Otú Obi Ga-esi Na-eru Mmadụ Ala n’Agbanyeghị Agha
Otu nwoke bụ́bu onye agha aha ya bụ Gary kwuru, sị: “Tupu mụ ebido ịmụ Baịbụl, amaghị m ihe mere ahụhụ, mmegbu, na nsogbu ji ju ebe niile n’ụwa. Ma ugbu a, obi eruola m ala. Ama m na Jehova Chineke ga-ewepụ ihe niile na-eme ka obi koro ndị mmadụ n’elu n’ụwa a.”
Ọ bụghị naanị Gary ka obi dị otú a. Ka anyị hụ otú Baịbụl sirila nyere ndị ọzọ aka.
BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Gịnwa bụ́ Jehova dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.”—Abụ Ọma 86:5.
OTÚ O SI ENYERE NDỊ MMADỤ AKA: “Amaokwu a na-eme ka obi sie m ike na Jehova na-eme ebere. Ama m na ọ dị njikere ịgbaghara m ihe niile m mere n’oge m gara agha.”—Wilmar, Kolombia.
BAỊBỤL KWURU, SỊ: “M na-eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. A gaghịzi echeta ihe niile mere na mbụ. Ha agaghị abatakwa n’obi.”—Aịzaya 65:17.
OTÚ O SI ENYERE NDỊ MMADỤ AKA: “Ihe ndị m hụrụ n’agha mgbe m bụ onye agha ka na-akpaghasị m uche ma na-eme ka obi daa m mbà. Ma, amaokwu a na-echetara m na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka echiche ọjọọ na-abata m n’isi kwụsị. Ha agaghịzi abata m n’obi. Ihe a Jehova ga-emere m atọgbuola m.”—Zafirah, Amerịka.
BAỊBỤL KWURU, SỊ: “N’oge ọchịchị ya, ihe ga na-agaziri onye ezi omume, udo ga-adịkwa ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agaghịzi adị.”—Abụ Ọma 72:7.
OTÚ O SI ENYERE NDỊ MMADỤ AKA: “M na-echetakarị ihe e kwuru n’amaokwu a. N’oge na-adịghị anya, agha na nsogbu niile ọ na-akpata ga-abụzi ihe akụkọ. Ụjọ agaghịzi na-atụ anyị ma è nwere ihe ga-eme ndị ikwu na ibe anyị.”—Oleksandra, Yukren.
BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ. . . . Unu ndị bi n’ájá, tetanụ tie mkpu ọṅụ.”—Aịzaya 26:19.
OTÚ O SI ENYERE NDỊ MMADỤ AKA: “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e gburu ndị ezinụlọ anyị niile n’oge a na-egbukpọ ndị Tutsi. Ma, amaokwu a na-eme ka obi sie m ike na m ga-ahụ ha ọzọ. M na-atụsi anya ike ịnụ olu ha na-atọ m ụtọ ọzọ mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.”—Marie, Rụwanda.
BAỊBỤL KWURU, SỊ: “N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ. . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.”—Abụ Ọma 37:10, 11.
OTÚ O SI ENYERE NDỊ MMADỤ AKA: “Ọ bụ eziokwu na agha a na-alụ n’obodo anyị ebiela, ma mmegbu na ndị ọjọọ ka juru ebe niile. Amaokwu ndị a na-agba m ezigbo ume. Jehova na-ahụ ihe niile, ọ makwa otú ihe si dịrị m. O kwere nkwa na nsogbu niile ga-ebi n’oge na-adịghị anya, e chefuokwa ha.”—Daler, Tajikistan.
Ndị e dere ihe ha kwuru n’akwụkwọ a so n’ọtụtụ nde mmadụ bụ́ Ndịàmà Jehova ndị Baịbụl nyeere aka, obi eruo ha ala. Ha amụtala ịhụ ndị kpọrọ ha asị n’anya, ma ndị agbụrụ ọzọ, ndị mba ọzọ, na ebo ọzọ. (Ndị Efesọs 4:31, 32) Ndịàmà Jehova anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha anaghịkwa etinye aka na tigbuo zọgbuo.—Jọn 18:36.
Ndịàmà Jehova hụrụ ibe ha n’anya ma na-enyere ibe ha aka ka ezinụlọ. (Jọn 13:35) Dị ka ihe atụ, Oleksandra, bụ́ onye anyị kwuburu okwu ya, na nwanne ya nwaanyị gbagara mba ọzọ n’ihi agha. O kwuru, sị: “Ozugbo anyị banyere mba ọzọ, anyị hụrụ Ndịàmà Jehova ndị nọ ebe ahụ na-eche ka ha nabata anyị. Aka ha nyeere anyị mere ka ọ dịrị anyị mfe ibi ná mba ahụ anyị gbagara ọsọ ndụ.”
Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, bụ́ ebe anyị na-amụ ihe Baịbụl kwuru nke na-eme ka obi ruo mmadụ ala, na-amụkwa otú anyị ga-esi eme ya eme. Gaa na jw.org ka ị hụ ebe dị gị nso anyị na-anọ amụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị ekwuo ka Onyeàmà Jehova na-abịa ka gị na ya jiri akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi na-amụ Baịbụl. Ị gaghị akwụ ụgwọ ọ bụla.