Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp25 nke 1 p. 9
  • Ihe Mere A Ka Ji Na-alụ Agha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere A Ka Ji Na-alụ Agha
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MMEHIE
  • ỌCHỊCHỊ ỤMỤ MMADỤ
  • SETAN NA NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ YA
  • Otú Agha Ga-esi Akwụsị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2025
  • Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụmụ Mmadụ?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị Bụ Mmehie Ahụ Adam na Iv Mere?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Otú Agha Si Akpa Anyị Niile Aka Ọjọọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2025
wp25 nke 1 p. 9

Ihe Mere A Ka Ji Na-alụ Agha

Baịbụl kwuru isi ihe ndị na-akpata agha nakwa ihe mere ndị mmadụ ka ji na-alụ ya.

MMEHIE

Chineke kere nne na nna anyị mbụ bụ́ Adam na Iv ka ha yie ya. (Jenesis 1:27) Ọ pụtara na ha kwesịrị ịna-akpa àgwà ndị e ji mara Chineke, dị ka ime udo na ịhụ ndị ọzọ n’anya. (1 Ndị Kọrịnt 14:33; 1 Jọn 4:8) Ma, Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, si otú ahụ mee mmehie. Anyị niile ketaziri mmehie na ọnwụ n’aka Adam na Iv. (Ndị Rom 5:12) Mmehie a anyị ketara na-eme ka anyị na-eche echiche ọjọọ, nke nwere ike ime ka anyị na-eme ihe ọjọọ.​—Jenesis 6:5; Mak 7:21, 22.

ỌCHỊCHỊ ỤMỤ MMADỤ

Chineke ekeghị anyị ka anyị na-achị onwe anyị. Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ enweghịkwa ikike iduzi nzọụkwụ ya mgbe ọ na-eje ije.” (Jeremaya 10:23) N’ihi ya, ọchịchị ụmụ mmadụ enweghị ike ime ka agha kwụsị kpamkpam.

SETAN NA NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ YA

Baịbụl mere ka anyị mata na “ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu bụ “ajọ onye ahụ,” ọ bụkwa ogbu mmadụ. (Jọn 8:44) Ọ bụ ya na ndị mmụọ ọjọọ ya anyị na-anaghị ahụ anya na-eme ka ịlụ agha gụwa ndị mmadụ agụụ.​—Mkpughe 12:9, 12.

Anyị agaghị akwụsịli isi ihe ndị na-akpata agha, mana Chineke ga-akwụsịli ha.

Otú Ndị Okpukpe Si Etinye Aka n’Agha

Ọtụtụ okpukpe na-akwado agha. Okpukpe ndị na-eme otú ahụ so n’okpukpe ụgha ndị Baịbụl kpọrọ “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 18:2) Chineke kwuru na Babịlọn Ukwu ahụ ga-aza ajụjụ maka ọnwụ “ndị niile e gburu n’ụwa.” (Mkpughe 18:24) Ị chọọ ịmatakwu banyere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu Ahụ?” Ọ dị na jw.org.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya