ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 20
ABỤ NKE 7 Jehova Bụ Ike Anyị
Obi Sie Gị Ike na Jehova Ga-akasi Gị Obi
“Ka e too . . . Nna na-emetere ndị mmadụ ebere, Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ.”—2 KỌR. 1:3.
IHE A GA-AMỤ
Ihe ndị anyị ga-amụta n’otú Jehova si kasie ndị Juu a dọọrọ n’agha obi.
1. Kọwaa otú ihe si dịrị ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn.
CHEGODỊ otú obi dị ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn. Ha hụrụ ka e bibiri obodo ha. N’ihi mmehie ha na nke ndị nna nna ha, e si n’obodo ha dọrọ ha n’agha laa n’obodo ha na-amaghị. (2 Ihe 36:15, 16, 20, 21) N’eziokwu, e nwere ihe ụfọdụ a hapụrụ ha ka ha na-eme na Babịlọn. (Jere. 29:4-7) Ma, ihe adịghịrị ha mfe, ọ bụghịkwa ebe ahụ ka ha chọrọ ibi. Olee otú obi dị ha maka otú ihe si dịrị ha? Otu n’ime ha kwuru, sị: “Anyị nọdụrụ ala n’akụkụ osimiri ndị dị na Babịlọn. Anyị bere ákwá mgbe anyị chetara Zayọn.” (Ọma 137:1) E kwesịrị ịkasi ndị ahụ a dọọrọ n’agha obi. Ma, ònye ga-akasi ha obi?
2-3. (a) Gịnị ka Jehova meere ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn? (b) Gịnị ka anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu a?
2 Jehova bụ “Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ.” (2 Kọr. 1:3) Jehova hụrụ ndị na-efe ya n’anya, chọọkwa ịkasi ha obi. Ọ ma na ụfọdụ n’ime ndị ahụ a dọọrọ n’agha ga-akwa mmakwaara maka nnupụisi ha, fewekwa ya otú ọ chọrọ. (Aịza. 59:20) N’ihi ya, ihe karịrị otu narị (100) afọ tupu a dọrọ ha n’agha, o ji mmụọ nsọ ya mee ka Aịzaya onye amụma dee akwụkwọ Aịzaya. Olee uru akwụkwọ ahụ ga-abara ha? Aịzaya sịrị: “Chineke unu kwuru, sị: ‘Kasienụ ndị m obi. Kasienụ ha obi.’” (Aịza. 40:1) N’eziokwu, Jehova si n’akwụkwọ Aịzaya kwuo ihe ga-akasi ndị Juu a dọọrọ n’agha obi.
3 Mgbe ụfọdụ, e kwesịkwara ịkasi anyị obi otú ahụ a kasiri ndị Juu a dọọrọ n’agha. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ atọ Jehova si kasie ndị Juu a dọọrọ n’agha obi. (1) O kwere nkwa ịgbaghara ndị chegharịrịnụ. (2) O mere ka ndị ya nwee olileanya. (3) O nyekwaara ha aka ka ha kwụsị ịtụ ụjọ. Ka anyị na-eleba anya n’ihe ndị a, chọpụta otú ihe ndị Jehova gwara ha ga-esi kasie anyị obi taa.
JEHOVA JI OBI EBERE NA-AGBAGHARA ANYỊ
4. Olee otú Jehova si gosi na ọ bụ Chineke na-eme ebere? (Aịzaya 55:7)
4 Jehova bụ “Nna na-emetere ndị mmadụ ebere.” (2 Kọr. 1:3) O gosiri àgwà a mgbe o kwere ndị Juu a dọọrọ n’agha nkwa na ọ ga-agbaghara ha ma ha chegharịa. (Gụọ Aịzaya 55:7.) Ọ sịrị: “M ga-emere gị ebere maka na m ga-ahụ gị n’anya ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịza. 54:8) Olee otú Jehova ga-esi meere ha ebere? Ọ bụ eziokwu na ndị Juu ga-ata ahụhụ mmehie ha, ma Jehova kwere nkwa na ha agaghị anọ na Babịlọn ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-anọru naanị oge a kara aka. (Aịza. 40:2) Ọ ga-abụrịrị na okwu a kasiri ndị Juu chegharịrịnụ ezigbo obi, meekwa ka obi sie ha ike.
5. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike karịa otú o siri ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn na Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị?
5 Gịnị ka anyị na-amụta? Jehova dị njikere ịgbaghara ndị ohu ya mmehie ha kpamkpam. Taa, obi kwesịrị isi anyị ike karịa ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn na Jehova ga-agbaghara anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị ma ihe Jehova mere ka o nwee ike ịgbaghara mmehie anyị. Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara Aịzaya buru amụma ahụ, Jehova zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka ọ bịa n’ụwa were ndụ ya chụọ àjà maka ndị mmehie niile chegharịrịnụ. Ọ bụ àjà ahụ Jizọs chụrụ mere Jehova ga-eji “hichapụ” mmehie anyị, ya bụ, gbaghara anyị mmehie anyị kpamkpam. (Ọrụ 3:19; Aịza. 1:18; Efe. 1:7) N’eziokwu, Jehova bụ Chineke na-eme ebere.
6. Gịnị mere iche gbasara otú Jehova si agbaghara anyị ji akasi anyị obi? (Kọwaakwa foto.)
6 Ihe e kwuru n’Aịzaya 55:7 ga-akasi anyị obi ma obi na-ama anyị ikpe maka ihe anyị mejọrọ. Obi ka nwere ike ịna-ama ụfọdụ n’ime anyị ikpe maka mmehie ha mere n’oge gara aga ha hapụrụla, karịchaa ma ọ bụrụ na ha ka na-ata ahụhụ mmehie ahụ. Ma, ọ bụrụ na anyị ekwupụtala mmehie ahụ ma gbanwee, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agbagharala anyị. Ọ bụrụkwa na Jehova agbaghara anyị, ọ na-echefu mmehie ahụ anyị mere. (I nwere ike ịtụle Jeremaya 31:34.) N’ihi ya, ọ bụrụ na Jehova anaghịzi eche gbasara mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga, anyị ekwesịghịkwa ịnọ na-eche gbasara ha. Ihe dị Jehova mkpa bụ ihe anyị na-eme ugbu a, ọ bụghị ihe anyị mejọrọ n’oge gara aga. (Ezik. 33:14-16) N’oge na-adịghị anya, Jehova bụ́ Nna anyị nke na-emetere ndị mmadụ ebere ga-ewepụ ahụhụ niile mmehie anyị mere kpataara anyị kpamkpam.
Ihe dị Jehova mkpa bụ ihe ndị anyị na-eme ugbu a, ọ bụghị ihe ndị anyị mejọrọ n’oge gara aga (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)
7. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịgakwuru ndị okenye ma ọ bụrụ na anyị mere mmehie dị oké njọ?
7 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na obi na-ama anyị ikpe maka na anyị mere mmehie dị oké njọ ma na-agbalị izochiri ya ndị ọzọ? Baịbụl gwara anyị ka anyị gwa ndị okenye ka ha nyere anyị aka. (Jems 5:14, 15) Ma, o nwere ike ọ gaghị adịrị anyị mfe ịgwa ha ihe anyị mere. Ihe ga-enyere anyị aka ịgakwuru ndị okenye bụ ma ọ bụrụ na anyị echegharịala nakwa ma anyị cheta na Jehova na ụmụ nwoke ndị ahụ ọ họpụtara ka ha nyere anyị aka hụrụ anyị n’anya, nakwa na ha ga-emere anyị ebere. Legodị otú ebere Jehova si kasie otu nwanna aha ya bụ Arthur obi.a Obi ya nọ na-ama ya ezigbo ikpe n’ihi ihe o mere. Ọ sịrị: “M nọ na-ele ndị gba ọtọ ruo ihe dị ka otu afọ. Ma, mgbe m gechara otu okwu e kwuru gbasara akọnuche, m gwara nwunye m na ndị okenye ihe ọjọọ a m nọ na-eme. Mgbe m gwachara ha, obi bịara ruo m ala. Mana ihe ahụ m mere ka nọkwa na-ewute m. Ndị okenye gwara m na Jehova ajụbeghị m, na ọ na-agbazi anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Okwu ha gwara m ruru m n’obi, nyekwara m aka ịmata na Jehova agbagharala m.” Taa, Nwanna Arthur bụ ọsụ ụzọ oge niile na ohu na-eje ozi. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ịmata na ọ bụrụhaala na anyị echegharịa ná mmehie anyị, Jehova dị njikere ịgbaghara anyị.
JEHOVA NA-EME KA ANYỊ NWEE OLILEANYA
8. (a) Olee olileanya Jehova mere ka ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn nwee? (b) Dị ka e kwuru n’Aịzaya 40:29-31, olee otú obi ga-adị ndị Juu chegharịrịnụ maka olileanya Jehova mere ka ha nwee?
8 E lewe ya anya otú mmadụ si ele ihe anya, ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha enweghị ike ịlaghachi n’obodo ha. Ihe e ji mara ndị Babịlọn bụ na ha anaghị ahapụ ndị ọ bụla ha dọọrọ n’agha ka ha laa. (Aịza. 14:17) Ma Jehova mere ka ndị ya nwee olileanya. O kwere nkwa na ọ ga-eme ka ha nwere onwe ha nakwa na e nweghị ihe ga-akwụsịli ya ime otú ahụ. (Aịza. 44:26; 55:12) N’anya Jehova, ndị Babịlọn dị ka uzuzu. (Aịza. 40:15) Obere ikuku kusa uzuzu, ya efuo. Ọ bụ otú ahụ ka ọ ga-adịrị Jehova mfe ịnapụta ndị ya n’aka ndị Babịlọn. Olee otú olileanya a ga-esi nyere ndị Juu ahụ aka? Ọ ga-akasi ha obi. Ma, e nwere ihe ọzọ ọ ga-emere ha. Aịzaya sịrị: “Ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike.” (Gụọ Aịzaya 40:29-31.) N’eziokwu, olileanya ga-eme ka ha nwee ike. “Ha ga-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo.”
9. Gịnị mere ndị Juu a dọọrọ n’agha ji kwesị ịtụkwasị nkwa Jehova obi?
9 Jehova mekwara ka ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha hụ ihe mere ha ga-eji tụkwasị nkwa ya obi. Gịnị ka o mere? Chegodị gbasara amụma ndị ha ma mezurulanụ. Dị ka ihe atụ, ha ma na ndị Asiria meriri ebo iri nke Izrel, dọrọkwa ha n’agha. (Aịza. 8:4) Ha hụrụ mgbe ndị Babịlọn bibiri Jeruselem ma dọrọ ndị bi na ya n’agha. (Aịza. 39:5-7) Ha ma na eze Babịlọn rụkpọrọ Eze Zedekaya anya, kpụrụkwa ya laa Babịlọn. (Jere. 39:7; Ezik. 12:12, 13) Ihe niile Jehova gwara ha mezuru. (Aịza. 42:9; 46:10) O doro anya na ihe ndị a niile mere ka obi sie ha ike na Jehova ga-anapụta ha n’aka ndị Babịlọn otú o kwere ha ná nkwa.
10. Gịnị ga-eme ka olileanya anyị na-esikwu ike n’oge ikpeazụ a?
10 Gịnị ka anyị na-amụta? Mgbe ọ bụla obi dara anyị mbà, nkwa ndị Jehova kwere maka ọdịnihu nwere ike ịkasi anyị obi, meekwa ka anyị nwee ume. Anyị bi n’oge tara ezigbo akpụ. E nwekwara ndị iro siri ezigbo ike na-emegide anyị. Ma, anyị ekwesịghị ịda mbà. Jehova mere ka anyị nwee olileanya magburu onwe ya, ya bụ, olileanya ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ezigbo udo ga-adị, obi eruokwa anyị ala. Anyị kwesịrị ịna-eche banyere olileanya ahụ mgbe niile. Ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, olileanya anyị ga-adị ka ebe anyị kpu enyo anya ruru unyi na-ele ebe mara ezigbo mma. Anyị agaghị na-ahụcha ebe ahụ nke ọma. Olee otú anyị ga-esi hichaa enyo anya ahụ, ya bụ, mee ka olileanya anyị sikwuo ike? Ọ bụ ịna-eche gbasara otú ihe ga-esi magbuo onwe ya n’ụwa ọhụrụ. Anyị ga na-agụ isiokwu, na-ele vidio, na-egekwa egwú ndị kwuru gbasara olileanya ahụ anyị nwere. Anyị kwesịkwara ịna-ekpe ekpere na-agwa Jehova gbasara nkwa ndị o kwere anyị ndị anyị na-atụsi anya ike ịhụ mgbe ha ga-emezu.
11. Gịnị nyeere otu nwanna nwaanyị na-arịa ọrịa ọjọọ aka inwetaghachi ike?
11 Chee gbasara otú inwe olileanya si kasie otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Joy obi, meekwa ka ọ dị ike. E nwere ọrịa ọjọọ na-arịa nwanna nwaanyị a. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla m chegbuwere onwe m, m na-akọrọ Jehova otú ọ dị m nnọọ n’obi, m makwa na ọ na-aghọta m. N’oge ndị ahụ, Jehova nyere m ‘ike karịrị ike mmadụ.’” (2 Kọr. 4:7) Nwanna Nwaanyị Joy na-ejikwa uche ya na-ahụ onwe ya n’ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe a na-enweghị ‘onye bi na ya ga-asị: “Ahụ́ adịghị m.”’ (Aịza. 33:24) Ọ bụrụkwa na anyị ana-akọrọ Jehova otú ọ dị anyị n’obi ma na-eche banyere olileanya anyị, anyị ga-enwe ike idi nsogbu anyị.
12. Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị nkwa ndị Jehova kwere obi? (Kọwaakwa foto.)
12 Jehova emeerela anyị ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji tụkwasị nkwa ndị o kwere anyị obi otú ahụ o meere ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn. Chee gbasara amụma ndị anyị hụrụ mezurulanụ. Dị ka ihe atụ, anyị ahụla mba na-achị ụwa nke ‘sitụrụ ike n’ebe ụfọdụ, ma ghara isi ike n’ebe ụfọdụ.’ (Dan. 2:42, 43) Anyị na-anụ gbasara “ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche,” sorokwa na-ekwusa ozi ọma ná “mba niile.” (Mat. 24:7, 14) Amụma ndị a nakwa ọtụtụ ndị ọzọ na-eme ka obi sikwuo anyị ike na nkwa ndị Jehova kwere anyị na-emezubeghị ga-emezu.
Amụma ndị anyị na-ahụ ka ha na-emezu taa na-eme ka anyị tụkwasị nkwa ndị Jehova kwere obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)
JEHOVA NA-EME KA ANYỊ GHARA ỊTỤ ỤJỌ
13. (a) Olee nsogbu ndị ga-abịara ndị Juu a dọọrọ n’agha ma oge ha ga-eji nwere onwe ha ruo? (b) Dị ka e kwuru n’Aịzaya 41:10-13, olee otú Jehova si kasie ndị Juu a dọọrọ n’agha obi?
13 Ọ bụ eziokwu na Jehova ji olileanya magburu onwe ya kasie ndị Juu a dọọrọ n’agha obi, ma ọ ma na e nwere nsogbu ndị ga-abịara ha mgbe a ga-eme ka ha nwere onwe ha. Jehova gwara ha na oge ahụ ruwe, e nwere otu eze ga-abịa merie obodo ndị gbara Babịlọn gburugburu, lụsokwa Babịlọn agha. (Aịza. 41:2-5) N’oge ahụ, ụjọ ò kwesịrị ịtụ ndị Juu? Jehova kasiri ndị ya obi tupu oge eruo. Ọ sịrị ha: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị.” (Gụọ Aịzaya 41:10-13.) Mgbe Jehova sịrị: “Abụ m Chineke gị,” gịnị ka ọ pụtara? Ọ naghị echetara ndị Juu ka ha na-efe ya, n’ihi na ha ma na ọ bụ ihe ha kwesịrị ime. Kama ọ na-echetara ha na yanwa ka nọnyeere ha.—Ọma 118:6.
14. Olee ihe ọzọ Jehova mere iji nyere ndị Juu aka ka ha ghara ịtụ ụjọ?
14 Ihe ọzọ Jehova meere ndị Juu ka ha ghara ịtụ ụjọ bụ ichetara ha na ike ya na amamihe ya enweghị atụ. Ọ gwara ndị Juu ka ha lee kpakpando ndị dị n’eluigwe. Ọ gwara ha na ọ bụghị naanị na o kere kpakpando ndị ahụ, kama na ọ ma aha ha niile n’otu n’otu. (Aịza. 40:25-28) Ọ bụrụ na Jehova ma aha kpakpando n’otu n’otu, o doro anya na ọ ma aha ohu ya nke ọ bụla. Ebe ọ bụ na Jehova nwere ike o ji kee kpakpando ndị ahụ, o doro anya na ọ ga-enyeliri ndị ya aka. N’eziokwu, e nweghị ihe kwesịrị ime ka ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha tụọ ụjọ ma ọ bụ chegbuwe onwe ha.
15. Olee otú Jehova si kwadebe ndị Juu a dọọrọ n’agha maka ihe ga-eme n’ọdịnihu?
15 Jehova kwadebekwara ndị ya maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. N’akwụkwọ Aịzaya, Jehova ebula ụzọ gwa ndị ya, sị: “Gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime, mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyechara. Zoonụ nwa mgbe nta, ruo mgbe Chineke wechara iwe.” (Aịza. 26:20) O nwere ike ịbụ na ndị Juu mere ihe a mgbe Eze Saịrọs bịara ịlụso Babịlọn ọgụ. Otu onye Grik na-akọ ihe ndị mere n’oge ochie kwuru na mgbe Saịrọs batara Babịlọn, o “nyere [ndị agha ya] iwu ka ha gbuo ndị niile ha hụrụ n’èzí.” Chegodị otú ụjọ si jide ndị bi na Babịlọn n’oge ahụ. Ma, o nwere ike ịbụ na e gbughị ndị Juu a dọọrọ n’agha n’oge ahụ n’ihi na ha rubeere Jehova isi.
16. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu? (Kọwaakwa foto.)
16 Gịnị ka anyị na-amụta? N’oge na-adịghị anya, oké mkpagbu ga-amalite. Ọ ga-abụkwa oge kacha njọ kemgbe ụwa malitere. Ọ bụrụ na ọ malite, ọtụtụ ndị agaghị ama ihe ha ga-eme eme, ezigbo ụjọ ga-ejidekwa ha. Ma, ọ bụghị otú ọ ga-adị ndị Jehova. Anyị ma na Jehova bụ Chineke anyị. Obi ga-esi anyị ike n’ihi na anyị ma na ‘oge Chineke ga-anapụta anyị eruola nso.’ (Luk 21:28) Ọ bụrụgodị mgbe ọtụtụ mba ga-agbakọ aka ọnụ lụso anyị agha, anyị ga-atụkwasịkwa Jehova obi. Jehova ga-eji ndị mmụọ ozi ya chebe anyị. Ọ ga-enyekwa anyị ntụziaka ga-azọ anyị ndụ. Olee otú ọ ga-esi enye anyị ya? Anyị amabeghị. Ma, o nwere ike ịbụ na anyị ga-esi n’ọgbakọ anyị dị iche iche nweta ya. O nwere ike ịbụ ọgbakọ ndị ahụ ga-abụ ‘ọnụ ụlọ anyị dị n’ime’ ebe a ga-echebe anyị. Olee otú anyị nwere ike isi kwadebe maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu? Anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịna-adị ná mma, anyị adịrị njikere irubere ntụziaka ọ bụla si n’aka nzukọ Jehova isi, obi esiekwa anyị ike na ọ bụ Jehova na-eduzi nzukọ a anyị nọ na ya.—Hib. 10:24, 25; 13:17.
Ọ bụrụ na anyị ana-echeta na Jehova dị ike, nakwa na ọ ga-azọpụtali anyị, anyị agaghị na-echegbu onwe anyị maka ihe ga-eme n’oge oké mkpagbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)b
17. Gịnị ka ị ga-eme ka Jehova kasie gị obi?
17 Ọ bụ eziokwu na ọ dịghịrị ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn mfe, ma Jehova kasiri ha obi. Ọ ga-akasikwa anyị obi. N’ihi ya, n’agbanyeghị ihe echi ga-abụ, akwụsịla ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-akasi gị obi. Ka obi sie gị ike na ọ na-agbaghara ndị ohu ya. Ọ hụkwara gị n’anya. Akwụsịla inwe olileanya. Cheta na ebe ọ bụ na Jehova bụ Chineke gị, e nweghị ihe kwesịrị ime ka ị tụọ ụjọ.
ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
b NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna ole na ole gbakọrọ. Obi siri ha ike na Jehova dị ike nakwa na ọ ga-echebeli ndị ohu ya n’agbanyeghị ebe ha nọ n’ụwa.