ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 24
ABỤ NKE 98 Akwụkwọ Nsọ Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke
Ihe Anyị Ga-amụta n’Okwu Ikpeazụ Jekọb Gwara Ụmụ Ya Mgbe Ọ Nọ n’Ọnụ Ọnwụ—Agba nke 1
“Zukọtanụ ka m gwa unu ihe ga-eme ná ndụ unu n’ọdịnihu.”—JEN. 49:1.
IHE A GA-AMỤ
Ihe anyị ga-amụta n’okwu ikpeazụ Jekọb gwara Ruben, Simiọn, Livaị, na Juda mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ.
1-2. Gịnị ka Jekọb mere mgbe ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ? Gịnịkwa mere o ji mee ya? (Kọwaakwa foto.)
MGBE Jekọb bụ́ ohu Jehova mere agadi, ya na ndị ezinụlọ ya si Kenan gaa Ijipt. Ọ nọkwa ebe ahụ na-efe Jehova ruo afọ iri na asaa. (Jen. 47:28) N’oge ahụ, o nwere ezigbo obi ụtọ n’ihi na ya na nwa ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Josef hụrụ ọzọ nakwa n’ihi na ndị ezinụlọ ya bịara dịrị n’otu ọzọ. Ma ugbu a, Jekọb chọpụtara na ọ gawala ịnwụ. N’ihi ya, ọ kpọkọtara ụmụ ya ka ọ gwa ha ihe dị mkpa.—Jen. 49:28.
2 N’oge ahụ, onyeisi ezinụlọ na-akpọkọtakarị ndị ezinụlọ ya, gwa ha okwu dị mkpa tupu ya anwụọ. (Aịza. 38:1) O nwekwara ike ịnọ n’ụdị nnọkọ ahụ kwuo onye ga-abụzi onyeisi ezinụlọ ahụ ma ọ nwụchaa.
Mgbe Jekọb na-eburu ụmụ ya iri na abụọ amụma n’oge ọ nọ n’ọnụ ọnwụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)
3. Dị ka e kwuru na Jenesis 49:1, 2, gịnị mere ihe Jekọb gwara ụmụ ya ji dị ezigbo mkpa?
3 Gụọ Jenesis 49:1, 2. Mana nnọkọ nke a dị iche. Jekọb bụ onye amụma. Mgbe ya na ụmụ ya nọkọrọ, Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka o kwuo ihe ndị dị mkpa ga-eme n’ọdịnihu ga-agbasa ụmụ ya. N’ihi ya, ihe Jekọb gwara ụmụ ya tupu ya anwụọ bụ amụma.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche ka anyị na-eleba anya n’amụma Jekọb buru mgbe ọ chọrọ ịnwụ? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ezinụlọ Jekọb.”)
4 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe Jekọb gwara ụmụ ya anọ bụ́ Ruben, Simiọn, Livaị, na Juda. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-ahụ ihe Jekọb gwara ụmụ ya asatọ ndị nke ọzọ. Anyị ga-achọpụta na ihe Jekọb kwuru agbasaghị naanị ụmụ ya, kama ọ gbasakwara ụmụ ha ga-amụta, ndị mechara bụrụ mba Izrel oge ochie. Ịtụle ihe ndị mere n’Izrel oge ochie ga-eme ka anyị ghọta otú amụma Jekọb buru si mezuo. Ileba anya n’ihe ndị o kwuru ga-emekwa ka anyị mụta ihe ndị dị mkpa ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe dị Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova mma.
RUBEN
5. Olee ihe ndị ọ ga-abụ na Ruben tụrụ anya inweta n’aka nna ya?
5 Jekọb bu ụzọ kwuo gbasara Ruben. Ọ sịrị ya: “Ọ bụ gị bụ ọkpara m.” (Jen. 49:3) Ebe Ruben bụ ọkpara, ọ ga-abụ na o chere na ihe ọ ga-eketa n’aka nna ya ga-aka nke ụmụnne ya. O nwekwara ike ịbụ na ọ tụrụ anya na ọ bụ ya ga-abụzi onyeisi ezinụlọ nna ya ma nna ya nwụchaa, e mechaakwa, e sizie n’ezinụlọ ya na-enweta onye ga na-edu ndị Izrel.
6. Gịnị mere na Ruben enwetaghị ihe ọkpara kwesịrị inweta? (Jenesis 49:3, 4)
6 Ma, Ruben enwetaghị ihe ọkpara kwesịrị inweta. (1 Ihe 5:1) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na afọ ụfọdụ tupu mgbe ahụ, ya na iko nwaanyị Jekọb aha ya bụ Bilha kwara iko. Bilha bụ nwaanyị na-ejere nwunye Jekọb ọ hụrụ n’anya bụ́ Rechel ozi. Rechel anwụọkwalanụ. (Jen. 35:19, 22) Ruben bụ nwa nwunye Jekọb ọzọ aha ya bụ Lia. O nwere ike ịbụ na Ruben nwewere mmasị n’ebe Bilha nọ, mana o jidelighị onwe ya, ya na ya agazie kwaa iko, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ihe mere o ji gaa ka ya na ya kwaa iko bụ na ọ chọghị ka papa ya hụ nwaanyị ahụ n’anya karịa otú ọ hụrụ mama ya. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe ahụ o mere dị ezigbo njọ n’anya Jehova nakwa n’anya nna ya.—Gụọ Jenesis 49:3, 4.
7. Gịnị mere Ruben na ndị si n’agbụrụ ya? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Amụma Jekọb Buru Mgbe Ọ Nọ n’Ọnụ Ọnwụ.”)
7 Jekọb gwara Ruben, sị: “Ị gaghị akarị ụmụnne gị.” Ihe ahụ ọ gwara ya mezuru. E nweghị ihe ọ bụla e dere na Baịbụl gosiri na e nwere onye ọ bụla si n’agbụrụ Ruben ghọrọ eze, onye nchụàjà, ma ọ bụkwanụ onye amụma. N’agbanyeghị ya, Jekọb ajụghị nwa ya bụ́ Ruben. Ụmụ Ruben ghọkwara ebo n’Izrel. (Josh. 12:6) E nwere oge ndị ọzọ Ruben kpara àgwà ọma. E nweghịkwa mgbe ọzọ Baịbụl kwuru na ọ kwara iko.—Jen. 37:20-22; 42:37.
8. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere Ruben?
8 Gịnị ka anyị na-amụta? Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị na-ejide onwe anyị, kpebisiekwa ike na anyị agaghị eme omume rụrụ arụ. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị ime ihe ọjọọ, anyị kwesịrị ịkwụsịtụ ma chee gbasara otú ime ihe ahụ ga-esi ewute Jehova, ndị ezinụlọ anyị, nakwa ndị ọzọ. Anyị kwesịkwara icheta na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ.” (Gal. 6:7) Ihe ọzọ bụ na ihe mere Ruben na-echetara anyị na Jehova na-eme ebere. Ọ bụ eziokwu na Jehova agaghị egbochi anyị ịta ahụhụ mmehie anyị mere kpataara anyị, ma ọ ga-agọzi mbọ anyị na-agba ime ihe dị mma.
SIMIỌN NA LIVAỊ
9. Gịnị mere obi adịghị Jekọb mma n’ebe Simiọn na Livaị nọ? (Jenesis 49:5-7)
9 Gụọ Jenesis 49:5-7. Jekọb gwaziri Simiọn na Livaị okwu. Ma ihe o kwuru gosiri na obi adịghị ya mma n’ebe ha nọ. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, otu onye Kenan aha ya bụ Shikem dinara ada Jekọb bụ́ Daịna n’ike. Ihe a kpasuru ụmụ Jekọb ndị nwoke niile iwe. Ma, Simiọn na Livaị ejidelighị onwe ha. Ha ji aghụghọ kwe ndị obodo Shikem nkwa na ha na ha ga-eme udo ma ọ bụrụ na ha niile ekweta ibi úgwù. Ụmụ nwoke ndị ahụ kwetara. Mgbe úgwù ahụ ha biri ka na-afụ ha ụfụ, Simiọn na Livaị “weere mma agha ha banye n’obodo ahụ otú a na-enweghị onye ga-amata ihe ha bu n’obi. Ha wee gbuo ụmụ nwoke obodo ahụ niile.”—Jen. 34:25-29.
10. Olee otú amụma Jekọb buru gbasara Simiọn na Livaị si mezuo? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Amụma Jekọb Buru Mgbe Ọ Nọ n’Ọnụ Ọnwụ.”)
10 Ezigbo iwe were Jekọb maka na ụmụ ya abụọ gburu ndị obodo ahụ. O buru amụma na ha ga-agbasa n’ebe niile n’Izrel. Amụma ahụ mezuru mgbe ihe karịrị narị afọ abụọ (200) gachara mgbe ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ. Ebo Simiọn ketara ala ụfọdụ n’ala ndị ebo Juda. (Josh. 19:1) Ndị ebo Livaị ketara obodo iri anọ na asatọ dị n’ebe dị iche iche n’Izrel.—Josh. 21:41.
11. Olee ihe ọma ndị ebo Simiọn na ndị ebo Livaị mere?
11 Ndị si n’ebo Simiọn na Livaị emeghị ihe ọjọọ ndị nna nna ha mere. Ọtụtụ ndị Livaị ji obi ha niile fee Jehova. Mgbe Mosis gara ịnata Iwu Jehova n’Ugwu Saịnaị, ọtụtụ ndị Izrel fere chi nwa ehi. Ma, ndị Livaị dụnyeere Mosis úkwù ma nyere ya aka bibie ndị so fee chi ahụ. (Ọpụ. 32:26-29) Jehova họọrọ ndị si n’ebo Livaị ka ha bụrụ ndị nchụàjà n’Izrel. (Ọpụ. 40:12-15; Ọnụ Ọgụ. 3:11, 12) Mgbe ndị Izrel nọ na-alụso ndị bi n’Ala Nkwa ahụ agha, ndị ebo Simiọn so ndị Juda lụọ agha, ha emerie ndị iro ha.—Ikpe 1:3, 17.
12. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Simiọn na Livaị mere?
12 Gịnị ka anyị na-amụta? Ekwela ka iwe mee ka i mee mkpebi na-adịghị mma ma mee ihe na-adịghị mma. Ọ bụrụ na e megburu gị ma ọ bụ onye gị na ya dị ná mma, o doro anya na iwe ga-ewe gị. (Ọma 4:4) Ma, anyị kwesịrị icheta na obi agaghị adị Jehova mma ma anyị kwuo ma ọ bụ mee ihe gosiri na anyị ejidelighị onwe anyị. (Jems 1:20) Mmadụ megbuo anyị n’ọgbakọ ma ọ bụ n’èzí, anyị kwesịrị ime ihe dị Jehova mma, si otú ahụ ghara ikwu ma ọ bụ ime ihe ga-akpatara ndị ọzọ nsogbu. (Rom 12:17, 19; 1 Pita 3:9) Ọ bụrụgodị na ndị mụrụ gị na-eme ihe na-adịghị Jehova mma, cheta na ọ bụghị iwu na ị ga-eme ka ha. Echekwala na nke gị agwụla nakwa na Jehova agaghị agọzili gị. Jehova ga-enyere gị aka ime ihe dị mma ma kwụọ gị ụgwọ ma i mee otú ahụ.
JUDA
13. Gịnị nwere ike ime ka obi na-akụ Juda kpum kpum mgbe o ruru ka papa ya gwa ya okwu?
13 Onye ọzọ Jekọb gwara okwu bụ Juda. Mgbe Juda nụchara ihe Jekọb gwara ụmụnne ya ndị tọrọ ya, o nwere ike ịbụ na obi nọ na-akụ ya kpum kpum maka na e nweela ihe ndị dị ezigbo njọ o mere. O so gaa kwakọrọ ihe ndị obodo Shikem. (Jen. 34:27) O so ụmụnne ya ree Josef ka ọ gaa gbawa ohu, ghọgbuokwa papa ha gbasara ya. (Jen. 37:31-33) O mechakwara ya na nwunye nwa ya aha ya bụ Tema enwee mmekọahụ maka na o chere na ọ bụ akwụna.—Jen. 38:15-18.
14. Olee ihe ọma ndị Juda mere? (Jenesis 49:8, 9)
14 Ma, Jehova mere ka Jekọb gọzie Juda naanị ngọzi, jaakwa ya mma. (Gụọ Jenesis 49:8, 9.) Juda gosiri na ihe banyere nna ya mere agadi na-emetụ ya n’obi nke ukwuu. O metakwaara nwanne ha nke obere bụ́ Benjamin ebere.—Jen. 44:18, 30-34.
15. Olee otú ngọzi a gọziri Juda si mezuo?
15 Jekọb kwuru na Juda ga-abụ onyeisi ụmụnne ya. Ma, ihe dị ka narị afọ abụọ (200) ga-agafe tupu amụma a emezuo. Mgbe ndị Izrel pụtara n’Ijipt, si n’ala ịkpa gawa n’Ala Nkwa, ọ bụ ebo Juda butere ụzọ, ndị nke ọzọ ana-eso ha n’azụ. (Ọnụ Ọgụ. 10:14) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Juda butere ụzọ n’imeri ndị bi n’Ala Nkwa ahụ. (Ikpe 1:1, 2) Devid, onye sikwa n’agbụrụ Juda, bụ onye nke mbụ n’ime ndị eze si n’agbụrụ ahụ. Ma, a ka nwere ihe ndị ọzọ.
16. Olee otú amụma e buru na Jenesis 49:10 si mezuo? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Amụma Jekọb Buru Mgbe Ọ Nọ n’Ọnụ Ọnwụ.”)
16 Jekọb kwukwara na Onye ga-achị mmadụ niile ruo mgbe ebighị ebi ga-esi n’agbụrụ Juda. (Gụọ Jenesis 49:10 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Onye Ọchịchị ahụ bụ Jizọs Kraịst, onye Jekọb kpọrọ Shaịlo. Otu mmụọ ozi kwukwara gbasara Jizọs, sị: “Jehova bụ́ Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya bụ́ Devid.” (Luk 1:32, 33) A kpọkwara Jizọs “Ọdụm nke si n’ebo Juda.”—Mkpu. 5:5.
17. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova n’otú anyị si ele ndị ọzọ anya?
17 Gịnị ka anyị na-amụta? Jehova gọziri Juda n’agbanyeghị na e nwere ihe ndị dị ezigbo njọ o mere. Ma, ọ̀ ga-abụ na ụmụnne Juda nọ na-eche ihe Jehova hụrụ n’ime ya? N’agbanyeghị na anyị amaghị, Jehova hụrụ ihe dị mma n’ime Juda ma gọzie ya maka ya. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova? Ọ bụrụ na e nye nwanna anyị ọrụ pụrụ iche, ihe mbụ anyị nwere ike ịchọ ime bụ ilekwasị anya n’ihe ndị nwanna ahụ na-anaghị emeta. Ma, anyị kwesịrị ịgbalị cheta na àgwà ọma nwanna ahụ masịrị Jehova. Jehova na-achọ ịhụ àgwà ọma ndị ohu ya na-akpa. Ka anyịnwa gbalịakwa na-eme otú ahụ.
18. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enwe ndidi?
18 Ihe ọzọ anyị na-amụta n’akụkọ Juda bụ na anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi. Jehova na-emezu nkwa ya mgbe niile. Mana, ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-eme ya otú anyị si chọọ ma ọ bụ n’oge anyị tụrụ anya ya. Ndị si n’agbụrụ Juda amaliteghị ịbụ ndị isi ụmụnne ha ozugbo. Ma, ha ji obi ha niile kwado ndị Jehova họpụtara ka ha na-edu ndị ya, ma ọ̀ bụ Mosis onye si n’agbụrụ Livaị, ma ọ bụ Joshụa onye si n’ebo Ifrem, ma ọ bụkwanụ Eze Sọl onye si n’ebo Benjamin. Ka anyịnwa na-akwadokwa onye ọ bụla Jehova họọrọ ịna-eduzi ndị ya taa.—Hib. 6:12.
19. Gịnị ka ị mụtara gbasara Jehova n’amụma ndị Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ?
19 Gịnị ka anyị chọpụtarala n’amụma ndị Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ? O doro anya na “ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ.” (1 Sam. 16:7) Jehova na-enwe ezigbo ndidi ma na-agbaghara. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova anaghị akwado ihe ọjọọ. Ma ọ naghị atụ anya ka ndị na-efe ya zuo okè. O nwedịrị ike ịgọzi ndị mere mmehie dị oké njọ n’oge gara aga ma ọ bụrụ na ha ejiri obi ha niile chegharịa ma na-eme ihe dị mma. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe Jekọb gwara ụmụ ya asatọ ndị fọrọ afọ.
ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya