Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Eprel p. 26-31
  • Ụmụnna Nwoke Na-eto Eto, Na-emenụ Ka Mak na Timoti

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụnna Nwoke Na-eto Eto, Na-emenụ Ka Mak na Timoti
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • DỊRỊ NJIKERE IJERE JEHOVA NA NDỊ ỌZỌ OZI KA MAK
  • KA IHE GBASARA NDỊ ỌZỌ NA-EMETỤ GỊ N’OBI KA TIMOTI
  • NDỤMỌDỤ PỌL GA-ENYERE GỊ AKA
  • IJERE NDỊ ỌZỌ OZI GA-EME KA JEHOVA GỌZIE GỊ
  • Ha Nọ “Na-eme Ka Ọgbakọ Ndị Dị Ebe Ahụ Sie Ike n’Okwukwe”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Ụmụnna Nwoke, Ùnu Na-agbalịsi Ike Ka Unu Ruo Eruo Ịbụ Ndị Ohu Na-eje Ozi?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Na-echeta na Jehova Bụ “Chineke Dị Ndụ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Eprel p. 26-31

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 18

ABỤ NKE 65 Gaa n’Ihu

Ụmụnna Nwoke Na-eto Eto, Na-emenụ Ka Mak na Timoti

“Gị na Mak soro bịa, n’ihi na ọ ga-enyere m aka n’ozi m na-ejere Chineke.”​—2 TIM. 4:11.

IHE A GA-AMỤ

Otú ihe Mak na Timoti mere nwere ike isi nyere ụmụnna nwoke na-eto eto aka ịmụta àgwà ndị ga-eme ka ha jekwuoro ndị ọzọ ozi.

1-2. Olee ihe ndị gaara egbochi Mak na Timoti ijekwuru Jehova ozi?

ỤMỤNNA nwoke na-eto eto, ùnu chọrọ ijekwuru Jehova ozi ma na-enyekwuru ndị nọ n’ọgbakọ unu aka? O doro anya na unu chọrọ ime otú ahụ. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ịhụ ọtụtụ ụmụnna nwoke na-eto eto dị njikere ijere ndị ọzọ ozi. (Ọma 110:3) Ma, o nwere ike ọ gaghị adịrị gị mfe ijekwuru Jehova ozi. Ọ̀ na-esiri gị ike n’ihi na ị maghị otú ihe ga-adịrị gị ma ọ bụkwanụ ebe Jehova ga-achọ ka ị gaa? Ò nwetụla mgbe ị na-ekweghị anara ọrụ e nyere gị n’ihi na i chere na ị gaghị arụli ya nke ọma? Ọ bụrụ na e nwetụla, ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ.

2 E nwere mgbe ọ dị Mak na Timoti otú ahụ. Mana, ha kpebiri ijekwuru Jehova ozi n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ha chere na ha agaghị emeli ya. Ha amaghịkwa ihe echi ga-abụ. Mgbe Pọl onyeozi na Banabas gwara Mak ka o soro ha na njem ozi ala ọzọ nke mbụ ha gara, ọ ga-abụ na Mak na mama ya bi n’ụlọ mara mma. (Ọrụ 12:12, 13, 25) Mana, Mak hapụrụ ụlọ ha ka o nwee ike ijekwuru Jehova ozi. O bu ụzọ kwaga Antiọk, mechaakwa soro Pọl na Banabas gaa ebe ndị ọzọ dị anya. (Ọrụ 13:1-5) Otú ahụkwa ka ọ dị Timoti. Ikekwe, ya na nne na nna ya ka bi mgbe Pọl gwara ya ka ọ bịa soro ya gaa kwusaa ozi ọma. Timoti ka bụ okorobịa n’oge ahụ. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na o chere na o rughị eru iso Pọl gawa ikwusa ozi ọma. (I nwere ike ịtụle 1 Ndị Kọrịnt 16:10, 11 na 1 Timoti 4:12.) Ma, Timoti kwetara soro Pọl gawa. Ọtụtụ ihe ọma mekwaara ya n’ozi Jehova.​—Ọrụ 16:3-5.

3. (a) Olee otú anyị si mara na Pọl ejighị Mak na Timoti egwu egwu? (2 Timoti 4:6, 9, 11) (Kọwaakwa foto.) (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

3 Mak na Timoti mụtara otú ha ga-esi na-arụ ọtụtụ ọrụ n’ọgbakọ n’oge ha ka na-eto eto. Pọl ejighị ụmụ okorobịa ndị a egwu egwu. Ọ bụ ya mere na mgbe ọ ma na ọ ga-anwụ n’oge na-adịghị anya, ọ kpọrọ ha ka ha bịa ka ya na ha nọrọ. (Gụọ 2 Timoti 4:6, 9, 11.) Olee àgwà ọma ndị Mak na Timoti nwere mere Pọl ji hụ ha n’anya otú ahụ? Olee otú ụmụnna nwoke na-eto eto ga-esi na-eme ka ha? Oleekwa otú ndụmọdụ Pọl nyere ha ga-esi baara ụmụnna nwoke na-eto eto uru?

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe Mak na-akwadebere Pọl na Banabas nri na mmanya. 2. Ebe Timoti na-agụrụ ndị okenye akwụkwọ ozi, ha ana-ege ntị.

Pọl hụrụ Mak na Timoti n’anya nke ukwuu n’ihi na ha nọ na-arụ ezigbo ọrụ n’ofufe Jehova mgbe ha ka na-eto eto (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)b


DỊRỊ NJIKERE IJERE JEHOVA NA NDỊ ỌZỌ OZI KA MAK

4-5. Olee otú Mak si gosi na ọ dị njikere ijere ndị ọzọ ozi?

4 Ijere ndị ọzọ ozi nwere ike ịpụta na ị ga-agbasi mbọ ike na-enyere ha aka, ma mgbe o siiri gị ike ime otú ahụ. Ọ bụ ihe Mak mere. Mgbe Pọl na-ekweghị akpọ ya aga ozi ala ọzọ nke abụọ, ọ ga-abụ na o wutere Mak nke ukwuu. (Ọrụ 15:37, 38) Mana o meghị ka Mak kwụsị ijere ụmụnna ya ozi.

5 Mak sooro Banabas, bụ́ onye ikwu ya, gawa ozi n’ebe ọzọ. Mgbe ihe dị ka afọ iri na otu gachara, a tụrụ Pọl mkpọrọ nke mbụ ya na Rom, Mak agaa ebe ahụ ka ọ gbaa ya ume. (Faị. 23, 24) N’eziokwu, obi dị Pọl ezigbo ụtọ maka aka a Mak nyeere ya. O kwuru na Mak ‘kasiri ya nnọọ obi.’​—Kọl. 4:10, 11.

6. Olee uru Mak ritere maka na ya na ụmụnna ndị ma nke a na-akọ rụkọrọ ọrụ? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

6 Mak ritere ọtụtụ uru n’ihi na ya na ụmụnna ndị ma nke a na-akọ na-akpakọrịta. Mgbe Mak na Pọl nọchara na Rom, ọ gara Babịlọn ka ya na Pita rụkọọ ọrụ. Ya na Pita bịara dị n’ezigbo mma nke na Pita kpọrọ ya “Mak nwa m.” (1 Pita 5:13) Ka ha na-arụkọ ọrụ, ọ ga-abụ na Pita gwara nwa okorobịa a bụ́ enyi ya ọtụtụ ihe magburu onwe ha gbasara ndụ Jizọs na ozi ọma ọ gara. Mak mechara dee ihe ndị ahụ n’akwụkwọ Baịbụl bu aha ya.a

7. Olee otú otu nwanna aha ya bụ Seung-Woo si mee ka Mak? (Kọwaakwa foto.)

7 Mak akwụsịghị ije ozi Jehova. Ya na ụmụnna ndị ma nke a na-akọ nọkwa na-arụkọ ọrụ. Olee otú ị ga-esi na-eme ka Mak? Ọ bụrụ na e nwere ọrụ ị chọrọ ịrụ n’ọgbakọ ị na-enwetabeghị, adala mbà. Na-achọ ihe ndị ị ga-emeliri Jehova na ọgbakọ ya. Ọ bụ ihe otu nwanna bụ́ okenye ugbu a aha ya bụ Seung-Woo mere. Mgbe ọ ka na-eto eto, ọ na-eji onwe ya atụnyere ụmụnna ndị na-eto eto ibe ya. Ndị okenye nyere ụfọdụ n’ime ha ọrụ ndị yanwa na-anaghị arụ n’oge ahụ. O mere ka o chee na o nweghị ihe e ji ya kpọrọ. O mechakwara kọọrọ ndị okenye otú obi dị ya. Otu okenye gbara ya ume ka ọ na-eme ike ya niile na-ejere ndị ọzọ ozi, ọ bụrụgodị na o nweghị onye hụrụ ihe ọma ndị ahụ ọ na-eme. Ihe ahụ okenye ahụ gwara Seung-Woo mere ka o wepụta onwe ya na-enyere ndị agadi na ndị ọzọ chọrọ ka a na-ebuga ha ọmụmụ ihe aka ịga ọmụmụ ihe. Mgbe o chetara ihe ahụ, ọ sịrị: “M bịara ghọtakwuo ihe inyere ndị ọzọ aka pụtara. M na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ihi na m na-enyere ndị ọzọ aka.”

Ebe otu nwanna na-eto eto na-ebuga nwanna mere agadi ọmụmụ ihe.

Olee uru ụmụnna nwoke na-eto eto ga-erite ma ọ bụrụ na ha na ụmụnna ndị ma nke a na-akọ ana-akpakọrịta n’ọgbakọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)


KA IHE GBASARA NDỊ ỌZỌ NA-EMETỤ GỊ N’OBI KA TIMOTI

8. Gịnị mere Pọl ji họrọ Timoti ka o soro ya gaa ikwusa ozi ọma? (Ndị Filipaị 2:19-22)

8 Ọ dị mkpa ka e nwee ụmụnna katara obi ga-eso Pọl mgbe ọ chọrọ ịgaghachi n’obodo ndị a kpagburu ya. O bu ụzọ họrọ otu Onye Kraịst ma nke a na-akọ aha ya bụ Saịlas ka o soro ya gaa. (Ọrụ 15:22, 40) Pọl mechakwara họrọ Timoti. Gịnị mere o ji họrọ ya? Otu ihe bụ na ụmụnna na-ekwu okwu ọma gbasara Timoti. (Ọrụ 16:1, 2) O jikwa obi ya niile hụ ndị mmadụ n’anya.​—Gụọ Ndị Filipaị 2:19-22.

9. Olee otú Timoti si gosi na o ji obi ya niile hụ ụmụnna ya n’anya?

9 Malite n’oge Timoti so Pọl na-eje ozi, Timoti gosiri na ihe gbasara ndị ọzọ na-echu ya ụra karịa nke yanwa. Ọ bụ ya mere obi ji sie Pọl ike ịhapụ ya na Beria ka ọ na-agba ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ n’ebe ahụ ume. (Ọrụ 17:13, 14) N’oge ahụ, ọ ga-abụrịrị na e nwere ọtụtụ ihe Timoti mụtara n’aka Saịlas ya na ya nọ ebe ahụ. Ma, Pọl mechara ziga naanị Timoti ka ọ gaa Tesalonaịka gbaa ụmụnna nọ ebe ahụ ume. (1 Tesa. 3:2, ihe e dere n’ala ala peeji ya.) N’ime ihe dị ka afọ iri na ise ọ nọrọ ebe ahụ, ọ mụtara iso “ndị na-ebe ákwá bee ákwá,” na-emetakwara ndị na-ata ahụhụ ebere. (Rom 12:15; 2 Tim. 1:4) Olee otú ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike isi na-eme ka Timoti?

10. Olee otú Nwanna Woo Jae si mụta igosikwu ndị ọzọ na ihe gbasara ha na-emetụ ya n’obi?

10 Otu nwanna aha ya bụ Woo Jae mụtara igosikwu ndị ọzọ na ihe gbasara ha na-emetụ ya n’obi. Mgbe ọ na-eto eto, ọ chọpụtara na ọ na-esiri ya ike ịmalite ịkpanyere ụmụnna ndị mere agadi ụka. Naanị ihe ọ na-eme bụ ikele ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, gafere. Otu okenye tụụrụ ya aro ka ọ malite ịkọrọ ụmụnna ihe ndị na-amasị ya gbasara ha. Okenye ahụ gwakwara ya ka o chee banyere ihe nwere ike ịmasị ndị ọzọ. Nwanna Woo Jae mere ihe ahụ okenye ahụ gwara ya. Ugbu a, ọ bụzi okenye. Ọ sịrị: “Ọ naghịzi esiri m ike ịkpanyere ma nwata ma okenye ụka. Obi dị m ụtọ na mụ aghọtakwuola ihe na-echegbu ndị ọzọ. Ọ na-eme ka m na-enyekwuru ụmụnna m aka.”

11. Olee otú ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike isi mụta igosi na ihe gbasara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-emetụ ha n’obi? (Kọwaakwa foto.)

11 Ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike ịmụta igosi ndị ọzọ na ihe gbasara ha na-emetụ ha n’obi. N’ọmụmụ ihe, gị na ụmụnna dị iche iche kwurịta okwu, ma ndị mere agadi ma ndị na-eto eto. Jụọ ha otú ha mere, geekwa ha ntị ma ha na-aza gị. Ka oge na-aga, i nwere ike ịchọpụta otú ị ga-esi enyere ha aka. I nwere ike ịhụ otu di na nwunye mere agadi chọrọ onye ga-akụziri ha otú e si achọta ihe na JW Library®. I nwekwara ike ịmata na ha chọrọ onye ha na ya ga-eso aga ozi ọma. Ì nwere ike ịhazi ka ị kụziere ụmụnna ndị ahụ otú ha ga-esi na-apị ekwentị ha ma ọ bụ hazie ka gị na ha rụọ n’ozi ọma? Ọ bụrụ na i si otú a na-enyere ụmụnna ndị a aka, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga na-eme ka gị.

Ebe otu nwanna na-eto eto na nwanna merela agadi na-aga ozi ụlọ n’ụlọ. Nwanna nke mere agadi na-ezi otu nwoke ozi ọma, nwanna nke bụ́ okorobịa ejiri tablet ya na-akpọnyere ya vidio.

E nwere ọtụtụ ụzọ ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike isi nyere ọgbakọ aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


NDỤMỌDỤ PỌL GA-ENYERE GỊ AKA

12. Olee otú ndụmọdụ Pọl nyere Timoti nwere ike isi baara ụmụnna nwoke na-eto eto uru?

12 Pọl nyere Timoti ndụmọdụ ga-enyere ya aka ka ọ na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ ma na-ejere Jehova ozi. (1 Tim. 1:18; 2 Tim. 4:5) Ụmụnna na-eto eto nwekwara ike ịmụta ihe na ndụmọdụ ahụ Pọl nyere Timoti. Olee otú ọ bụ? Gụọ akwụkwọ ozi abụọ ahụ Pọl degaara Timoti ka ọ̀ bụ gị ka Pọl detaara ya, leekwa ihe i nwere ike ịmụta na ndụmọdụ ndị ahụ. Legodị ụfọdụ n’ime ha.

13. Olee ihe i kwesịrị ime ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?

13 “Na-azụ onwe gị ka ị bụrụ onye na-efe Chineke.” (1 Tim. 4:7b) Pọl gwara Timoti ka ọ na-erubere Jehova isi, na-emekwa ihe ndị ga-eme ya obi ụtọ. Mana, mmadụ kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka o nwee ike ịna-erubere Jehova isi. Ihe Pọl kwuru gosiri na ihe a bụ eziokwu. A na-ejikarị okwu Grik a sụgharịrị “na-azụ onwe gị” akọwa otú ndị so n’asọmpi si agbasi mbọ ike na-azụ onwe ha ma ha kwadebewe maka asọmpi. Ha na-arụ ahụ́ ha ụka. Anyịnwa kwesịkwara ịna-arụ ahụ́ anyị ụka ka anyị nwee ike ịmụta àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso.

14. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi na-agụ Baịbụl? Mee ihe atụ.

14 Ọ dị mkpa ka ị gbalịsie ike na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ihe i kwesịrị ibu n’obi na-agụ ya bụ ka gị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Dị ka ihe atụ, ị gụwa akụkọ gbasara Jizọs na nwa okorobịa ahụ bara ọgaranya, gịnị ka ọ na-akụziri gị gbasara Jehova? (Mak 10:17-22) Nwa okorobịa ahụ kwetara na Jizọs bụ Mezaya, mana okwukwe ya esighị ike nke ịghọ onye na-eso ụzọ ya. N’agbanyeghị ya, Jizọs ‘nwere mmasị n’ebe ọ nọ’ ma jiri obiọma gwa ya okwu. O doro anya na Jizọs chọrọ ka o kpebie ife Jehova. Otú a Jizọs si hụ nwa okorobịa a n’anya ka Jehova sikwa hụ ya n’anya. (Jọn 14:9) Ka ị na-eche gbasara akụkọ a na otú ihe si dịrị gị, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m kwesịrị ime ka m nwee ike ịbịarukwu Jehova nso ma na-ejekwuru ndị ọzọ ozi?’

15. Gịnị mere nwanna nwoke na-eto eto ji kwesị ịna-eme ihe ụmụnna ga-amụta ihe na ya? Mee ihe atụ. (1 Timoti 4:12, 13)

15 “Bụrụ [onye] ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ji ama atụ.” (Gụọ 1 Timoti 4:12, 13.) Ihe Pọl gwara Timoti abụghị naanị ka ọ na-agụ ihe nke ọma ma na-akụzi ihe nke ọma. Ọ chọrọ ka ọ na-amụtakwa àgwà ọma ndị dị ka ịhụnanya, okwukwe, na ibi ndụ dị ọcha. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe mmadụ na-eme dị mkpa karịa ihe ọ na-ekwu. Ka e were ya na e kenyere gị ikwu okwu gbasara otú anyị ga-esi na-ejikwu ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma. Ọnụ ga-aka esi gị ike ikwu ya ma ọ bụrụ na ị na-eme ike gị niile n’ozi ọma. Ụmụnna ga-aka eme ihe ị na-ekwu ma ọ bụrụ na ha ahụ na ị na-eme ya.​—1 Tim. 3:13.

16. (a) Olee ụzọ ihe ise nwanna nwoke na-eto eto nwere ike ịna-eme ụmụnna ga-amụta ihe na ha? (b) Olee otú nwanna nwoke na-eto eto nwere ike isi bụrụ onye e ji ama atụ ‘n’otú o si ekwu okwu’?

16 Na 1 Timoti 4:12, Pọl kwuru ụzọ ihe ise nwanna nwoke na-eto eto nwere ike ịna-eme ụmụnna ga na-amụta ihe na ha. Ọ ga-adị mma ma i wepụta oge n’oge i ji amụ ihe mụọ gbasara nke ọ bụla n’ime ha. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị chọrọ ịna-emekwu nke ọma ‘n’otú i si ekwu okwu.’ Chee gbasara ụzọ ndị ị ga-esi na-ekwu ihe ga na-agba ndị ọzọ ume. Ọ bụrụ na gị na nne na nna gị ka bi, gbalịa na-ekelekwu ha maka ihe ndị ha na-emere gị. Ọmụmụ ihe gbasaa, i nwere ike ịgakwuru onye mere ihe omume, gwa ya ihe masịrị gị n’ihe omume ahụ o mere. Gbalịakwa jiri okwu nke gị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ị na-agbalịsi ike na-ekwu okwu nke ọma, ndị ọzọ ga-ahụ na ị na-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova.​—1 Tim. 4:15.

17. Gịnị ga-enyere nwanna nwoke na-eto eto aka ime ihe ndị o kpebiri ime n’ofufe Jehova? (2 Timoti 2:22)

17 “Gbaara ihe na-agụ ndị na-eto eto agụụ ọsọ. Gbasie mbọ ike na-eme ezi omume.” (Gụọ 2 Timoti 2:22.) Pọl gwara Timoti ka ọ gbasie mbọ ike zere ihe ọ bụla nwere ike ime ka ọ kwụsị ịna-ejekwuru Jehova ozi ma ọ bụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka ya na Jehova gharazie ịdị ná mma. O nwekwara ike ịbụ na ị chọpụtala na ime ụfọdụ ihe nwere ike ha adịghị njọ, mana ha ga-eme ka ị gharazie inwe oge ị ga-eji na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Dị ka ihe atụ, chee gbasara oge ị na-eji emega ahụ́, achọ ihe n’Ịntanet, ma ọ bụ agba gem. Ì nwere ike iji ụfọdụ oge ndị ahụ na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova? I nwere ike iwepụta onwe gị soro na-arụzi ihe ndị mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ma ọ bụ jiri ihe a na-akwagharị akwagharị na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na i soro na-eme ihe ndị a, i nwere ike imetakwu ndị enyi ga-enyere gị aka inwe ihe ndị i kpebiri ime n’ozi Jehova nakwa ime ha.

IJERE NDỊ ỌZỌ OZI GA-EME KA JEHOVA GỌZIE GỊ

18. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ndụ Mak na Timoti biri tọrọ ha ụtọ?

18 E nwere ihe ndị Mak na Timoti gbanwere ná ndụ ha ka ha nwee ike ijekwuru ndị ọzọ ozi. O mekwara ka ha na-enwe obi ụtọ ná ndụ. (Ọrụ 20:35) Mak gara ebe dị iche iche n’ụwa nyere ụmụnna ya aka. O dekwara akụkọ na-atọ ụtọ gbasara ndụ Jizọs na ozi o jere n’ụwa. Timoti nyeere Pọl aka ihiwe ọgbakọ dị iche iche nakwa ịgba ụmụnna ume. O doro anya na obi dị Jehova ụtọ maka mbọ ndị a Mak na Timoti gbakwuru n’ozi ya.

19. Gịnị mere ụmụnna nwoke na-eto eto ji kwesị ige ntị na ndụmọdụ Pọl nyere Timoti? Oleekwa uru ọ ga-abara ha?

19 Akwụkwọ ozi Pọl degaara Timoti gosiri na ọ hụrụ Timoti n’anya nke ukwuu. Akwụkwọ ozi ndị ahụ gosikwara na Jehova hụrụ ununwa bụ́ ụmụnna nwoke na-eto eto n’anya nke ukwuu. Ọ chọrọ ka ihe gaziere unu. N’ihi ya, gbalịsie ike ka ị na-eme ihe Pọl kwuru nakwa ka ị na-ejekwuru ụmụnna gị ozi. I mee otú ahụ, ndụ ga na-atọ gị ụtọ ugbu a. Ị ga-ejidesi “ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ aka ike.”​—1 Tim. 6:18, 19.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị ka ị mụtara n’aka Mak?

  • Olee otú ị ga-esi na-eme ka Timoti n’otú i si emeso ndị ọzọ?

  • Olee ndụmọdụ Pọl nyere nwere ike inyere nwanna nwoke na-eto eto aka ịna-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova?

ABỤ NKE 80 ‘Detụ Jehova Ire, Hụ na Ọ Dị Mma’

a Ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ Pita n’obi nke ukwuu. Ọ bụ ya mere na o sighịrị ya ike ịkọwara Mak ihe ndị Jizọs mere na otú obi dị ya. O nwekwara ike ịbụ ya mere na mgbe Mak na-ede akụkọ ndụ Jizọs, o kwuru ọtụtụ ugboro gbasara otú obi dị Jizọs na ihe ndị o mere.​—Mak 3:5; 7:34; 8:12.

b NKỌWA FOTO: Ebe Mak na-ejere Pọl na Banabas ozi mgbe ha na-aga ozi ala ọzọ. Ebe Timoti na-aga eleta ọgbakọ ka ọ gbaa ha ume ma mee ka okwukwe ha sie ike.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya