Ụmụ mmadụ agaghị emeli ka agha kwụsị
Otú Agha Ga-esi Akwụsị
Baịbụl kwuru na ọ bụ Chineke ga-eme “ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa,” ọ bụghị ụmụ mmadụ.—Abụ Ọma 46:9.
CHINEKE GA-EBIBI ỌCHỊCHỊ ỤMỤ MMADỤ
Chineke ga-eji agha Baịbụl kpọrọ Amagedọn bibie ọchịchị ụmụ mmadụ.a (Mkpughe 16:16) N’oge ahụ, a ga-akpọkọta “ndị eze niile nọ n’ụwa” maka “agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpughe 16:14) Amagedọn bụ agha Chineke ga-eji mee ka agha niile kwụsị.
Chineke ga-eji Alaeze ya, ma ọ bụ ọchịchị ya, dochie ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa, a gaghịkwa ebibi ya ebibi. (Daniel 2:44) Chineke ahọrọla Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ Eze Alaeze ahụ. (Aịzaya 9:6, 7; Matiu 28:18) Ọ bụ ọchịchị a bụ Alaeze ahụb Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka ọ bịa. (Matiu 6:9, 10) Ọ bụ ọchịchị a Jizọs bụ Eze ya bụ naanị ọchịchị ga-achịwazi mmadụ niile nọ n’ụwa.
Jizọs agaghị eji ikike o nwere na-eme ihe ga-abara naanị onwe ya uru otú ndị ọchịchị bụ́ mmadụ na-eme. Ebe ọ bụ na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, o nweghị onye ga-atụwa ụjọ na a ga-eleghara ya anya n’ihi agbụrụ ya ma ọ bụ mba o si. (Aịzaya 11:3, 4) Ndị mmadụ agaghịzi na-azọ ka ha nweta ihe ruuru ha. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jizọs ga-ahụ na e metere onye ọ bụla mma. “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka, napụtakwa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. . . . Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”—Abụ Ọma 72:12-14.
Alaeze Chineke ga-eme ka ngwá agha niile gharazie ịdị. (Maịka 4:3) Ọ ga-ebibikwa ndị ọjọọ niile na-achọghị ịkwụsị ịlụ agha ma ọ bụ ndị na-eme ka ndị ọzọ chịrị obi n’aka. (Abụ Ọma 37:9, 10) Ebe ọ bụla nwoke, nwaanyị, ma ọ bụ nwatakịrị nọ n’ụwa, obi ga-eru ya ala.—Ezikiel 34:28.
Alaeze Chineke chịwa ụwa, ndụ ga na-atọ ndị mmadụ ezigbo ụtọ. Ọ ga-ewepụ ihe ndị na-akpata agha, dị ka ịda ogbenye, agụụ, na enweghị ezigbo ebe obibi. Onye ọ bụla ga na-enweta ezigbo nri ga na-ezuru ya, nweekwa ebe dị mma ọ ga-ebi.—Abụ Ọma 72:16; Aịzaya 65:21-23.
Alaeze Chineke ga-ewepụ nsogbu niile agha na-akpatara ndị mmadụ. Ọ bụghị naanị na ọ ga-eme ka ahụ́ e merụrụ ndị mmadụ n’oge a na-alụ agha laa, kama ọ ga-emekwa ka obi mgbawa na mwute agha kpataara ha laa. A ga-akpọlitedị ndị nwụrụ anwụ, ha adịrị ndụ ọzọ n’ụwa a. (Aịzaya 25:8; 26:19; 35:5, 6) Ndị mmadụ ga-ahụ ndị ezinụlọ ha nwụrụ anwụ ọzọ. Ihe ọjọọ ndị mere ha n’oge ndị gara aga a na-alụ agha agaghịzi abata ha n’obi n’ihi na “ihe mbụ niile agafeela.”—Mkpughe 21:4.
CHINEKE GA-EME KA MMEHIE GHARAZIE ỊDỊ
Alaeze Chineke ga-eme ka mmadụ niile na-efe naanị otu ezi Chineke bụ́ Jehova,c onye Baịbụl kpọrọ “Chineke nke udo, onye hụrụ anyị n’anya.” (2 Ndị Kọrịnt 13:11) A ga-akụziri ndị mmadụ otú ha na ibe ha ga-esi na-ebi n’udo. (Aịzaya 2:3, 4; 11:9) Ndị niile mụtara ihe a kụziiri ha agaghịzi na-eme mmehie, kama ha ga-ezu okè.—Ndị Rom 8:20, 21.
CHINEKE GA-EBIBI SETAN NA NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ YA
Chineke ga-eji Alaeze ya bibie Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ́ ndị na-eme ka ndị mmadụ na-alụ agha. (Mkpughe 20:1-3, 10) E bibichaa ha, ‘udo ga-adị ebe niile.’—Abụ Ọma 72:7.
Ka obi sie gị ike na Chineke ga-emezu nkwa o kwere ịkwụsị agha. Ọ ga-emeli ya, ọ chọkwara ime ya.
Chineke nwere amamihe na ike ọ ga-eji akwụsị agha. (Job 9:4) O nweghị ihe nyịrị ya.—Job 42:2.
Ọ na-ewute Chineke ma ọ hụ ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. (Aịzaya 63:9) ‘Ọ kpọkwara onye ọ bụla tigbuo zọgbuo na-amasị asị.’—Abụ Ọma 11:5.
Chineke na-emezu okwu ya mgbe niile. O nweghị ike ịgha ụgha.—Aịzaya 55:10, 11; Taịtọs 1:2.
N’ọdịnihu, Chineke ga-eme ka ezigbo udo dịrị ruo mgbe ebighị ebi.
Chineke ga-eme ka agha kwụsị
a Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Agha Amagedọn?” Ọ dị na jw.org.
b Lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? Ọ dị na jw.org.
c Jehova bụ ezigbo aha Chineke.—Abụ Ọma 83:18.