Ụwa Agha Na-adịghị Ò Kwere Omume?
CHEE echiche banyere ahụghị ma ọ bụ enweghị ahụmahụ ọjọọ bụ́ ezie mgbe ọ bụla banyere agha na ihe ọ na-akpata. Chee echiche banyere anụghị ụda égbè ma ọ bụ bọmbụ mgbe ọ bụla, ekirighị ìgwè ndị ọsọ ndụ na-agba ọsọ mgbe ọ bụla, bụ́ ndị ọ fọrọ nke nta ka agụụ gụgbuo, echeghị mgbe ọ bụla ma gị ma ọ bụ onye ị hụrụ n’anya ga-anwụ n’ajọ esemokwu na-enweghị isi. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe magburu onwe ya ibi n’ime ụwa nke agha na-adịghị!
‘Ọ bụghị atụmanya ga-ekwe omume,’ ka ị pụrụ ikwu. Ma, atụmanya nke ụwa dị n’udo siri ike n’ime nanị afọ ole na ole gara aga. Na 1990 na 1991, ọtụtụ ndị na-ekwu na mba dị iche iche nọ ná mmalite nke oge ọhụrụ nke ịnọ ná ntụkwasị obi na njikọ aka. N’igosipụta echiche dị n’oge ahụ, George Bush, onye isi ala mba United States n’oge ahụ, kwuru okwu n’ọtụtụ oge banyere “ndokwa ụwa ọhụrụ” nke na-ebilite.
Gịnị mere e ji nwee nchekwube ahụ? Agha Nzuzo ahụ abịawo ná njedebe. Ruo ihe karịrị 40 afọ, iyi egwu nke agha nuklia ekorowo n’elu ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ na-eyi egwu dị ka mma agha e ji eriri dị nta liwe n’elu. Ma mgbe Ọchịchị Kọmunist dara, mgbe e kewasịchakwara Soviet Union, iyi egwu nke mgbukpọ nuklia yiri ka ọ pụwo n’anya. Ụwa kuuru ume ndụ.
E nwere ihe ọzọ bụ isi mere ndị mmadụ ji jiri nchekwube lee ọdịnihu anya, na ihe mere ọtụtụ ka ji na-eme otú ahụ. Ruo iri afọ anọ ịma aka dị n’etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ebe Ọdịda Anyanwụ emewo ka òtù Mba Ndị Dị n’Otu yie nnọọ òtù arụmụka. Ma ngwụsị nke Agha Nzuzo ahụ tọhapụrụ òtù UN ime ihe e guzobere ya ka o mee—ịrụ ọrụ iji weta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi zuru mba nile.
Òtù UN emesiwanyewo mgbalị ya ike igbochi ịlụ agha n’afọ ndị na-adịbeghị anya. N’ịbụ nke e ji ìgwè ndị agha sitere ná mba ndị so n’òtù ahụ kwadebe, Mba Ndị Dị n’Otu tinyekwuru aka n’agha ime udo n’ime afọ 4 bu 1994 ụzọ karịa n’ime 44 afọ ndị bu ụzọ. Ihe dị ka 70,000 ndị nkịtị na ndị agha jere ozi n’agha 17 nke ime udo n’ụwa nile. N’ime afọ abụọ nanị, mmefu ime udo ji ihe karịrị okpukpu abụọ ruo $3.3 ijeri na 1994.
Boutros Boutros-Ghali, odeakwụkwọ ukwu nke òtù UN, dere na nso nso a, sị: “E nwere ihe àmà na usoro ịnọ ná ntụkwasị obi e jikọrọ ọnụ nke e guzobere na San Francisco n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 50 afọ gara aga [ná nguzobe nke òtù UN] emesịwo malite ịrụ ọrụ dị ka e cheburu . . . Anyị nọ n’ụzọ inweta usoro zuru mba nile ọnụ nke dị irè.”
N’agbanyeghị ihe ndị a meworonụ, echiche nke ndokwa ụwa ọhụrụ ji ọsọ na-apụ n’anya. Gịnị meworo olileanya ahụ gbara ọchịchịrị maka ụwa nke agha na-adịghị? È nwere ihe mere a ga-eji kwere na ọ dị mgbe anyị ga-enwe udo zuru ụwa ọnụ? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 11]
Ụgbọ elu agha: USAF photo
Égbè ndị e ji alụso ụgbọ elu ọgụ: U.S. National Archives photo