndị dị n’ihu pụọ n’agha n’echiche nke nchebe a gbakọrọ aka guzobe—echiche nke bụ́ na mba dịgasị iche kwesịrị ijikọ aka ọnụ megide mba ọ bụla a maara dị ka nke na-eme mwakpo. Ya mere, ọ bụrụ na mba ọ bụla chọrọ imalite agha, ọ ga-eche ọnụma nke ndị mba ụwa ihu.
Ọ bụ ezie na echiche ahụ dị mfe ma bụrụ ihe ezi uche dị na ya n’ikwu ya ekwu, itinye ya n’ọrụ abụwo ihe ọzọ. The Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na nchebe a gbakọrọ aka guzobe, n’ụdị dịgasịtụ iche, bụ akụkụ pụtakasịrị ìhè ná Nkwekọrịta nke Njikọ Mba Nile, bụrụkwa akụkụ nke Akwụkwọ Nguzobe Mba Ndị Dị n’Otu, ọ rụpụtaghị ihe ọ bụla na ha abụọ. N’ihi enweghị ọchịchị mba nile nke nwere ike ikpebi okwu ndị ahụ kpam kpam, mba nile ekwekọrịtabeghị nnọọ ná nkọwa doro anya nke ihe bụ́ ime mwakpo, n’omume, ha anabatabeghị ụkpụrụ ahụ bụ́ na a ghaghị ime ihe megide ime mwakpo n’agbanyeghị onye bụ́ onye mwakpo ahụ, n’ihi ya, ha ehiwebeghịkwa ndị agha nchebe a gbakọrọ aka guzobe nke mba nile dị irè bụ́ nke a tụrụ anya ya n’Akwụkwọ Nguzobe ahụ.”
Ka o sina dị, echiche nke iguzobe otu òtù mba nile ịkwalite udo bụ ihe ọhụrụ n’ihe omume mmadụ. Nye ọtụtụ ndị na-achọsi udo ike, ome udo nke òtù UN, nke yi okpu na-acha anụnụ anụnụ, ka bụ ihe nnọchiteanya nke olileanya. Ha nwere otu ụdị echiche ahụ otu odeakụkọ nwere, bụ́ onye kwuru okwu ịja mma banyere “echiche nke onye soja udo, nke a na-ezije n’ebe a na-alụ agha, ọ bụghị ịlụ agha, kama ịkwalite udo, ọ bụghị ibuso ndị iro agha, kama inyere ndị enyi aka.”
Ruo ọtụtụ iri afọ Agha Nzuzo kewara òtù UN ụzọ abụọ nke mba ndị dị ike mejupụtara, nke ọ bụla ana-achọ imebi ihe ọ bụla ibe ha chọrọ ime. Ọ bụ ezie na nkwụsị nke Agha Nzuzo ewepụbeghị agha, enweghị ntụkwasị obi, na mba dịgasị iche inyo ibe ha enyo, ọtụtụ kweere na ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ugbu a na-enye òtù UN ohere na-enweghị atụ ime ihe otú a tụrụ anya n’aka ya.
Ihe ndị ọzọ mere na narị afọ nke 20 na-enyekwa ndị na-achọsi udo ike olileanya. Dị ka ihe atụ, nzube nke mmekọrịta mba na mba bụ idozi esemokwu n’udo. Ihe enyemaka e ji akwalite ọdịmma ndị mmadụ na-enyere mba dịgasị iche aka ime ka ọnọdụ mba ndị ọzọ dịghachi mma, ọ na-enyekwara ndị agha menyụrụ anya aka. Ma ime udo ma nkwalite nke ọdịmma ndị mmadụ aghọwo akụkụ nke iwu metụtara mba ndị ọzọ. A na-akwanyere ndị na-akwalite udo ùgwù.
Otú Agha Ga-adị n’Ọdịnihu
Otú ọ dị, a ghaghị ime ka echiche ọ bụla nke inwe nchekwube na eziokwu ụfọdụ ndị na-adịchaghị enye olileanya hara nhata. Mgbe Agha Nzuzo biri na 1989, ọtụtụ ndị kwupụtara obi ike ha nwere n’usoro ihe ụwa nke dị n’udo. Ma, agha gara n’ihu. N’afọ asaa ndị sochirinụ, ihe e mere atụmatụ ya ịbụ agha 101 gara n’ihu n’ebe dị iche iche. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha abụghị agha mba na mba kama agha obodo. Ọ bụ ìgwè na-emegiderịta ibe ha jiri ngwá agha ndị na-abụghị ọkpọka lụọ ha. Dị ka ihe atụ, na Rwanda ọ bụ mma ogè ka e ji gbuo ọtụtụ ndị.
Ọgbọ agha nke oge a na-abụkarị obodo na obodo nta, e nwechaghịkwa ọdịiche na-adị n’etiti ndị na-alụ agha na ndị nkịtị. Michael Harbottle, bụ́ onyeisi nke Ogige Na-ahụ Maka Ịkwalite Udo nke Mba Nile dere, sị: “Ọ bụ ezie na n’oge gara aga ọ pụrụ ịbụworị na e kwutetụrụ ihe ndị ga-akpata agha, taa ha dị mgbagwoju anya karị ma sikwuokwa ike nke ukwuu ịchịkwa. Ọ̀tụ̀tụ̀ ime ihe ike ndị a na-eme na ha dị ịtụnanya ma bụrụ nke ezi uche na-adịtụghị na ha. A na-egbu nnọọ ndị nkịtị otú e si egbu ndị na-alụ agha.” Agha ndị dị otú ahụ a na-eji ngwá agha ndị na-abụghị ọkpọka alụ eyighị ihe ga-akwụsị akwụsị.
Ka ọ dịgodị, mkpụpụta nke ngwá agha ndị bụ́ ọkpọka ná mba ndị bara ọgaranya n’ụwa ka na-aga n’ihu n’ike n’ike. Ihe mgbaàmà—ma e debere ha n’ikuku, na mbara igwe, n’ime oké osimiri, ma ọ bụ n’elu ala—na-eme ka usuu ndị agha nke n’oge a nwee ike ịhụ ihe ngwa ngwa nke ọma karịa oge ọ bụla ọzọ, ọbụna n’ebe siri ike, dị ka n’oké ọhịa. Ozugbo ihe mgbaàmà nyochapụtara otu ebe, a pụrụ ịgbaga mgbọ ogbunìgwè, bọmbụ torpedo, ma ọ bụ bọmbụ ọkụ laser na-achịkwa n’ebe ahụ—n’ụzọ dị ịtụnanya, ha na-agakarị kpọmkwem n’ebe a gbagara ha . Ka a na-eme ka nkà na ụzụ ndị ọhụrụ dịkwuo mma ma na-achịkọta ha ọnụ, “agha e si ebe dị anya na-alụ” na-aghọwanye ihe na-eme eme, na-eme ka usuu ndị agha nwee ike ịhụ ihe nile, ịtụ ihe nile bọmbụ, na ibibi ọtụtụ ihe onye iro ya nwere.
N’ịtụle atụmanya nke agha a ga-alụ n’ọdịnihu, anyị ekwesịghị ichefu ịdị adị nke ngwá agha nuklia na-eyi egwu. Magazin bụ́ The Futurist buru amụma, sị: “Mmụba na-aga n’ihu nke ngwá agha atọm na-eme ka o yikwuo ihe ga-ekwe omume na anyị ga-enwe otu agha ma ọ bụ karịa e ji bọmbụ atọm lụọ n’afọ 30 ọzọ. Tụkwasị na nke a, ndị na-eyi ọha egwu pụrụ iji ngwá agha atọm mee ihe.”
Gịnị Bụ Nsogbu?
Olee ihe meworo ka mgbalị ndị e mere iji weta udo zuru ụwa ọnụ kụọ afọ n’ala? Otu ihe doro anya kpatara ya bụ na ezinụlọ mmadụ adịghị n’otu. E kewagasịrị ihe a kpọrọ mmadụ ná mba ná mba na n’agbụrụ n’agbụrụ ndị na-atụkwasịghị ibe ha obi, na-akpọrịta onwe ha asị, ma ọ bụ na-atụrịta onwe ha egwu. E nwere ụkpụrụ, echiche na ihe mgbaru ọsọ ndị dịgasị iche. Ọzọkwa, e lewo ibu agha anya eri ọtụtụ iri narị afọ dị ka ụzọ ziri ezi isi chọọ ọdịmma nke mba. Mgbe o kwetasịrị ịdị adị nke ọnọdụ a, otu akụkọ nke Ngalaba Maka Ime Atụmatụ Agha nke Kọleji Ndị Agha Dị na United States kwuru, sị: “Nye ọtụtụ ndị, nke a pụtara na ọ bụ nanị ọchịchị ụwa ga-eweta udo.”
Ụfọdụ echewo na Mba Ndị Dị n’Otu pụrụ ịbụ ọchịchị ahụ. Ma ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla òtù UN zubere ịbụ ọchịchị ụwa nwere ikike karịrị nke mba ndị ahụ so na ya. O nwere ikike ruo nanị ókè mba ndị so na ya nyere ya. Mba ndị ahụ ka na-enyo ibe ha enyo, enwebeghịkwa nkwekọrịta n’etiti ha, ikike ha nyere òtù UN bụkwa nke a kpaara ókè. N’ihi ya, kama imezi usoro ihe nke mba nile, òtù UN ka nọgidere na-abụ ihe yiri ya karị.
Ka o sina dị, udo zuru ụwa ọnụ ga-adịrịrị n’ụwa. Isiokwu na-esonụ na-egosi otú nke ahụ ga-esi mee.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]
“IHE A KPỌRỌ MMADỤ AGHAGHỊ IBIBI AGHA, MA Ọ BỤGHỊ YA AGHA GA-EBIBI IHE A KPỌRỌ MMADỤ.”—JOHN F. KENNEDY
[Foto dị na peeji nke 17]
Òtù UN abụrụbeghị ọchịchị ụwa
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto UN