Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Mach p. 20-25
  • Na-eme Mkpebi Gosiri na I Nwere Okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-eme Mkpebi Gosiri na I Nwere Okwukwe
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MGBE Ị NA-AHỌRỌ ỌRỤ Ị GA-ARỤ
  • MGBE Ị NA-AHỌRỌ ONYE Ị GA-ALỤ
  • MGBE NZUKỌ JEHOVA NYERE ANYỊ NTỤZIAKA
  • Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Otú Ị Ga-esi Kwụsị Inwe Obi Abụọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Na-eme Mkpebi Ga-eme Jehova Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Mach p. 20-25

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 12

ABỤ NKE 119 Ka Anyị Nwee Okwukwe

Na-eme Mkpebi Gosiri na I Nwere Okwukwe

“Anyị nwere okwukwe, ọ bụghị n’ihi ihe anya anyị hụrụ.”​—2 KỌR. 5:7.

IHE A GA-AMỤ

Otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere okwukwe mgbe anyị na-ekpebi ihe ndị dị mkpa.

1. Gịnị mere obi ji tọọ Pọl onyeozi ezigbo ụtọ mgbe o chetara otú o si bie ndụ ya?

E NWERE oge Pọl onyeozi ma na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya. Ma, mgbe o chebaara otú o si bie ndụ ya echiche, obi dị ya ezigbo ụtọ. Ọ sịrị: “Agbaala m ọsọ ndụ ruo n’isi. Akwụsikwara m ike n’okwukwe.” (2 Tim. 4:6-8) Pọl mere mkpebi ndị dị mma n’ozi o jere. Obi sikwara ya ike na obi dị Jehova mma maka ya. Anyịnwa chọkwara ịna-eme mkpebi ndị dị mma nakwa ka ihe anyị na-amasị Jehova. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

2. Gịnị ka ihe Pọl kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 5:7 pụtara?

2 Pọl kwuru gbasara onwe ya nakwa gbasara ezigbo Ndị Kraịst ndị ọzọ, sị: “Anyị nwere okwukwe, ọ bụghị n’ihi ihe anya anyị hụrụ.” (2 Kọr. 5:7) Gịnị ka ihe a Pọl kwuru pụtara? Ndị na-enweghị okwukwe na Jehova na-eme mkpebi naanị n’ihi ihe anya ha na-ahụ na ihe ntị ha na-anụ. Ma, onye nwere okwukwe na Jehova na-eche gbasara ihe Jehova chọrọ ka o mee mgbe ọ na-eme mkpebi. Ihe ndị ọ na-eme na-egosi na obi siri ya ike na Jehova ga-akwụ ya ụgwọ nakwa na ime ihe Jehova kwuru e dere na Baịbụl ga-abara ya uru.​—Ọma 119:66; Hib. 11:6.

3. Olee uru inwe okwukwe bara? (2 Ndị Kọrịnt 4:18)

3 Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ihe ụfọdụ anyị niile na-ekpebi n’ihi ihe anyị hụrụ ma ọ bụ ihe anyị nụrụ. Ma, anyị nwere ike inwe nsogbu ma ọ bụrụ na naanị ihe anyị na-echebara echiche ekpebi ihe ndị dị mkpa bụ ihe anyị hụrụ ma ọ bụ ihe anyị nụrụ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na anya anyị na ntị anyị nwere ike iduhie anyị. Ọ bụrụgodị na ha eduhieghị anyị, ime ihe naanị n’ihi ihe anya anyị na-ahụ na ihe ntị anyị na-anụ ga-eme ka anyị mechaa mee ihe Jehova na-achọghị. (Ekli. 11:9; Mat. 24:37-39) Ma, ọ bụrụ na anyị egosi na anyị nwere okwukwe, mkpebi anyị ga-eme ‘ga-adị Onyenwe anyị mma.’ (Efe. 5:10) Ime ihe Jehova gwara anyị ga-eme ka obi ruo anyị ala, meekwa ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ. (Ọma 16:8, 9; Aịza. 48:17, 18) Ọ bụrụ na anyị akwụsịghị inwe okwukwe, anyị ga-adị ndụ ebighị ebi.​—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:18.

4. Olee otú mmadụ ga-esi achọpụta ma ọ̀ na-eme mkpebi n’ihi na o nwere okwukwe ma ọ bụkwanụ n’ihi ihe anya ya na-ahụ?

4 Olee otú anyị ga-esi ama ma ànyị nwere okwukwe ma ọ bụkwanụ na anyị na-ekpebi ihe naanị n’ihi ihe anya anyị na-ahụ na ihe ntị anyị na-anụ? Ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya bụ: Olee ihe ndị m na-eji ekpebi ihe ndị m na-eme? Ọ̀ bụ naanị ihe ndị anya m na-ahụ, ka m̀ na-atụkwasị Jehova obi na ihe o kwuru ga-abara m uru? Ka anyị leba anya n’otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere okwukwe n’ụzọ ihe atọ dị mkpa: (1) mgbe anyị na-ahọrọ ụdị ọrụ anyị ga-arụ, (2) mgbe anyị na-ahọrọ onye anyị ga-alụ, nakwa (3) mgbe nzukọ Jehova nyere anyị ntụziaka. Na nke ọ bụla n’ime ha, anyị ga-ahụ ihe ndị anyị kwesịrị ichebara echiche ka anyị nwee ike ime ezigbo mkpebi.

MGBE Ị NA-AHỌRỌ ỌRỤ Ị GA-ARỤ

5. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-echebara echiche ma anyị kpebiwe ụdị ọrụ anyị ga-arụ?

5 Anyị niile chọrọ ịna-egboro onwe anyị mkpa anyị, na-egbokwara ndị ezinụlọ anyị mkpa ha. (Ekli. 7:12; 1 Tim. 5:8) E nwere ụfọdụ ọrụ na-akwụpụta ụgwọ. Ha nwere ike ime ka onye na-arụ ha nwee ike ịna-egbo mkpa dịịrị ya kwa ụbọchị ma wepụtakwa ego ọ ga-echekwa maka ọdịnihu. Ma e nwekwara ọrụ ndị na-anaghị akwụpụtacha ụgwọ. Ego a na-enweta na ha nwere ike izuru mmadụ imere ezinụlọ ya naanị ihe ndị dị mkpa. Ọ bụrụ na anyị ekpebiwe ụdị ọrụ anyị ga-anara, o doro anya na anyị ga-eche gbasara ego ole a ga-akwụ anyị. Ma, mmadụ ga-egosi na o nweghị okwukwe ma ọ bụrụ na naanị ihe ọ na-elekwasị anya ekpebi ma ọ̀ ga-anara ọrụ bụ ego ole a ga-akwụ ya.

6. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere okwukwe mgbe anyị na-ahọrọ ọrụ anyị ga-arụ? (Ndị Hibru 13:5)

6 Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe, anyị ga-echekwa otú ọrụ ahụ ga-esi agbasa adịm ná mma anyị na Jehova. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ọrụ a ọ̀ ga-eme ka m mee ihe Jehova kpọrọ asị?’ (Ilu 6:16-19) ‘Ọ̀ ga-eme ka m ghara ịna-enwe oge na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova, meekwa ka m hapụ ezinụlọ m gaa nọrọ ebe ọzọ ruo ogologo oge?’ (Fil. 1:10) Ọ bụrụ na azịza ajụjụ nke ọ bụla bụ ee, ọ kacha mma ịghara ịnara ọrụ ahụ ọ bụrụgodị na inweta ọrụ na-esi ike. Ebe ọ bụ na anyị nwere okwukwe, anyị na-eme mkpebi ndị gosiri na obi siri anyị ike na Jehova ma otú ọ ga-esi egboro anyị mkpa anyị.​—Mat. 6:33; gụọ Ndị Hibru 13:5.

7-8. Olee otú otu nwanna bi na Kọntinent Saụt Amerịka si gosi na o nwere okwukwe? (Kọwaakwa foto.)

7 Lee otú Javier,a bụ́ nwanna bi na Kọntinent Saụt Amerịka, si gosi na ọ ma na o kwesịrị inwe okwukwe. Ọ sịrị: “M tinyere akwụkwọ maka ọrụ ego a ga-akwụ m na ya bụ okpukpu abụọ ego ole a na-akwụbu m. Ọrụ ahụ bụkwa ọrụ ga-atọ m ezigbo ụtọ.” Ma, Nwanna Javier chọsiri ike ịsụ ụzọ. Ọ sịrị: “A gwara m ka m bịa ka onyeisi ụlọ ọrụ ahụ gbaa m ajụjụ ọnụ. Tupu mụ agawa, m kpere ekpere. Obi sikwara m ike na Jehova ma ihe ga-akachara m mma. M chọrọ ọrụ ga-enyere m aka ịna-emekwu nke ọma nakwa ọrụ ga-akwụpụta m ụgwọ. Mana, agaghị m anabata ọrụ a ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka m ghara ime ihe m chọrọ ime n’ofufe Jehova.”

8 Nwanna Javier sịrị: “N’oge onyeisi ụlọ ọrụ ahụ na-agba m ajụjụ ọnụ, ọ gwara m na m ga na-arụ ọrụ ọtụtụ ugboro ma a gbasaa ọrụ. M medara obi gwa ya na agaghị m emeli ya n’ihi na ọ ga-eme ka m ghara ịna-enwe oge eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova.” Nwanna Javier jụrụ ọrụ ahụ. Mgbe izu abụọ gachara, ọ malitere ịsụ ụzọ. Ka oge na-agakwa n’afọ ahụ, ọ hụrụ ọrụ ọ ga na-arụ ụbọchị ụfọdụ n’izu. Ọ sịrị: “Jehova nụrụ ekpere m ma nye m ọrụ ga-enye m ohere ịna-asụ ụzọ. Obi dị m ezigbo ụtọ na m na-arụ ọrụ nyere m ohere ịna-ejekwuru Jehova na ụmụnna m ozi.”

Ebe otu nwanna ji okpu ndị ọrụ, yiri uwe e ji arụ ọrụ, onyeisi ya eduru ya bata n’otu ọfis mmadụ na-anọghị na-agwa ya na a chọrọ ibuli ya n’ọkwá.

A chọọ ibuli gị n’ọkwá n’ebe ị na-arụ ọrụ, ihe ị ga-ekpebi ime ọ̀ ga-egosi na obi siri gị ike na Jehova ma ihe ga-akachara gị mma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8)


9. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Trésor?

9 Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ọrụ anyị na-arụ ugbu a na-eme ka o siere anyị ike ime ihe anyị kwesịrị ime n’ofufe Jehova? Ka anyị kwuo banyere Nwanna Trésor si Kongo. Ọ sịrị: “E nwere mgbe m nwetara ọrụ ọhụrụ m chọrọ inweta kemgbe. Ihe a na-akwụ m na ya bụ okpukpu atọ ihe a na-akwụ m n’ọrụ mbụ m. Ndị mmadụ na-akwanyekwara m ùgwù.” Mana, Nwanna Trésor hapụrụ ịga ọmụmụ ihe ọtụtụ ugboro n’ihi na ọ na-arụ ọrụ ma a gbasaa ọrụ. Mgbe ụfọdụkwa, ndị ọrụ ibe ya na-enye ya nsogbu ka ọ ghaa ụgha iji kpuchie ihe na-adịghị mma ha na-eme. Nwanna Trésor chọsiri ike ịkwụsị ọrụ ahụ. Mana, ihe na-echegbu ya bụ na ọ gaghịzi enwe ọrụ ọ ga-arụ. Gịnị nyeere ya aka? Ọ sịrị: “Ihe e kwuru na Habakọk 3:17-19 nyeere m aka ịghọta na m kwụsịgodị ọrụ ahụ, Jehova ma otú ọ ga-esi na-egboro m mkpa m. N’ihi ya, m gbara arụkwaghịm.” Ọ sịkwara: “Ọtụtụ ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-eche na mmadụ ga-eme ihe ọ bụla ọ ga-emeli, ọ bụrụgodị ịhapụ ndị ezinụlọ ya na ihe ndị gbasara ofufe Chineke, ka a ghara ịchụ ya n’ọrụ a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ. Obi dị m ụtọ na mụ na Jehova na ndị ezinụlọ m dị n’ezigbo mma. Mgbe otu afọ gachara, Jehova nyeere m aka ịchọta ọrụ m na-eji elekọta onwe m ma na-eme ihe ndị gbasara ofufe ya. Ọ bụrụ na anyị ewere ihe ndị gbasara ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, ihe nwere ike isitụrụ anyị ike mgbe ụfọdụ. Mana, Jehova ga-egboro anyị mkpa anyị.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị atụkwasị ndụmọdụ Jehova na nkwa ya obi, anyị ga na-eme mkpebi ndị gosiri na anyị nwere okwukwe, ya agọziekwa anyị.

MGBE Ị NA-AHỌRỌ ONYE Ị GA-ALỤ

10. Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara igosi na anyị nwere okwukwe ma anyị chọwa onye anyị ga-alụ?

10 Alụmdi na nwunye bụ onyinye si n’aka Jehova. Ọ bụghịkwa ihe ọjọọ ma mmadụ chọọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Nwanna nwaanyị chewe echiche ma ọ̀ ga-alụ otu nwanna nwoke, o nwere ike ịchọpụta ụdị onye ọ bụ, otú ọ dị n’anya, ihe e ji mara ya, otú o nweruru n’ego, ibu ndị o bu n’ezinụlọ ha, nakwa otú ọ na-eme ka obi dịrị yanwa.b Ihe ndị a dị mkpa. Mana, o nwere ike igosi na o nweghị okwukwe ma ọ bụrụ naanị ihe ndị a ka ọ na-elekwasị anya.

11. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere okwukwe mgbe anyị na-achọ onye anyị ga-alụ? (1 Ndị Kọrịnt 7:39)

11 Obi na-atọgbu Jehova atọgbu ma ụmụnna nwaanyị na ụmụnna nwoke soro ndụmọdụ ya gbasara ịchọta onye ha ga-alụ. Dị ka ihe atụ, ha na-erube isi na ndụmọdụ Baịbụl nyere ka ha chere ruo mgbe ha ‘na-abụghịzi nwata’ tupu ha na mmadụ akpawa maka ọlụlụ. (1 Kọr. 7:36) Ha na-ejide n’aka na onye ha na-elewe anya ịbụ di ha ma ọ bụ nwunye ha nwere àgwà ndị Jehova kwuru na ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwunye kwesịrị inwe. (Ilu 31:10-13, 26-28; Efe. 5:33; 1 Tim. 5:8) Ọ bụrụ na onye na-abụghị Onyeàmà Jehova egosiwe ha mmasị, ha na-erube isi n’ihe Baịbụl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 7:39, nke bụ́ ka anyị lụọ “naanị onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị.” (Gụọ ya.) Ha na-eme ihe ndị gosiri na ha nwere okwukwe, obi esie ha ike na Jehova ga-elekọtali ha karịa otú onye ọ bụla ọzọ ga-emeli.​—Ọma 55:22.

12. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Rosa?

12 Ka anyị kwuo gbasara Nwanna Nwaanyị Rosa. Ọ bụ ọsụ ụzọ bi na Kolombia. Ọrụ ya mere ka ya na otu nwoke na-abụghị Onyeàmà Jehova na-ahụ, nwoke ahụ amalitekwa igosi ya na o nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ihe ya masịkwara Rosa. Ọ sịrị: “O yiri nnọọ ezigbo mmadụ. Ọ na-enyere ndị obodo ha aka, yiekwa onye na-akpa àgwà ọma. Otú o si emeso m na-atọ m ụtọ. O nwere àgwà ndị m chọrọ ka onye ga-abụ di m nwee, naanị na ọ bụghị Onyeàmà Jehova.” Ọ sịkwara: “O siiri m ike ịsị ya na mụ achọghị n’ihi na ọ bụ ụdị mmadụ ya ka m chọrọ. N’oge ahụ, owu na-ama m. N’ihi ya, m chọrọ ịlụ di. Mana, ahụbeghị m onye nọ n’ọgbakọ m ga-alụ.” N’agbanyeghị ya, Nwanna Nwaanyị Rosa elekwasịghị anya naanị n’ihe anya ya na-ahụ. O chekwara otú ihe o kpebiri ga-esi akpa adịm ná mma ya na Jehova aka. Ihe a meziri ka ya na nwoke ahụ kwụsị ikwu, ya ejirikwa ozi Jehova kpọrọkwuo ihe. Mgbe obere oge gachara, a kpọrọ ya ka ọ bịa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ugbu a, ọ bụzi ọsụ ụzọ pụrụ iche. Nwanna Nwaanyị Rosa sịrị: “Jehova esila n’ọtụtụ ụzọ gọzie m, nke mere ka obi na-atọ m ụtọ.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị adịcha mfe ime ihe Jehova chọrọ, karịchaa, ma ọ bụrụ na ihe ọ sị anyị emela bụ ihe na-agụ anyị agụụ ime. Ma, ọ bụrụ na anyị ekwe ka Jehova na-eduzi anyị, ọ ga-abara anyị uru mgbe niile.

MGBE NZUKỌ JEHOVA NYERE ANYỊ NTỤZIAKA

13. Gịnị nwere ike ime ka o siere anyị ike inwe okwukwe ma nzukọ Jehova nye anyị ntụziaka?

13 Ọtụtụ mgbe, nzukọ Jehova na-enye anyị ntụziaka ga-enyere anyị aka ife Jehova. Ntụziaka ahụ nwere ike isi n’aka ndị okenye ọgbakọ, ndị nlekọta sekit, alaka ụlọ ọrụ, ma ọ bụ Òtù Na-achị Isi. Ma, gịnị ka anyị ga-eme mgbe anyị na-aghọtaghị ihe mere e ji nye anyị ntụziaka? O nwere ike ihe anyị ga na-ahụ bụ naanị nsogbu ntụziaka ahụ nwere ike ịkpata. O nwedịrị ike ime ka anyị na-eche gbasara ezughị okè ụmụnna nyere anyị ntụziaka ahụ.

14. Gịnị ga-enyere anyị aka igosi na anyị nwere okwukwe mgbe nzukọ Jehova nyere anyị ntụziaka? (Ndị Hibru 13:17)

14 Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe, anyị ga-atụkwasị Jehova obi na ọ bụ ya na-eduzi ọgbakọ ya nakwa na ọ ma otú ihe si dịrị anyị. Ihe a ga-eme ka anyị rube isi ozugbo, jirikwa obi ụtọ na-eme ya. (Gụọ Ndị Hibru 13:17.) Anyị ghọtara na ọ bụrụ na anyị erube isi, ọ na-eso eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. (Efe. 4:2, 3) Obi siri anyị ike na n’agbanyeghị na ụmụnna ndị na-eduzi anyị ezughị okè, Jehova ga-agọzi anyị ma anyị rube isi. (1 Sam. 15:22) Obi sikwara anyị ike na ọ bụrụ na e kwesịrị ịgbanwe ntụziaka e nyere anyị, Jehova ga-emecha mee ka a gbanwee ya.​—Maị. 7:7.

15-16. Gịnị nyeere otu nwanna aka irube isi ọ bụ eziokwu na ntụziaka nzukọ Jehova nyere mere ya obi abụọ? (Kọwaakwa foto.)

15 Ka anyị kọọ akụkọ gosiri uru ọ na-aba ma anyị nwee okwukwe, rubere ntụziaka nzukọ Jehova nyere isi. Na Peruu, ọ bụ eziokwu na asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ bụ Spanish, ma ọtụtụ n’ime ha na-asụkwa asụsụ ndị obodo ahụ. Otu n’ime asụsụ ndị ahụ bụ Kechua. Ruo ọtụtụ afọ, ụmụnna ndị na-asụ Kechua na-aga achọgharị ndị na-asụ Kechua n’ebe ha na-ekwusa ozi ọma. Ma, n’ihi iwu ndị ọchịchị tiri, a gbanwere otú a ga-esi na-achọta ụdị ndị a. (Rom 13:1) N’ihi ya, ụfọdụ ndị chere na ọ ga-eme ka o sie ike ịchọta ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ ahụ. Ebe ọ bụ na ụmụnna rubere isi ná ntụziaka nzukọ Jehova nyere, Jehova gọziri mgbalị ha, ha achọta ọtụtụ ndị na-asụ Kechua.

16 Otu okenye nọ n’ọgbakọ na-asụ Kechua aha ya bụ Kevin so ná ndị ihe a nọ na-echu ụra. Ọ sịrị: “M nọ na-eche, sị: ‘Olee otú anyị ga-esi achọta ndị na-asụ Kechua?’” Gịnị ka Nwanna Kevin mere? Ọ sịrị: “M chetara ihe e kwuru n’Ilu 3:5. M cheziri banyere Mosis. Ntụziaka Jehova nyere ya yichara ihe na-agaghị aba uru. Ọ gwara Mosis ka o duru ndị Izrel pụta n’Ijipt, gawa n’Oké Osimiri Uhie. N’ebe ahụ, o yiri ka o nweghị otú ha ga-esi gbapụ n’aka ndị Ijipt na-achụ ha. N’agbanyeghị ya, o rubeere Jehova isi, Jehova agọziekwa ya n’ụzọ dị ịtụnanya.” (Ọpụ. 14:1, 2, 9-11, 21, 22) Nwanna Kevin kwetara ịgbanwe otú o si ekwusa ozi ọma. Olee uru ọ bara? Ọ sịrị: “O juru m anya ịhụ otú Jehova si gọzie anyị. Na mbụ, anyị na-eji ụkwụ aga ọtụtụ ebe ma anyị nọrọ n’ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, ihe anyị na-ahụ bụ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ na-asụ Kechua. Mana ugbu a, anyị na-aga n’ebe e nwere ọtụtụ ndị na-asụ Kechua. Ihe a mere ka anyị nwekwuo ndị anyị na ha na-akparịta ụka, ndị anyị na-agara nletaghachi, na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl. Ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị ebukwuola ibu.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị erube isi, Jehova ga-agọzi anyị mgbe niile.

Ebe otu nwoke na-asụ Kechua na-agwa di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova okwu mgbe ha nọ ozi ọma. Ọ na-egosi ha ebe mmadụ bi.

Ụmụnna chọpụtara na ọtụtụ ndị ha hụrụ n’ozi ọma gwara ha ebe dị ha nso ha ga-ahụ ndị na-asụ Kechua (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16)


17. Gịnị ka ị mụtara n’isiokwu a?

17 Anyị elebala anya n’ụzọ ebe atọ dị mkpa anyị kwesịrị ịna-egosi na anyị nwere okwukwe. Ma anyị kwesịrị ịna-egosi na anyị nwere okwukwe n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ, dị ka mgbe anyị na-ahọrọ ihe anyị ga-eji eme onwe anyị obi ụtọ ma ọ bụ ụdị egwuregwu anyị ga-egwu, nakwa mgbe anyị na-eme mkpebi gbasara ebe anyị ga-agụru akwụkwọ ma ọ bụ otú anyị ga-esi azụ ụmụ anyị. N’agbanyeghị mkpebi ọ bụla anyị chọrọ ime, ihe anyị kwesịrị iji ekpebi ihe anyị ga-eme ekwesịghị ịbụ naanị ihe anya anyị na-ahụ, kamakwa, o kwesịrị ịbụ adịm ná mma anyị na Jehova, ndụmọdụ o nyere anyị, nakwa nkwa o kwere ilekọta anyị. Anyị mee otú ahụ, anyị “ga na-aza aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.”​—Maị. 4:5.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI EGOSI NA I NWERE OKWUKWE . . .

  • mgbe ị na-ahọrọ ụdị ọrụ ị ga-arụ?

  • mgbe ị na-ahọrọ onye ị ga-alụ?

  • mgbe nzukọ Jehova nyere anyị ntụziaka?

ABỤ NKE 156 Nwee Okwukwe

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b Na paragraf a, e kwuru gbasara nwanna nwaanyị na-achọ ịlụ di. Mana, ihe e kwuru ebe a gbasakwara nwanna nwoke na-achọ nwaanyị ọ ga-alụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya