Iri Afọ Ise nke Mgbalị Dara Ada
“ANYỊ BỤ́ NDỊ ÒTÙ NKE MBA NDỊ DỊ N’OTU KPEBISIRI IKE ichebe ọgbọ ndị na-abịa n’ihu [pụọ] n’ihe otiti nke agha, bụ́ nke wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ oké iru újú ugboro abụọ n’oge ndụ anyị, na imesighachi okwukwe ike n’ikike ndị bụ isi ruuru mmadụ, n’ùgwù na uru nke onye bụ mmadụ, n’ịha nhata nke ihe ndị ruuru ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na nke ruuru mba ndị ukwu na ndị nta, . . .”—Okwu mmeghe nke Akwụkwọ Iwu òtù Mba Ndị Dị n’Otu.
OCTOBER 24, 1995, kara ịgba 50 afọ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu akara. Mba 185 dum bụ ndị òtù nke òtù ahụ ugbu a mikpuru onwe ha n’ụkpụrụ na mgbaru ọsọ ndị mbụ nke òtù ahụ dị ka e kwupụtara ya n’akwụkwọ iwu ahụ: ịhụ na e nwere udo na ịnọ ná ntụkwasị obi zuru mba nile; ịbịanyụ omume mwakpo ndị na-eyi udo ụwa egwu; ịkwalite mmekọrịta enyi n’etiti mba dị iche iche; ichebe nnwere onwe ndị bụ isi nke ndị nile n’akpaghị ókè agbụrụ, ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, asụsụ, ma ọ bụ okpukpe; na ịhụ na e nwere mmekọ ihe ọnụ nke mba nile n’ịgwọta nsogbu akụ̀ na ụba, ọha mmadụ, na nke ọdịbendị.
Ruo 50 afọ òtù Mba Ndị Dị n’Otu emewo mgbalị ndị dị ịrịba ama iji weta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ụwa. N’ụzọ a pụrụ ịrụ ụka, ọ pụrụ ịbụ na o gbochiwo agha ụwa nke atọ, e nwebeghịkwa ọzọ oké mbibi nke ndụ mmadụ site n’iji bọmbụ nuklia mee ihe. Òtù Mba Ndị Dị n’Otu enyewo ọtụtụ nde ụmụaka ihe oriri na ọgwụ. Ọ tụnyewo ụtụ n’ọnọdụ ahụ ike ndị ka mma n’ọtụtụ mba, na-enye mmiri ọṅụṅụ ka mma na ọgwụ mgbochi ọrịa pụọ n’ọrịa ndị dị ize ndụ, gụnyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọtụtụ nde ndị gbara ọsọ ndụ enwetawo enyemaka obi ebere.
N’iji jaa ya mma maka ihe ndị ọ rụzuworo, e nyewo òtù Mba Ndị Dị n’Otu onyinye Nobel Peace Prize ugboro ise. Ma, ihe dị mwute nke bụ eziokwu bụ na anyị a ka ebiribeghị n’ime ụwa nke agha na-adịghị na ya.
Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị A Na-erughị
Mgbe 50 afọ nke ime mgbalị gasịworo, udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ka bụ ihe mgbaru ọsọ ndị a na-erubeghị. N’otu okwu ọ gwara Nzukọ Ezumezu nke Mba Ndị Dị n’Otu na nso nso a, onye isi ala United States gosipụtara nkụda mmụọ ya site n’ikwu na “narị afọ nke a nke jupụtara nnọọ n’olileanya na ohere na ihe ndị a rụzuworo abụwokwa ọgbọ nke oké mbibi na obi nkoropụ.”
Ka 1994 gwụsịrị, akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 150 agha ma ọ bụ ntakịrị agha na-aga n’ihu ugbu a bụ́ nke ọtụtụ puku mmadụ na-anwụ n’ime ha—nke ka ná ndị nkịtị karịa ndị soja dị ka ngụkọ ka ukwuu na-egosi—ọtụtụ narị puku na-aghọkwa ndị gbara ọsọ ndụ.” Ngalaba Mgbasa Ozi Ọha na Eze nke Mba Ndị Dị n’Otu kọrọ na kemgbe 1945 ihe karịrị 20 nde mmadụ anwụọla n’ihi agha dị iche iche. Onye nnọchianya mba United States n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ Madeleine Albright, kwuru na “agha dị iche iche nke ógbè dị njọ ugbu a karị n’ọtụtụ ụzọ.” Mmebi nke ihe ndị ruuru mmadụ na ịkpa ókè na-apụta n’akụkọ kwa ụbọchị. Ọtụtụ mba yiri ka ha na-ekwe ka ibe nọrọ kama imeta ha enyi.
Sir David Hannay, bụ́ onye nnọchianya Britain n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu, kwetara na “òtù Mba Ndị Dị n’Otu anọwo na-abụ, rute n’afọ ndị 1980, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ezi nzube obi dara ada.” Odeakwụkwọ ukwu nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ Boutros Boutros-Ghali, kwara arịrị na e nwere enweghị mmasị na-arị elu na ike ọgwụgwụ n’etiti Mba ndị nọ n’òtù ahụ mgbe a bịara n’ihe banyere ime udo. O kwubiri na nye ọtụtụ n’ime ndị òtù ya, “òtù Mba Ndị Dị n’Otu abụghị ihe a ga-ebute ụzọ.”
Mmetụta nke Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi
N’agbanyeghị otú òtù Mba Ndị Dị n’Otu yiruru ka nke dị ike, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-emebi mgbalị ya nile ọtụtụ mgbe. Òtù Mba Ndị Dị n’Otu adịghị ike ma ọ bụrụ na ndị òtù ya akwadoghị ya. Ma ọ bụrụ na ọha na eze akwadoghị ya, ọtụtụ ndị òtù UN agaghị akwado òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Dị ka ihe atụ, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal si kwuo, “oké ọdịda ndị ọ dara na Somalia na Bosnia arụgidewo ọtụtụ ndị America ikweta na òtù ahụ abụghị nanị na ọ na-emefusị ihe, kama na ọ dị ize ndụ n’ezie.” N’aka nke ya, àgwà a nke ọha na eze arụgidewo ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke America ịtụ aro ka e belata nkwado ego mba United States na-enye òtù Mba Ndị Dị n’Otu.
Ụlọ ọrụ mgbasa akụkọ adịghị egbu oge mgbe a bịara n’ịkatọ òtù Mba Ndị Dị n’Otu n’ụzọ siri ike. E jiriwo okwu ndị dị ka “erughị eru ma ọlị,” “ibu,” “amaghị ọrụ,” na “adịghị ike” mee ihe n’ezoghị ọnụ mgbe a na-akọwa akụkụ dịgasị iche iche nke ọrụ òtù UN. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Washington Post National Weekly Edition kwuru na nso nso a na “òtù Mba Ndị Dị n’Otu ka bụ òtù na-akpụ akpụ nke na-agbalị ịgbanwe gaa n’ụwa dị adị n’ezie.”
Akwụkwọ akụkọ ọzọ hotara Odeakwụkwọ Ukwu bụ́ Boutros Boutros-Ghali dị ka onye gosipụtara nkụda mmụọ ya banyere oké ogbugbu ahụ e nwere na Rwanda. O kwuru, sị: “Ọ bụ ọdịda nye ọ bụghị nanị òtù Mba Ndị Dị n’Otu; ọ bụ ọdịda nye mba ụwa nile. Ọ bụkwa anyị nile ka ụta dịịrị maka ọdịda nke a.” Otu ihe ngosi pụrụ iche a ma ama nke e mere na telivishọn na 1993 kwuru na òtù Mba Ndị Dị n’Otu “enwebeghị ike ịkwụsị ihe ize ndụ kasị ukwuu nye udo—mgbasa nke ngwá agha nuklia.” Usoro ihe omume TV ahụ kwuru banyere òtù Mba Ndị Ndị n’Otu nke “bụworo n’ụzọ ka ukwuu n’okwu ọnụ ruo ọtụtụ iri afọ.”
Mmetụta nke a zuru ebe nile nke ihe agaghị dị ka e chere na-enye ndị ọrụ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu nsogbu n’uche nke ukwuu ma na-atụkwasị ihe ná nkụda mmụọ ha. Ma n’agbanyeghị nkụda mmụọ ndị ahụ, n’ememe ịgba 50 afọ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu, ọtụtụ yiri ka ha nwere olileanya e mere ka ọ dịghachi ọhụrụ ma na-atụ anya mmalite ọhụrụ. Ọ bụ ezie na ọ na-ekweta erughị eru nile nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu, Ambassador Albright kwupụtara echiche nke ọtụtụ ndị mgbe ọ sịrị: “Anyị aghaghị ịkwụsị ikwu okwu banyere ebe anyị nọbu, ọ dịkwa anyị mkpa ikwu okwu banyere ebe anyị na-aga.”
Ee, olee ebe ụwa na-aga? Ọ dị mgbe a ga-enwe ụwa nke agha na-adịghị na ya? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị bụ òkè òtù Mba Ndị Dị n’Otu ga-ekere n’ime ya? Ọzọkwa, ọ bụrụ na ị na-atụ egwu Chineke, i kwesịrị ịjụ, sị, ‘Gịnị bụ òkè Chineke ga-ekere n’ime ya?’
[Igbe dị na peeji nke 4]
MGBALỊ NDỊ DARA ADA
Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi apụghị ịdị ma agha, ịda ogbenye, mpụ, na ịrụ arụ dịrịhaala. Na nso nso a, òtù Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara ihe ndekọ ndị na-esonụ.
Agha: “N’ime 82 agha a lụrụ n’agbata 1989 na 1992, 79 n’ime ha bụ agha ime obodo, ọtụtụ n’ime ha bụ n’etiti agbụrụ dị iche iche; 90 pasent nke ndị e gburu bụ ndị nkịtị.”—Ngalaba Mgbasa Ozi Ọha na Eze nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu (UNDPI)
Ngwá Agha: “ICRC [Kọmitii Mba Nile nke Òtù Red Cross] na-eme atụmatụ na ihe karịrị 95 ndị na-emepụta ngwá agha n’ime 48 mba na-emepụta ogbunigwe nọ n’agbata nde 5 na 10 kwa afọ.”—Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ (UNHCR)
“N’Africa, e nwere ihe dị ka 30 nde ogbunigwe n’ime 18 mba.”—UNHCR
Ịda Ogbenye: “N’ụwa nile, otu n’ime mmadụ ise ọ bụla—ihe karịrị otu ijeri ná ngụkọta—na-ebi ndụ n’ọnọdụ ogbenye, a na-emekwa atụmatụ na ihe nọ n’agbata 13 ruo 18 nde mmadụ na-anwụ kwa afọ n’ihi ihe ndị e jikọtara ha na ịda ogbenye.”—UNDPI
Mpụ: “Mpụ a kọrọ akụkọ ya arịwo elu n’ụwa nile n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke pasent 5 kwa afọ kemgbe afọ ndị 1980; na USA nanị, e nwere 35 nde mpụ a na-eme kwa afọ.”—UNDPI
Omume Rụrụ Arụ: “Omume rụrụ arụ nke ọha na eze na-aghọ ihe a na-ahụ ebe nile. Ná mba ụfọdụ a na-eme atụmatụ na iri ego na-efu ihe ruru 10 pasent nke ihe nile mba ahụ na-emepụta n’otu afọ.”—UNDPI