ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 13
ABỤ NKE 4 “Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”
E Nweghị Ihe Nyịrị Jehova
“Ihe a ọ̀ nyịrị Jehova?”—ỌNỤ ỌGỤ. 11:23.
IHE A GA-AMỤ
Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịtụkwasịkwu Jehova obi na ọ ga na-egboro anyị mkpa anyị mgbe niile.
1. Olee otú Mosis si gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi mgbe o du ndị Izrel si n’Ijipt pụta?
AKWỤKWỌ Ndị Hibru gwara anyị banyere ọtụtụ ndị nwere okwukwe na Jehova. Mosis bụ otu n’ime ha. O nwere okwukwe pụrụ iche. (Hib. 3:2-5; 11:23-25) O gosiri na o nwere okwukwe mgbe o du ndị Izrel si n’Ijipt pụta. Ọ tụghị Fero na ndị agha ya ụjọ. Ọ tụkwasịrị Jehova obi, duru ndị Izrel gafee Oké Osimiri Uhie, mechaakwa banye n’ala ịkpa. (Hib. 11:27-29) Ọtụtụ ndị Izrel kwụsịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-elekọta ha. Ma, Mosis ka tụkwasịrị Chineke ya obi. Jehova agharịpụghịkwa ya. Ọ rụrụ ọrụ ebube nye ndị Izrel nri na mmiri ka ha nwee ike ịfọ ndụ n’ala ịkpa kpọrọ nkụ.a—Ọpụ. 15:22-25; Ọma 78:23-25.
2. Gịnị mere Chineke ji jụọ Mosis, sị: “Ihe a ọ̀ nyịrị Jehova”? (Ọnụ Ọgụgụ 11:21-23)
2 N’agbanyeghị na Mosis nwere okwukwe siri ike, ihe dị ka otu afọ Jehova napụtachara ndị Izrel n’Ijipt, ọ malitere iche ma Jehova ọ̀ ga-enyeli ndị ya anụ. Mosis nọ na-eche otú Jehova ga-esi weta anụ ga-ezuru ihe dị ka nde mmadụ atọ n’ala ịkpa ahụ, bụ́ ebe nri dị ụkọ. N’ihi ya, Jehova jụrụ Mosis, sị: “Ihe a ọ̀ nyịrị Jehova?” (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 11:21-23.) Otú e si kwuo ihe a n’asụsụ Hibru bụ “Aka Jehova ọ̀ dị mkpụmkpụ?” Aka Jehova e kwuru ebe a pụtara mmụọ nsọ Jehova ma ọ bụ ike ya o ji arụ ọrụ. Ihe ọ pụtara bụ na Jehova na-ajụ Mosis, sị: ‘Ì chere n’eziokwu na agaghị m emeli ihe m kwuru na m ga-eme?’
3. Gịnị mere ihe Mosis na ndị Izrel mere ji kwesị ịgbasa anyị?
3 Ò nwetụla mgbe ị nọ na-eche ma Jehova ọ̀ ga-egboro gị na ndị ezinụlọ gị mkpa unu? Ma ò nwetụla ma ọ bụ na o nwetụbeghị, ka anyị kwuo banyere Mosis na ndị Izrel bụ́ ndị na-atụkwasịghị Chineke obi na ọ ga-egboro ha mkpa ha. Ihe ndị Baịbụl kwuru banyere ha ga-enyere anyị aka ịtụkwasị Jehova obi na o nweghị ihe nyịrị ya.
MỤTA IHE N’IHE MOSIS NA NDỊ IZREL MERE
4. Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere ọtụtụ ndị Izrel ji nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ ga-egboro ha mkpa ha?
4 Gịnị mere o ji mewe ndị Izrel obi abụọ ma Jehova ọ̀ ga-egboro ha mkpa ha? Mba Izrel na “ọtụtụ ndị dị iche iche” na-abụghị ndị Izrel nọ ná nnukwu ala ịkpa ruo oge ụfọdụ mgbe ha si n’Ijipt pụta na-aga Ala Nkwa. (Ọpụ. 12:38; Diut. 8:15) Ike iri mana gwụrụ ‘ndị ahụ dị iche iche.’ Otú ahụ ka ọ gwụkwara ọtụtụ ndị Izrel, bụ́ ndị so ha mewe mkpesa. (Ọnụ Ọgụ. 11:4-6) Ihe nọzi na-agụ ha bụ ihe ha na-eri mgbe ha nọ n’Ijipt. N’ihi otú ha si na-ekpesara Mosis, Mosis chere na ọ bụ ya ga-achọtara ha niile anụ ha ga-ata. Ma, ọ maghị ebe ọ ga-esi enweta ya.—Ọnụ Ọgụ. 11:13, 14.
5-6. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú ọtụtụ ndị Izrel si mụta àgwà na-adịghị mma “ọtụtụ ndị dị iche iche” nọ n’etiti ha na-akpa?
5 Obi adịghị ndị ahụ na-abụghị ndị Izrel ụtọ maka ihe niile Jehova na-emere ha. Ndị Izrel malitekwara iche echiche ka ha. Ụdị ihe ahụ nwere ike ime anyị. Ọ bụrụ na ndị gbara anyị gburugburu bụ ndị na-anaghị enwe obi ụtọ maka ihe Jehova na-emere ha, anyịnwa nwekwara ike imewe ka ha, gharazie ịna-ekele Jehova maka ihe ọma ndị ọ na-emere anyị. Ụdị ihe ahụ nwere ike ime anyị ma anyị chewe banyere ihe ndị anyị nweburu ma ọ bụ nwewere ndị ọzọ anyaụfụ maka ihe ha nwere. Ma, anyị ga-aka enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ihe anyị nwere ana-eju anyị afọ n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị.
6 Ndị Izrel kwesịrị icheta na Chineke mesiri ha obi ike na ha ruo Ala Nkwa ha na-aga, ihe ọma ha ga-enweta ga-eju eju bara abara. Mgbe Jehova ga-emezu nkwa ahụ bụ ma ha banye n’Ala Nkwa, ọ bụghị mgbe ha na-agagharị n’ala ịkpa. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Kama ịnọ na-eche banyere ihe ndị anyị na-enweghị n’ụwa ochie a, anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe Jehova kwere nkwa imere anyị n’ụwa ọhụrụ. Anyị kwesịkwara ịna-atụgharị uche n’amaokwu Baịbụl ndị nwere ike inyere anyị aka ịtụkwasịkwu Jehova obi.
7. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na e nweghị ihe nyịrị Jehova?
7 Mgbe Jehova jụrụ Mosis, sị: “Ihe a ọ̀ nyịrị Jehova?” o nwere ike ịbụ na ọ chọrọ iji ya mee ka Mosis chee banyere ụzọ ihe abụọ: (1) Ike ya adịghị ntakịrị. (2) Ọ ga-ejili ike ya nyere ha aka n’ebe ọ bụla ha nọ. N’ihi ya, n’agbanyeghị na ndị Izrel nọ n’etiti ala ịkpa, Jehova ga-enyeli ha anụ buru ezigbo ibu. Chineke ji “aka ya siri ike na ike ya” gosi na ọ ga-enyeliri ndị ya aka n’ebe ọ bụla ha nọ. (Ọma 136:11, 12) N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ gbajuo dọọrọ anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka n’agbanyeghị ebe anyị nọ.—Ọma 138:6, 7.
8. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ime ihe na-adịghị mma ọtụtụ ndị Izrel mere n’ala ịkpa? (Kọwaakwa foto.)
8 Jehova mezuru nkwa ahụ o kwere ma zitere ndị ya nnụnụ kwel hiri ezigbo nne. Ma, ndị Izrel ekeleghị Chineke maka ọrụ ebube ahụ ọ rụrụ. Kama, ọtụtụ n’ime ha nwere anyaukwu. Si n’ụtụtụ ruo n’abalị, ha nọ na-agba kpurukpuru na-ekpokọta nnụnụ kwel karịrị akarị. Jehova wesara “ndị ahụ nwere akpịrị ogologo” iwe, taakwa ha ahụhụ. (Ọnụ Ọgụ. 11:31-34) Ihe a ha mere na-akụziri anyị ezigbo ihe. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịdị anyaukwu. Ma ànyị bara ọgaranya ma ànyị dara ogbenye, anyị kwesịrị ikpebisi ike na ihe ga-akacha anyị mkpa bụ ‘ịkpakọtara onwe anyị akụ̀ n’eluigwe.’ Otú anyị ga-esikwanụ eme ya bụ anyị na Jehova na Jizọs ịdị n’ezigbo mma. (Mat. 6:19, 20; Luk 16:9) Anyị mee otú ahụ, ka obi sie anyị ike na Jehova ga na-egboro anyị mkpa anyị.
Gịnị ka ọtụtụ ndị mere mgbe Jehova nyere ha nnụnụ kwel n’ala ịkpa, gịnịkwa ka ihe a na-akụziri anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)
9. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya banyere enyemaka Chineke?
9 Jehova na-enyekwara ndị ya aka taa. Mana, ọ pụtaghị na e nweghị mgbe ihe ọ bụla ga-akọ anyị ma ọ bụ mgbe agụụ ga-agụ anyị.b Ma, Jehova emekataghị gbakụta anyị azụ. Ọ ga na-enyere anyị aka ma ọnwụnwa bịara anyị. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị? Ka anyị lee ụzọ ebe abụọ anyị ga-eme ya: (1) mgbe ego kọrọ anyị na (2) mgbe anyị na-eche otú anyị ga-esi enweta ego anyị ga-eji na-elekọta onwe anyị ma anyị kawa nká.
MGBE EGO KỌRỌ GỊ
10. Olee nsogbu ndị gbasara ego nwere ike ịbịara anyị?
10 Ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-erukwu nso, anyị kwesịrị ịtụ anya na ihe ga-esikwu ike. Ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agha, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ma ọ bụ ọrịa ọhụrụ zuru ebe niile nwere ike ime ka anyị mefuo ego anyị na-atụghị anya imefu ma ọ bụ gharazie inwe ọrụ, ma ọ bụkwanụ gbara aka ngwongwo anyị ma ọ bụ ụlọ anyị. O nwere ike ịdị mkpa ka anyị chọta ọrụ n’ebe anyị bi ugbu a ma ọ bụkwanụ anyị echewe ma ànyị ga-akpọrọ ndị ezinụlọ anyị kwaga ebe ọzọ ka anyị nwee ike ịna-egboro ha mkpa ha. Olee ihe ga-enyere anyị aka ime mkpebi ga-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi?
11. Gịnị nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ego? (Luk 12:29-31)
11 Ihe mbụ dị ezigbo mkpa i kwesịrị ime bụ ịkọrọ Jehova ihe niile na-echegbu gị. (Ilu 16:3) Rịọ ya ka o nye gị amamihe ị ga-eji mee ezigbo mkpebi nakwa ka obi ruo gị ala ka ị ghara “iche oké echiche” banyere nsogbu gị. (Gụọ Luk 12:29-31.) Rịọsie ya ike ka o nyere gị aka ka ihe ndị dị mkpa i nwere ju gị afọ. (1 Tim. 6:7, 8) Mee nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka ị mata ihe ị ga-eme ma ego kọọ gị. Ihe ndị a na-ewepụta na jw.org enyerela ọtụtụ ndị aka imeri nsogbu ndị gbasara ego.
12. Olee ajụjụ ndị nwere ike inyere Onye Kraịst aka ime mkpebi ga-akacha baara ezinụlọ ya uru?
12 Ụfọdụ ndị anarala ọrụ mere ka ha hapụ ezinụlọ ha gaa biri ebe ọzọ. Ma, ọtụtụ mgbe, ha na-emecha chọpụta na mkpebi ahụ adịghị mma. Tupu gị ekweta ịrụ ọrụ ọhụrụ e nyere gị, ihe i kwesịrị iche abụghị naanị ego ole a ga-akwụ gị, kamakwa ihe o nwere ike ime adịm ná mma gị na Jehova nakwa nke ezinụlọ gị na Jehova. (Luk 14:28) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ ahapụ di m ma ọ bụ nwunye m gaa biri ebe ọzọ, olee nsogbu o nwere ike ịkpata? M̀ ka ga-enwe ike ịna-aga ọmụmụ ihe niile, na-aga ozi ọma, mụ na ụmụnna m ana-anọrịkwa?’ Ọ bụrụ na i nwere ụmụ, ajụjụ dị mkpa i kwesịkwara ịjụ onwe gị bụ: “Olee otú m ga-esi ‘na-azụ ụmụ m, na-agbazikwa ha otú Jehova chọrọ’ ma ọ bụrụ na mụ na ha anọghị?” (Efe. 6:4) Ị chọwa ikpebi ihe ị ga-eme, soro ihe Jehova kwuru, ọ bụghị ihe ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị na-anaghị eme ihe Baịbụl kwuru gwara gị.c E nwere otu nwanna aha ya bụ Tony. O bi n’ebe ọdịda anyanwụ Eshia. E nyere ya ọtụtụ ohere ịga rụwa ọrụ ga-akwụpụta ya ụgwọ n’obodo ọzọ. Ma, mgbe o kpechara ekpere banyere ya, ya na nwunye ya ekwurịtakwa ya, kama ikweta ịga rụwa ọrụ ndị ahụ, o kpebiri ka ha selata aka n’ego ha na-emefu n’ezinụlọ ha. Mgbe nwanna a chetara ihe merenụ, ọ sịrị: “Enyerela m ọtụtụ ndị aka ịbịa mata Jehova. Ụmụ anyị ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi. Ezinụlọ anyị amụtala na ọ bụrụhaala na anyị emee ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:33, Jehova ga na-elekọta anyị.”
MGBE Ị NA-AHAZI OTÚ Ị GA-ESI ELEKỌTA ONWE GỊ MA Ị KAWA NKÁ
13. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ugbu a ga-eme ka anyị nwee ego anyị ga-eji na-elekọta onwe anyị n’ọdịnihu?
13 Anyị nwekwara ike igosi otú anyị tụkwasịruru Jehova obi ma anyị na-ahazi otú anyị ga-esi elekọta onwe anyị ma anyị kawa nká. Baịbụl gbara anyị ume ka anyị rụsie ọrụ ike ka anyị nwee ike inweta ego anyị ga-eji na-elekọta onwe anyị n’ọdịnihu. (Ilu 6:6-11) Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ dị mma ichekwa ego ụfọdụ anyị ga-eji na-elekọta onwe anyị n’ọdịnihu. Ego nwere ike ichebetụ mmadụ. (Ekli. 7:12) Mana, anyị ekwesịghị ime ka ịchụ ego bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.
14. Olee otú Ndị Hibru 13:5 ga-esi enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị?
14 Jizọs kọrọ otu akụkọ gosiri na onye na-akpakọta ego ma “ọ bụghị ọgaranya n’anya Chineke” dị iberiibe. (Luk 12:16-21) E nweghị onye ma ihe echi ga-abụ. (Ilu 23:4, 5; Jems 4:13-15) E nwere otu nsogbu na-abịara Ndị Kraịst niile. Jizọs sịrị na anyị kwesịrị ịdị njikere ‘ịhapụ’ ihe niile anyị nwere ka anyị nwee ike ịbụ ndị na-eso ụzọ ya. (Luk 14:33) Ọ bụ ihe a mere Ndị Kraịst nọ na Judia n’oge ndịozi Jizọs. Ha dị njikere iji obi ụtọ hapụ ihe niile ha nwere. (Hib. 10:34) N’oge anyị a kwa, ọtụtụ ụmụnna anyị ahapụla ọrụ ha ma ọ bụ ihe ndị ha nwere n’ihi na ha ekweghị akwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Mkpu. 13:16, 17) Gịnị nyeere ha aka ime ya? Obi siri ha ezigbo ike ná nkwa Jehova kwere, nke bụ́: “E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.” (Gụọ Ndị Hibru 13:5.) Anyị na-agbalịsi ike kwadebe ihe anyị ga-eji lee onwe anyị nká. Mana, ọ bụrụ na ihe anyị na-atụghị anya ya emee anyị, obi siri anyị ike na Jehova ga-akwado anyị.
15. Olee otú ndị nne na nna kwesịrị isi na-ele ụmụ ha anya? (Kọwaakwa foto.)
15 N’obodo ụfọdụ, ihe mere ụfọdụ ndị di na nwunye ji amụ ụmụ bụ ka ụmụ ha too, kpata ego, lee ha nká. Baịbụl kwuru na ndị nne na nna kwesịrị ịna-egboro ụmụ ha mkpa ha. (2 Kọr. 12:14) N’eziokwu, ọ bụrụ na nne na nna akaa nká, o nwere ike ịdị mkpa ka ụmụ ha nye ha ego na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa ha ga-eji na-elekọta onwe ha. Ọtụtụ ndị na-ejikwa obi ụtọ emere nne na nna ha otú ahụ. (1 Tim. 5:4) Ma, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ghọtara na ihe ga-akacha eme ha obi ụtọ bụ inyere ụmụ ha aka ịbụ ndị na-efe Jehova, ọ bụghị ime ka ụmụ ha were ịkpatara ha akụ̀ ka ihe kacha mkpa.—3 Jọn 4.
Di na nwunye tụkwasịrị Jehova obi na-eme ihe Baịbụl kwuru ma ha kpebiwe ihe gbasara ọdịnihu ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)d
16. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ka ha nwee ike ịna-enweta ego ha ga-eji na-elekọta onwe ha? (Ndị Efesọs 4:28)
16 Ọ bụrụ na i nyewere ụmụ gị aka ka ha mụta otú ha ga-esi na-elekọta onwe ha, gosi ha na ị tụkwasịrị Jehova obi. Malite mgbe ha dị ntakịrị kụziwere ha na ịrụsi ọrụ ike dị ezigbo mkpa. (Ilu 29:21; gụọ Ndị Efesọs 4:28.) Ka ha na-eto, nyere ha aka ịna-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ime nchọnchọ gbasara ụfọdụ ihe Baịbụl kwuru, jirizie ya nyere ụmụ ha aka ime mkpebi ndị dị mma banyere ụdị ihe ha ga-amụ n’ụlọ akwụkwọ. Ọ ga-eme ka ụmụ ha nwee ike ịna-elekọta onwe ha, nweekwa ohere ịna-ekwusakwu ozi ọma, ma ọ bụdị ịghọ ndị ọsụ ụzọ.
17. Olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya?
17 Obi kwesịrị isi ndị na-eme ihe Jehova kwuru ike na ọ ga-egboliri ha mkpa ha nakwa na ọ chọrọ ịna-eme otú ahụ. Ka ụwa ochie a ji ọsọ na-agwụ, anyị kwesịrị ịtụkwasịkwu Jehova obi. Ma, n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, ka anyị kpebisie ike na anyị ga-atụkwasị Jehova obi na ọ ga-eji ike ya na-egboro anyị mkpa anyị. Ka obi sie anyị ike na e nweghị ihe nyịrị ya nakwa na ọ ga-elekọtali anyị n’agbanyeghị ebe anyị nọ.
ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị
a Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọktọba 2023.
b Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Septemba 15, 2014.
c Gụọ isiokwu bụ́ “E Nweghị Onye Ga-abụli Ohu Nna Ukwu Abụọ” nke gbara n’Ụlọ Nche Eprel 15, 2014.
d NKỌWA FOTO: Ebe di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na nwa ha na-akparịta. Nwa ha ahụ na di ya so na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze.