ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 25
ABỤ NKE 96 Okwu Chineke Bụ Akụ̀
Ihe Anyị Ga-amụta n’Okwu Ikpeazụ Jekọb Gwara Ụmụ Ya Mgbe Ọ Nọ n’Ọnụ Ọnwụ—Agba nke 2
“Ọ gọziri onye nke ọ bụla n’ime ha otú kwesịrị ekwesị.”—JEN. 49:28.
IHE A GA-AMỤ
Ihe anyị ga-amụta n’ihe Jekọb gwara ụmụ ya asatọ mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ.
1. Olee ihe Jekọb kwuru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?
ỤMỤ Jekọb gbakọtara n’ebe ọ nọ, na-ege ntị nke ọma ka nna ha na-agọzi onye nke ọ bụla. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ihe Jekọb gwara Ruben, Simiọn, Livaị, na Juda nwere ike ịbụ ihe ụmụ ya na-atụghị anya ya. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ha nọ na-eche ihe Jekọb ga-agwa ụmụ ya asatọ fọrọ afọ. Ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’ihe ọ gwara Zebulọn, Ịsaka, Dan, Gad, Asha, Naftalaị, Josef, na Benjamin.a
ZEBULỌN
2. Gịnị ka Jekọb gwara Zebulọn? Oleekwa otú o si mezuo? (Jenesis 49:13) (Kwuokwa ihe dị n’igbe.)
2 Gụọ Jenesis 49:13. Jekọb kwuru na ụmụ Zebulọn ga-ebi n’akụkụ oké osimiri n’ebe ugwu Ala Nkwa ahụ. Mgbe ihe karịrị narị afọ abụọ (200) gachara, ndị si n’ebo Zebulọn ketara ala dị n’agbata Oké Osimiri Galili na Oké Osimiri Mediterenian. Mosis buru amụma, sị: “Zebulọn, ṅụrịa ọṅụ n’ahịa ị na-azụ.” (Diut. 33:18) O nwere ike ịbụ na ihe a pụtara na ọ ga-adịrị ndị si n’ebo Zebulọn mfe ịna-agaru n’akụkụ osimiri abụọ ahụ. N’ihi ya, ọ ga-adịrị ha mfe ịzụta ihe n’aka ndị si ebe dị iche iche nakwa iresị ha ihe. Nke ọ bụla ọ bụ, e nwere ihe mere obi ji kwesị ịdị ndị ebo Zebulọn ụtọ.
3. Gịnị ga-enyere anyị aka ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ?
3 Gịnị ka anyị na-amụta? E nwere ihe mere anyị kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ mgbe niile n’agbanyeghị ebe anyị bi ma ọ bụkwanụ otú ihe si dịrị anyị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe obi ụtọ mgbe niile, ihe ndị anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ. (Ọma 16:6; 24:5) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdịrị anyị mfe ịna-eche banyere ihe ndị anyị na-enweghị kama iche banyere ihe ọma ndị na-emere anyị. N’ihi ya, gbalịa na-ahụ ihe ọma ndị i nwere, na-ejikwa ha na-eme onwe gị obi ụtọ.—Gal. 6:4.
ỊSAKA
4. Gịnị ka Jekọb gwara Ịsaka? Oleekwa otú o si mezuo? (Jenesis 49:14, 15) (Kwuokwa ihe dị n’igbe.)
4 Gụọ Jenesis 49:14, 15. Jekọb jara Ịsaka mma maka na ọ na-arụsi ọrụ ike. O ji ya tụnyere jakị ọkpụkpụ ya siri ike. Jakị bụ anụmanụ na-ebu ibu dị arọ. Jekọb kwukwara na Ịsaka ga-enweta ala mara mma. Ihe a Jekọb kwuru mezuru n’ihi na ndị si n’ebo Ịsaka ketara ala ha n’akụkụ Osimiri Jọdan. Ebe ahụ na-emekwa nri nke ọma. (Josh. 19:22) O doro anya na ha rụsiri ọrụ ike na-elekọta ala ha. Ma, ha rụsikwara ọrụ ike inyere ndị ọzọ aka. (1 Eze 4:7, 17) Dị ka ihe atụ, ndị ebo Ịsaka dị njikere iso lụọ agha ndị a na-alụ n’Izrel. Ihe a mere n’oge onyeikpe bụ́ Berak na Debora onye amụma nwaanyị.—Ikpe 5:15.
5. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-arụsi ọrụ ike?
5 Gịnị ka anyị na-amụta? Jehova ji ọrụ anyị na-arụsi ike n’ozi ya kpọrọ ezigbo ihe otú ahụ o ji ọrụ ndị ebo Ịsaka rụsiri ike kpọrọ ihe. (Ekli. 2:24) Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ọrụ ụmụnna nwoke na-arụsi ike n’ilekọta ọgbakọ. (1 Tim. 3:1) Ụmụnna ndị a anaghị alụ agha nkịtị, mana ha na-agbasi mbọ ike ichebe ndị Chineke ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma ha na Chineke. (1 Kọr. 5:1, 5; Jud 17-23) Ha na-arụsikwa ọrụ ike ịkwadebe okwu ndị ha ga-ekwu nakwa ikwu ha ka ha nwee ike ịgba ụmụnna nọ n’ọgbakọ ume.—1 Tim. 5:17.
DAN
6. Olee ọrụ e nyere ndị ebo Dan? (Jenesis 49:17, 18) (Kwuokwa ihe dị n’igbe.)
6 Gụọ Jenesis 49:17, 18. Jekọb ji Dan tụnyere agwọ na-ata ihe ka ya ibu, dị ka ịnyịnya e ji alụ agha na onye na-agba ya. Dan ga-emesi ndị iro ndị Izrel ike. Mgbe ndị Izrel ji ụkwụ na-abanye n’Ala Nkwa ahụ, ndị ebo Dan chebere ha. Ha nọ “n’azụ na-eche ndị Izrel niile nche.” (Ọnụ Ọgụ. 10:25) Ọrụ a dị ezigbo mkpa, ọ bụ eziokwu na ndị Izrel niile anaghị ahụ ihe niile ndị Dan nọ na-eme n’azụ ha.
7. Olee otú anyị kwesịrị isi ele ọrụ ndị e nyere anyị ná nzukọ Jehova anya?
7 Gịnị ka anyị na-amụta? Ị̀ rụtụla ọrụ ndị mmadụ na-ahụghị ka ị na-arụ ya? O nwere ike ịbụ na i nyela aka dowe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma ọ bụ rụzie ihe ndị mebiri na ya, ma ọ bụkwanụ na i wepụtara onwe gị rụọ ọrụ ná mgbakọ ma ọ bụ rụọ ọrụ ndị ọzọ. Ọ bụrụ otú ahụ, e kwesịrị ịja gị mma. Na-echeta mgbe niile na Jehova na-ahụ ihe niile ị na-emere ya. O jikwa ha kpọrọ ihe. Obi na-aka atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na ihe i bu n’obi na-ejere ya ozi bụ ka i gosi ya na i ji obi gị niile hụ ya n’anya, ọ bụghị ka ndị ọzọ hụ gị ma too gị maka ihe ndị ị na-eme.—Mat. 6:1-4.
GAD
8. Olee ihe mere o ji dị mfe ndị iro ịlụso ndị ebo Gad agha? (Jenesis 49:19) (Kwuokwa ihe dị n’igbe.)
8 Gụọ Jenesis 49:19. Jekọb buru amụma na ìgwè ọlụọ ọgbalaga ga-alụso Gad agha. Mgbe ihe karịrị narị afọ abụọ (200) gachara, ndị Gad bịara biri n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. Ha na ndị iro ha gbara agbata obi n’ebe ahụ. Ebe a ha bi mere ka ọ dịrị ndị iro ha mfe ịlụso ha ọgụ. N’agbanyeghị ya, ndị Gad chọrọ ibi ebe ahụ n’ihi na ọ ga-eme ka ha na-enweta ahịhịa ga-ezuru anụ ụlọ ha. (Ọnụ Ọgụ. 32:1, 5) O doro anya na ndị Gad nwere obi ike. Mana, ihe ka mkpa bụ na ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enyere ha aka ha echebe ala o nyere ha ka ìgwè ọlụọ ọgbalaga ghara ịnara ha ya. O nwedịrị mgbe ha zigara ndị agha ha ka ha soro ndị Izrel lụọ agha ruo ọtụtụ afọ ka ha merie ndị iro ha nọ n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan. (Ọnụ Ọgụ. 32:16-19) Ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-echebe ndị nwunye ha na ụmụ ha mgbe ndị agha ahụ gawara agha. Jehova gọziri ha maka otú ha si kata obi nakwa otú ha si achọ inyere ndị ọzọ aka mgbe ọ na-adịghịrị ha mfe.—Josh. 22:1-4.
9. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, olee ihe ndị anyị ga na-eme?
9 Gịnị ka anyị na-amụta? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-efe Jehova mgbe ihe siiri anyị ike, anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi. (Ọma 37:3) Ọtụtụ ndị taa ahapụla ọtụtụ ihe ka ha soro na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, ma ọ bụkwanụ na-arụ ọrụ ndị ọzọ iji gosi na ha tụkwasịrị Jehova obi. Ha na-eme ihe ndị a n’ihi na obi siri ha ike na Jehova ga-elekọta ha mgbe niile.—Ọma 23:1.
ASHA
10. Gịnị ka ndị ebo Asha na-emeghị? (Jenesis 49:20) (Kwuokwa ihe dị n’igbe.)
10 Gụọ Jenesis 49:20. Jekọb buru amụma na ihe ga-agaziri ndị ebo Asha. Ọ bụkwa ihe merenụ. Ala ebo Asha ketara so n’ala ndị kacha eme nri nke ọma n’ala ndị Izrel niile. (Diut. 33:24) Ebe ahụ dị n’akụkụ Oké Osimiri Mediterenian. Ebe sokwa na ya bụ ọdụ ụgbọ mmiri Saịdọn na-ekwo ekwo nke ndị Finishia. Ma ndị Asha achụpụlighị ndị Kenan bi n’ala ahụ. (Ikpe 1:31, 32) Ọ ga-abụ na otú ihe si na-agaziri ndị ebo Asha na àgwà ọjọọ ndị Kenan na-akpa mere ka ha ghara ijicha ofufe Jehova kpọrọ ihe. Ndị ebo Asha ekweghị abịa enyere onyeikpe bụ́ Berak aka mgbe ọ nọ na-achọ ndị ga-enyere ya aka ịlụso ndị Kenan agha. Ihe a mere ka ndị ebo ahụ ghara iso hụ ihe dị ịtụnanya Jehova mere iji nyere ndị Izrel aka imeri “n’akụkụ mmiri Megido.” (Ikpe 5:19-21) Ọ ga-abụ na ihere mere ndị ebo Asha mgbe ha nụrụ ka Berak na Debora bụrụ abụ, sị: “Asha nọ nkịtị n’ụsọ oké osimiri.”—Ikpe 5:17.
11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ele ego anya otú kwesịrị ekwesị?
11 Gịnị ka anyị na-amụta? Anyị kwesịrị inye Jehova ihe kacha mma anyị nwere. Iji mee ya, anyị ekwesịghị ịna-ele akụnụba anya otú ụwa si ele ya anya. (Ilu 18:11) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-ele ego anya otú kwesịrị ekwesị. (Ekli. 7:12; Hib. 13:5) Anyị ekwesịghị ikwe ka ịchụ ihe ndị na-adịghị mkpa mee ka anyị ghara ijere Jehova ozi. Kama, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike iji oge anyị na ike anyị ugbu a na-ejere Jehova ozi, obi esie anyị ike na Jehova ga-eme ka ihe dịrị anyị mma n’ụwa ọhụrụ.—Ọma 4:8.
NAFTALAỊ
12. Olee otú ọ ga-abụ na ngọzi a gọziri Naftalaị si mezuo? (Jenesis 49:21) (Kwuokwa ihe dị n’igbe.)
12 Gụọ Jenesis 49:21. “Okwu na-atọ ụtọ” Jekọb kwuru okwu ya nwere ike ịbụ otú Jizọs si kwuo okwu mgbe o jere ozi n’ụwa. A ma Jizọs ama maka otú o si kụzie ihe nke ọma. O ji Kapaniọm nke dị n’ebo Naftalaị mere “obodo ya.” (Mat. 4:13; 9:1; Jọn 7:46) Aịzaya bukwara amụma na Jizọs ga-abụrụ ndị Zebulọn na ndị Naftalaị “ezigbo ìhè.” (Aịza. 9:1, 2) Jizọs si n’otú o si kụzie ihe bụrụ “ìhè ahụ nke na-enye ụdị mmadụ ọ bụla ìhè.”—Jọn 1:9.
13. Gịnị ka anyị ga-eme ka ihe anyị na-ekwu na-atọ Jehova ụtọ?
13 Gịnị ka anyị na-amụta? Jehova ejighị ihe anyị na-ekwu na otú anyị si ekwu ya egwu egwu. Olee otú anyị nwere ike isi kwuo “okwu na-atọ ụtọ” ga-adị Jehova mma? Nke mbụ, anyị ga na-ekwu eziokwu. (Ọma 15:1, 2) Ihe ọzọ anyị ga-eme bụ ịgba ndị ọzọ ume. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịna-aja ha mma ma ha mee ihe dị mma, na-agbalịkwa ka anyị ghara ịna-akatọ ndị ọzọ ma ọ bụ ịna-eme mkpesa. (Efe. 4:29) Anyị nwekwara ike ịgba mbọ mụtakwuo otú anyị ga-esi na-amalite mkparịta ụka ga-eme ka anyị zie mmadụ ozi ọma.
JOSEF
14. Kọwaa otú ngọzi a gọziri Josef si mezuo. (Jenesis 49:22, 26) (Kwuokwa ihe dị n’igbe.)
14 Gụọ Jenesis 49:22, 26. O doro anya na Jekọb ejighị Josef egwu egwu. Jehova ‘họpụtara ya n’ime ụmụnne ya.’ Jekọb kpọrọ ya “alaka nke osisi na-amị mkpụrụ.” Ọ bụ Jekọb bụ osisi ahụ, Josef abụrụ alaka ya. Josef bụ nwa mbụ nwunye Jekọb ọ hụrụ n’anya bụ́ Rechel mụrụ. Jekọb gosiri na Josef ga-eketa ihe karịrị ihe ụmụnne ya ketara, nke Ruben bụ́ nwa mbụ ya Lia mụrụ gaara eketa. (Jen. 48:5, 6; 1 Ihe 5:1, 2) Amụma a mezuru mgbe ụmụ Josef abụọ bụ́ Ifrem na Manase ketara ala ka ebo abụọ dị iche iche.—Jen. 49:25; Josh. 14:4.
15. Gịnị ka Josef mere mgbe ụmụnne ya mere ya ihe ọjọọ?
15 Jekọb kwukwara na ndị na-agba ụta ‘gbara Josef ụta, kpọọkwa ya asị.’ (Jen. 49:23) Ndị ọ na-ekwu gbasara ha bụ ụmụnne ya, ndị nọbu na-enwere ya anyaụfụ. Ha mere ya ọtụtụ ihe ọjọọ, meekwa ka ọ taa ọtụtụ ahụhụ. N’agbanyeghị ya, Josef ewesaghị ụmụnne ya iwe ma ọ bụ wesawa Jehova iwe. Jekọb sịrị: ‘Josef amịpụtaghị ụta ya, aka ya sikwara ike ma dị garagara.’ (Jen. 49:24) Josef tụkwasịrị Jehova obi mgbe ọnwụnwa bịaara ya. Ọ gbaghaara ụmụnne ya, jirikwa obiọma meso ha. (Jen. 47:11, 12) Josef kwere ka ọnwụnwa bịaara ya mee ka ọ bụrụ ezigbo mmadụ. (Ọma 105:17-19) Ihe a mere ka Jehova jiri ya mee ihe ndị dị ịtụnanya.
16. Olee otú anyị nwere ike isi eme ka Josef ma ọnwụnwa bịara anyị?
16 Gịnị ka anyị na-amụta? Anyị ekwesịghị ikwe ka ọnwụnwa mee ka anyị ghara ịnọ Jehova ma ọ bụ ụmụnna anyị nso. Cheta na Jehova nwere ike ikwe ka ọnwụnwa bịara anyị ka e jiri ya zụọ anyị. (Hib. 12:7 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Ọzụzụ ahụ nwere ike inyere anyị aka ịmụta àgwà Ndị Kraịst, dị ka ebere na mgbaghara, na ịna-akpakwu ha nke ọma. (Hib. 12:11) Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ maka ntachi obi anyị otú ọ kwụrụ Josef.
BENJAMIN
17. Olee otú amụma Baịbụl buru gbasara Benjamin si mezuo? (Jenesis 49:27) (Kwuokwa ihe dị n’igbe.)
17 Gụọ Jenesis 49:27. Jekọb buru amụma na ebo Benjamin ga-adị ka anụ ọhịa wolf, bụrụkwa dike n’agha. (Ikpe 20:15, 16; 1 Ihe 12:2) Ọ bụ “n’ụtụtụ,” ya bụ, mgbe a malitere inwe eze n’Izrel, ka e si n’ebo Benjamin họta Sọl, bụ́ eze mbụ chịrị Izrel. O ji obi ike lụso ndị Filistia agha. (1 Sam. 9:15-17, 21) N’akụkọ ndị Izrel, ọ bụ “ná mgbede” ka Esta bụ́ nwunye eze na Mọdekaị bụ́ osote eze, ndị si n’ebo Benjamin, zọpụtara ndị Izrel ka a ghara igbu ha mgbe ndị Peshia na-achị.—Esta 2:5-7; 8:3; 10:3.
18. Olee otú anyị nwere ike isi eme ka ndị ebo Benjamin n’ihe gbasara iji obi anyị niile na-akwado Jehova?
18 Gịnị ka anyị na-amụta? O doro anya na obi tọgburu ndị ebo Benjamin atọgbu mgbe ha hụrụ ka onye nke ha ghọrọ eze iji mezuo amụma Jekọb buru. Ma, mgbe Jehova mere ka ọ bụrụ Devid, onye si n’ebo Juda, bụzi eze, ndị ebo Benjamin mechara kwado mgbanwe ahụ. (2 Sam. 3:17-19) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, mgbe ebo ndị ọzọ nupụrụ isi, ndị ebo Benjamin ekweghị ahapụ ndị ebo Juda na eze Jehova họpụtara. (1 Eze 11:31, 32; 12:19, 21) Ka anyị jiri obi anyị niile na-akwado ndị Jehova họpụtara iduzi ndị ya taa otú ahụ ndị ebo Benjamin mere.—1 Tesa. 5:12.
19. Olee otú amụma ndị Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ ga-esi baara anyị uru?
19 Amụma ndị Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ ga-abara anyị uru. Ịmụ otú ha si mezuo na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike na amụma ndị dị n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl bụ eziokwu nakwa na ha ga-emezu. Anyị leekwa otú Jekọb si gọzie ụmụ ya, ọ ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe ndị anyị ga-eme iji mee Jehova obi ụtọ.
ABỤ NKE 128 Ka Anyị Tachie Obi Ruo Ọgwụgwụ
a Mgbe Jekọb gọzichara Ruben, Simiọn, Livaị, na Juda, malite n’onye kacha okenye ruo n’onye kacha obere, ọ gọzighị ụmụ ya ndị nke ọzọ n’otú ha si tọọ ibe ha.