Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Julaị p. 20-25
  • Ị̀ Mụtala Otú Ihe I Nwere Ga-esi Na-eju Gị Afọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Mụtala Otú Ihe I Nwere Ga-esi Na-eju Gị Afọ?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTA INWE OBI ỤTỌ MAKA IHE ỌMA E MEERE GỊ
  • DỊRỊ UMEALA N’OBI
  • NA-ECHE GBASARA OLILEANYA I NWERE
  • “E NWEGHỊ IHE NA-AKỌ NDỊ NA-ATỤ EGWU YA”
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Na-echeta na Jehova Bụ “Chineke Dị Ndụ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Ị̀ Na-achọpụtali nke Bụ́ Eziokwu?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Julaị p. 20-25

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 31

ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

Ị̀ Mụtala Otú Ihe I Nwere Ga-esi Na-eju Gị Afọ?

“Amụtala m otú ihe m nwere ga-esi na-eju m afọ n’agbanyeghị otú ihe si dịrị m.”​—FIL. 4:11.

IHE A GA-AMỤ

Ihe i nwere ga-eju gị afọ ma ị na-ekele ndị meere gị ihe ọma, dịrị umeala n’obi, ma na-eche gbasara nkwa ndị Jehova kwere maka ọdịnihu.

1. Gịnị ka ihe mmadụ nwere iju ya afọ pụtara? Gịnị ka ọ na-apụtaghị?

IHE i nwere ọ̀ na-eju gị afọ? Onye ihe o nwere na-eju afọ na-enwe obi ụtọ, obi na-erukwa ya ala maka na ọ na-elekwasị anya n’ihe ndị Jehova nyere ya. Obi anaghị ajọ ya njọ ma ọ bụkwanụ iwe ana-ewe ya maka ihe ndị ọ na-enweghị. Ma, ihe mmadụ nwere iju ya afọ apụtaghị na ọ gaghị na-eche gbasara otú o si ebi ndụ ya. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị njọ ma ọ bụrụ na Onye Kraịst ana-agba mbọ ịrụkwu ọrụ n’ozi Jehova. (Rom 12:1; 1 Tim. 3:1) N’agbanyeghị ya, obi anaghị ajọ ya njọ ma ọ bụrụ na e nyeghị ya ọrụ ọ tụrụ anya ka e nye ya ozugbo otú ọ tụrụ anya ya.

2. Gịnị mere ihe mmadụ nwere ejughị ya afọ ji dị njọ?

2 Ọ bụrụ na ihe mmadụ nwere ejughị ya afọ, o nwere ike ịkpatara ya nsogbu. Ndị ihe ha nwere na-anaghị eju afọ nwere ike iji oge karịrị akarị na-arụ ọrụ ka ha nweta ihe ndị na-adịchaghị ha mkpa. Ọ dị mwute na ụfọdụ Ndị Kraịst ezurula ego na ihe ndị ọzọ gụrụ ha agụụ. Ọ ga-abụ na ha gwara onwe ha, sị: ‘M kwesịrị inweta ihe a,’ ‘O teela m chọwara inweta ihe a,’ ma ọ bụkwanụ ‘M ga-akwụghachi ego a ma e mechaa.’ Nke ọ bụla ọ bụ, izu ụdị ohi ọ bụla na-ewe Jehova iwe, na-emebikwa aha ya. (Ilu 30:9) O nwekwara ndị o wutere na e nyeghị ha ọrụ n’ọgbakọ nke na ha kwụsịrị ife Jehova kpamkpam. (Gal. 6:9) Olee otú ohu Jehova nyefere ya onwe ya ga-esi cheedị echiche ime ụdị ihe a? Ọ ga-abụ na ihe o nwere ejughịzi ya afọ.

3. Olee eziokwu anyị mụtara ná Ndị Filipaị 4:11, 12 na-eme ka obi sie anyị ike?

3 Anyị niile nwere ike ịmụta otú ihe anyị nwere ga-esi na-eju anyị afọ. Pọl onyeozi dere na ya ‘amụtala otú ihe o nwere ga-esi na-eju ya afọ n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ya.’ (Gụọ Ndị Filipaị 4:11, 12.) O dere ihe ahụ mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. N’agbanyeghị ya, ọ kwụsịghị ịna-enwe ọṅụ. Ọ mụtara ihe naanị mmadụ ole na ole mụtara, ya bụ, otú ihe o nwere ga-esi na-eju ya afọ. Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ihe anyị nwere iju anyị afọ, ihe Pọl kwuru na ihe ndị o mere ga-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-amụtali ya. Anyị ekwesịghị ịtụwa anya na ọ ga-adị mfe ihe anyị nwere iju anyị afọ mgbe niile. Ma, anyị kwesịrị ịmụta otú ihe anyị nwere ga-esi na-eju anyị afọ. Olee otú anyị ga-esi amụta ya? Ka anyị tụlee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịmụta ihe anyị nwere iju anyị afọ.

MỤTA INWE OBI ỤTỌ MAKA IHE ỌMA E MEERE GỊ

4. Olee otú obi ịdị anyị ụtọ maka ihe e meere anyị si eme ka ihe anyị nwere ju anyị afọ? (1 Ndị Tesalonaịka 5:18)

4 Ị chọọ ka ihe i nwere na-eju gị afọ, na-enwe obi ụtọ maka ihe ọma e meere gị. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:18.) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ihe ndị dị anyị mkpa ná ndụ, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe ndị anyị chọrọ anyị na-enweghị. Ọ bụrụ na obi na-adị anyị ụtọ maka ọrụ ndị e nyere anyị n’ọgbakọ ugbu a, anyị ga-elekwasị anya n’iji ike anyị niile na-arụ ha kama ịna-atụ anya mgbe niile ka anyị nweta nke ọhụrụ. Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji gwa anyị ka anyị na-ekele Jehova n’ekpere anyị. Ọ bụrụ na obi adị anyị ụtọ maka ihe e meere anyị, ọ ga-enyere anyị aka inweta “udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ.”​—Fil. 4:6, 7.

5. Olee ihe ndị Izrel kwesịrị icheta, ya emee ha obi ụtọ? (Kọwaakwa foto.)

5 Ka anyị lee ihe mere ndị Izrel. Ha tamuru ntamu ọtụtụ ugboro na ha enweghị nri ndị ha nọbu na-eri n’Ijipt. (Ọnụ Ọgụ. 11:4-6) Nke bụ́ eziokwu bụ na ibi n’ala ịkpa adịghị mfe. Gịnị gaara enyere ha aka ka ihe ha nwere ju ha afọ? Ha gaara echebara ihe ndị Chineke meerela ha echiche, na-ekelekwa ya maka ha. Mgbe a nọ na-emekpọ ha ọnụ n’Ijipt n’ihi na ha na-agba ohu, Jehova tara ndị Ijipt ahụhụ iri. Mgbe Chineke kpọpụtara ha n’Ijipt, ha ‘gbawara ndị Ijipt aka’ ọlaọcha, ọlaedo, na uwe. (Ọpụ. 12:35, 36) Mgbe ndị Ijipt chụụrụ ndị Izrel rute n’ọnụ ọnụ Oké Osimiri Uhie, Jehova rụrụ ọrụ ebube mee ka osimiri ahụ kewaa. Mgbe ha nọkwa na-aga n’ala ịkpa, Jehova nyere ha mana kwa ụbọchị. Gịnịzi bụ nsogbu ha? Ihe ha nwere ejughị ha afọ. Ihe kpatara ya abụghị na ha enweghị nri ha ga-eri, kama ọ bụ n’ihi na obi adịghị ha ụtọ maka ihe ndị ha nwere.

Ebe ụfọdụ ndị Izrel na-agwa Mosis na obi adịghị ha mma maka mana ha na-ekpokọta. E nwekwara ndị nọ nso na-ekpokọta mana ma na-ele ihe na-eme.

Gịnị mere ihe ndị Izrel nwere ejughị ha afọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi mụta ịna-enwe obi ụtọ maka ihe e meere anyị?

6 Oleezi otú i nwere ike isi mụta ịna-enwe obi ụtọ maka ihe e meere gị? Nke mbụ, i kwesịrị iwepụta oge kwa ụbọchị na-eche gbasara ihe ọma ndị na-emere gị. I nwedịrị ike idetu ihe abụọ ma ọ bụ atọ obi dị gị ụtọ maka ha. (Ákwá 3:22, 23) Nke abụọ, na-ekele onye meere gị ihe ọma. Nke ka nke, na-ekele Jehova mgbe niile. (Ọma 75:1) Nke atọ, ka ndị ị na-emete enyi bụrụ ndị na-ekele ndị meere ha ihe ọma. Ọ bụrụ na ndị enyi anyị anaghị ekele ndị meere ha ihe ọma ma ọ bụ na-emekarị mkpesa, anyị nwere ike ịmụta ya. Ma, ọ bụrụ na ha na-ekele ndị meere ha ihe ọma, anyị nwekwara ike ịmụta ya. (Diut. 1:26-28; 2 Tim. 3:1, 2, 5) Ọ bụrụ na anyị ana-ekele ndị meere anyị ihe, anyị agaghị enwe oge anyị ga-eji chewe gbasara ihe ndị anyị na-enweghị.

7. Gịnị nyeere Nwanna Nwaanyị Aci aka ịna-enwe obi ụtọ maka ihe o nwere?

7 Ka anyị lee ihe mere otu nwanna nwaanyị bi n’Indoneshia aha ya bụ Aci. Ọ sịrị: “N’oge ọrịa koronavaịrọs, m bịara were otú ihe si dịrị m na-atụnyere otú o si dịrị ụmụnna m. Ihe a mere ka ihe m nwere gharazie ịna-eju m afọ.” (Gal. 6:4) Gịnị nyeere ya aka ịgbanwe otú o si ele ihe anya? Ọ sịrị: “M malitere iche gbasara ihe ọma ndị Chineke na-emere m kwa ụbọchị nakwa ọtụtụ ihe ọma ndị meere m n’ihi na m nọ n’ọgbakọ Jehova. M kpeziri ekpere kelee Jehova maka ha. Ihe a mere ka ihe m nwere ju m afọ.” Ọ bụrụ na obi anaghị adị gị ụtọ maka ihe ndị i nwere, ị̀ ga-emeli ihe Nwanna Nwaanyị Aci mere ma na-ekele ndị meere gị ihe ọma?

DỊRỊ UMEALA N’OBI

8. Gịnị mere Barọk?

8 Barọk bụ odeakwụkwọ Jeremaya onye amụma. E nwere mgbe ihe o nwere na-ejughị ya afọ. Barọk na-arụ ọrụ tara akpụ, ya bụ, ịkwado Jeremaya mgbe ọ na-agwa ndị Izrel ihe Jehova ga-eme ha. N’oge ahụ, obi adịghị ndị Izrel mma maka ihe ndị Jehova na-emere ha. Mana, kama Barọk ilekwasị anya n’ihe Jehova chọrọ ka o mee, ọ malitere ichegbu onwe ya gbasara ihe ọ chọrọ ime. Jehova si n’ọnụ Jeremaya gwa ya, sị: “Ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu. Kwụsị ịchọ ya.” (Jere. 45:3-5) E nwere ike ikwu na Jehova na-agwa Barọk, sị: “Ka ihe i nwere ugbu a ju gị afọ.” Barọk nabatara ihe a Jehova gwara ya, ihe ya adịkwa Jehova mma.

9. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 4:6, 7, gịnị ka ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka ịghọta? (Kọwaakwa foto.)

9 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị Onye Kraịst ka è nwere otu ọrụ e kwesịrị inye ya n’ọgbakọ. O nwere ike ịbụ na o nwere nkà pụrụ iche, na-arụsi ọrụ ike, ma ọ bụ na o feela Jehova ọtụtụ afọ, ma ọ bụkwanụ na o nwechara ihe atọ ndị a. N’agbanyeghị ya, e nwere ike inye ndị ọzọ ọrụ ahụ ọ chọrọ ka e nye ya. Gịnị nwere ike inyere ya aka ka iwe ghara iwe ya? O nwere ike iche banyere ihe Pọl onyeozi dere ná 1 Ndị Kọrịnt 4:6, 7. (Gụọ ya.) Ọrụ ọ bụla e nyere anyị na nkà ọ bụla anyị nwere si n’aka Jehova. Jehova enyeghị anyị ha n’ihi na anyị ka ndị ọzọ mma. Ha niile bụ amara o meere anyị.​—Rom 12:3, 6; Efe. 2:8, 9.

Foto ndị na-egosi: Ụmụnna ndị e nyere ọrụ ná nzukọ Jehova. 1. Ebe otu nwanna na-elebara paịpụ anya n’otu n’ime ụlọ ndị nzukọ Jehova nwe. 2. Ebe otu nwanna ji asụsụ ndị ogbi na-agba otu nwanna nwaanyị ajụjụ ọnụ ná mgbakọ sekit. 3. Ebe otu nwanna na-ekwu okwu n’ọmụmụ ihe ọgbakọ.

Nkà ọ bụla anyị nwere bụ amara Jehova meere anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)b


10. Olee otú anyị ga-esi mụta ịdị umeala n’obi?

10 Anyị ga-amụta ịdị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị echee gbasara ihe Jizọs mere. Legodị ihe mere n’abalị ahụ Jizọs sara ụkwụ ndịozi ya. Jọn onyeozi dere, sị: “Ebe ọ bụ na Jizọs ma [1] na Nna ya enyefeela ya ihe niile n’aka, [2] marakwa na ya si n’ebe Chineke nọ bịa, [3] na-alakwurukwa Chineke, o biliri . . . malite ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya.” (Jọn 13:3-5) Jizọs gaara eche na ọ bụ ndịozi ya kwesịrị ịsa yanwa ụkwụ. Mana n’oge niile ọ dịrị ndụ n’ụwa, e nweghị mgbe ọ bụla o chere na ebe ọ bụ Ọkpara Chineke, o kwesịrị inwe ụlọ mara mma, nwee ezigbo ego, ihe niile ana-agakwara ya siriri werere. (Luk 9:58) Jizọs dị umeala n’obi, ihe o nwere jukwara ya afọ. O mere ihe dị ezigbo mma anyị kwesịrị ịna-eme.​—Jọn 13:15.

11. Olee otú ịdị umeala n’obi sirila nyere Nwanna Dennis aka ka ihe o nwere na-eju ya afọ?

11 E nwere otu nwanna si Nedalandz aha ya bụ Dennis. Ọ gbalịrị ịdị umeala n’obi ka Jizọs. Mana, ọ dịghịrị ya mfe. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m na-achọpụta na m na-adị mpako nakwa na ihe m nwere anaghị eju m afọ, dị ka mgbe e nyere onye ọzọ ọrụ n’ọgbakọ. Ihe ahụ mee m, m na-amụ gbasara ịdị umeala n’obi. Etinyela m ụfọdụ amaokwu Baịbụl kwuru gbasara ịdị umeala n’obi n’ebe ọ ga-adịrị m mfe ịchọta ha na JW Library® ka m nwee ike ịna-agụgharị ha. Etinyekwala m ụfọdụ okwu e kwuru gbasara ịdị umeala n’obi n’ekwentị m, na-egekwa ha ọtụtụ ugboro.a Amụtala m na ọrụ niile anyị na-arụ bụ ka e too Jehova, ọ bụghị onwe anyị. Jehova na-enye onye ọ bụla n’ime anyị ihe ọ ga-arụ. Mana, ọ bụ yanwa na-eme ka ọrụ ahụ gaa nke ọma.” Ọ bụrụ na obi anaghị adị gị ụtọ maka ihe ndị i nwere ugbu a, mụta ịdị umeala n’obi. Ọ ga-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma, meekwa ka ihe i nwere na-eju gị afọ.​—Jems 4:6, 8.

NA-ECHE GBASARA OLILEANYA I NWERE

12. Olee olileanya anyị nwere maka ọdịnihu na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ? (Aịzaya 65:21-25)

12 Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị na-eche banyere olileanya magburu onwe ya anyị nwere maka ọdịnihu. Okwu Jehova Aịzaya onye amụma dere mere ka anyị mata na Jehova ma na anyị nwere ọtụtụ nsogbu. Ma, o buru amụma na ọ ga-ewepụrụ anyị ha niile. (Gụọ Aịzaya 65:21-25.) Anyị ga-ebi n’ụlọ mara mma, nwee ezigbo ọrụ ga na-atọ anyị ụtọ, na-erikwa nri ndị na-atọ ụtọ ma na-edozi ahụ́. Anyị agaghịzi na-eche na ihe ọjọọ ga-eme anyị ma ọ bụ ụmụ anyị. (Aịza. 32:17, 18; Ezik. 34:25) Olileanya anyị magburu onwe ya, e jikwa ya n’aka.

13. Olee nsogbu ndị anyị nwere? Oleekwa otú iche gbasara olileanya anyị ga-esi enyere anyị aka?

13 Anyị kwesịrị ilekwasị anya n’olileanya anyị ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị bi ‘n’oge ikpeazụ.’ Anyị niile nwekwara nsogbu ndị ‘tara akpụ.’ (2 Tim. 3:1) Kwa ụbọchị, Jehova na-enye anyị ntụziaka, na-enye anyị ike, na-akwadokwa anyị ka anyị nwee ike ịna-atachi obi. (Ọma 145:14) Ihe ọzọ bụ na olileanya anyị nwere na-enyere anyị aka idi ihe isi ike. O nwere ike ịbụ na ọ na-esiri gị ike igbo mkpa ezinụlọ gị. Ọ̀ pụtara na anyị ga-abụ ogbenye ọnụ ntụ mgbe niile? Mba. Jehova kwere nkwa na ọ ga-enye gị ihe dị gị mkpa, nyekwa gị ya mmaji kwuru mmaji na Paradaịs. (Ọma 9:18; 72:12-14) O nwere ike ịbụ na e nwere ọrịa na-anaghị ala ala ị na-arịa ma ọ bụ na obi na-ada gị mbà, ma ọ bụkwanụ na e nwere ihe na-egbu gị mgbu. Mana, ị gaghị ata ahụhụ otú a ruo mgbe ebighị ebi. Jehova kwere nkwa na ọrịa na ọnwụ agaghị adị n’ụwa ọhụrụ ya. (Mkpu. 21:3, 4) Olileanya a na-enyere anyị aka inwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe ọjọọ ndị na-eme anyị taa. Obi ka nwere ike ịna-atọ anyị ụtọ ọ bụrụgodị na a na-emegbu anyị, na mmadụ nwụnahụrụ anyị, na anyị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ na anyị nwere nsogbu ọzọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’agbanyeghị otú nsogbu bịaara anyị ugbu a si sie ike, anyị ma na “nsogbu ndị na-abịara anyị anaghị adịte aka” nakwa na n’ụwa ọhụrụ, anyị agaghịzi na-ata ahụhụ.​—2 Kọr. 4:17, 18.

14. Olee otú anyị ga-esi eme ka olileanya anyị na-esikwu ike?

14 Ebe ọ bụ na inwe olileanya na-eme ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ, olee otú anyị ga-esi mee ka olileanya anyị sikwuo ike n’obi anyị? Mmadụ nwere ike ikpuru enyo anya ka o nwee ike ịhụ ihe ndị dị n’ebe dị anya nke ọma. Otú ahụkwa ka o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee ihe ụfọdụ ka anyị nwee ike ịna-ahụkwu ihe ọma ndị ga-eme na Paradaịs nke ọma. Ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị maka otú ego si kọọ anyị, anyị nwere ike iji uche anyị hụ otú ndụ ga-adị mgbe ego, iji ụgwọ, na ịda ogbenye ga-ala. Ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị gbasara ọrụ ndị anyị chọrọ ịrụ n’ọgbakọ anyị na-enwetabeghị, anyị nwere ike iche mgbe ihe ndị ahụ na-agaghịzi adị mkpa mgbe anyị zuru okè ma fee Jehova ruo ọtụtụ puku afọ. (1 Tim. 6:19) Ná mmalite, o nwere ike isiri anyị ike ịhapụ ichegbu onwe anyị gbasara otú ihe si dị ugbu a ma na-atụgharị uche n’ihe ọma ndị ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ma ka oge na-aga, ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ọma ndị Jehova ga-emere anyị n’ọdịnihu, ọ ga na-adịkwuru anyị mfe ịna-eche banyere ha kama ịna-eche gbasara nsogbu anyị.

15. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Nwaanyị Christa kwuru?

15 Legodị otú olileanya si nyere Christa bụ́ nwunye Nwanna Dennis anyị kwuru okwu ya aka. Ọ sịrị: “E nwere ọrịa m na-arịa na-eme ka ezigbo ike na-agwụ m. Anaghị m agali ije. M na-anọ n’oche ndị ngwọrọ. Ọtụtụ mgbe, m na-anọkwa n’àkwà ndina m. Ahụ́ na-egbu m mgbu ụbọchị niile. N’oge na-adịbeghị anya, dọkịta m gwara m na ahụ́ m agaghị aka mma. Mana m chere ozugbo, sị: ‘Otú o si ele ihe ga-eme n’ọdịnihu anya dị iche.’ M lekwasịrị anya n’olileanya m, ọ na-emekwa ka obi na-eru m ala. Taa, m nwere ike inwe ọtụtụ nsogbu ka m bi n’ụwa ochie a. Ma, m ga-enwe ezigbo ọṅụ n’ụwa ọhụrụ.”

“E NWEGHỊ IHE NA-AKỌ NDỊ NA-ATỤ EGWU YA”

16. Gịnị mere Devid ji dee na “e nweghị ihe na-akọ ndị na-atụ egwu” Jehova?

16 Ọ bụrụgodị na ihe ndị anyị nwere na-eju anyị afọ, anyị ka ga-enwekwa nsogbu. Chegodị gbasara Eze Devid. Ma é nweghị ihe ọzọ, ụmụ ya atọ nwụnahụrụ ya. E boro ya ebubo ụgha, gharịpụ ya, na-achụkwa ya ruo ọtụtụ afọ ka e gbuo ya. Ma, o diri ha niile. O kwuru gbasara Jehova, sị: “E nweghị ihe na-akọ ndị na-atụ egwu ya.” (Ọma 34:9, 10) Gịnị mere o ji kwuo ihe ahụ? Ọ bụ eziokwu na anyị bụ ndị Jehova, anyị anaghị atụ anya ka nsogbu ghara ịbịara anyị chaa chaa. Ma, obi siri anyị ike na ihe ndị dị anyị ezigbo mkpa agaghị akọ anyị. (Ọma 145:16) Dịkwa ka Devid, obi siri anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa niile na-abịara anyị. Ihe anyị nwere ga-ejulikwa anyị afọ.

17. Gịnị mere i ji chọọ ka ihe i nwere na-eju gị afọ?

17 Jehova chọrọ ka ihe i nwere ju gị afọ. (Ọma 131:1, 2) N’ihi ya, na-eme ihe niile ị ga-emeli ka ihe i nwere na-eju gị afọ. Ọ bụrụ na ị mụta ịna-enwe obi ụtọ maka ihe ọma e meere gị, dịrị umeala n’obi, na-emekwa ka olileanya gị sie ike, ị ga-ekwuli, sị: “Amụtala m otú ihe m nwere ga-esi na-eju m afọ.”​—Fil. 4:11.

OLEE OTÚ IHE NDỊ A GA-ESI ENYERE GỊ AKA KA IHE I NWERE NA-EJU GỊ AFỌ?

  • Inwe obi ụtọ maka ihe ọma e meere gị

  • Ịdị umeala n’obi

  • Ịtụgharị uche n’olileanya i nwere

ABỤ NKE 118 Nyere Anyị Aka Ka Okwukwe Anyị Sie Ike

a Dị ka ihe atụ, gaa na jw.org lee vidio Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị isiokwu ha bụ Jehova Na-elekọta Ndị Dị Umeala n’Obi na Nganga Na-abịa Tupu Nkụpịa.

b NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-elebara ihe ndị dị n’otu n’ime ụlọ ndị nzukọ Jehova nwe anya, ebe a na-agba otu nwanna nwaanyị mụrụ asụsụ ndị ogbi ajụjụ ọnụ ná mgbakọ sekit, na ebe otu nwanna na-ekwu okwu ihu ọha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya