ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 39
ABỤ NKE 54 “Lekwa Ụzọ”
Nyere Ndị Nwere Mmasị n’Ozi Ọma Aka Ozugbo
“Ndị niile na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.”—ỌRỤ 13:48.
IHE A GA-AMỤ
Mgbe anyị ga-agwa ndị mmadụ ka anyị na ha mụwa Baịbụl nakwa ka ha bịa ọmụmụ ihe.
1. Olee ihe ndị mmadụ nwere ike ime ma anyị zie ha ozi ọma? (Ọrụ Ndịozi 13:47, 48; 16:14, 15)
ỌTỤTỤ ndị n’oge ndịozi nabatara eziokwu ozugbo ha nụrụ ozi ọma. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 13:47, 48; 16:14, 15.) Taakwa, ọtụtụ ndị na-enwe obi ụtọ oge mbụ ha nụrụ ozi ọma. Ndị na-enweghịdị mmasị n’ozi ọma mgbe mbụ ha nụrụ ya nwere ike imecha nwee mmasị ma nabata ya. Gịnị ka anyị ga-eme ma anyị hụ ndị nwere mmasị n’ozi ọma?
2. Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si yie ọrụ onye ọrụ ugbo?
2 Dị ka ihe atụ, e nwere ike iji ozi ọma anyị na-ezi tụnyere ọrụ onye ọrụ ugbo. Ọ bụrụ na ihe ọ kụrụ akaa ma ọ bụ chaa, ọ na-aghọrọ ya, ọ bụ eziokwu na ọ ka nwere ebe ọ na-akọ n’ugbo ahụ ma ọ bụ na-akụ ihe na ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị hụ ndị chọrọ ige anyị ntị, anyị ga-enyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ozugbo o kwere omume. Ma, o nwere ike ịdị mkpa ka e nyere ndị nwetụrụ mmasị aka ka ha mata uru ihe a na-agwa ha bara. (Jọn 4:35, 36) Anyị mata ma mmadụ ọ̀ dị njikere ịmata nke bụ́ eziokwu ma ọ bụ na ọ dịghị, anyị ga-ama ụzọ kacha mma anyị ga-esi enyere ya aka. Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ime n’oge mbụ anyị na mmadụ na-akparịta ụka iji nyere ya aka ma ọ bụrụ na o nwere mmasị. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi enyere ụdị onye ahụ aka imekwu nke ọma.
MGBE NDỊ MMADỤ CHỌRỌ ỊMATA GBASARA CHINEKE
3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị hụ ndị nwere mmasị n’ozi anyị? (1 Ndị Kọrịnt 9:26)
3 Anyị nọrọ n’ozi ọma hụ ndị nwere mmasị, anyị kwesịrị inyere ha aka ịmalite ịga ije n’ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi ozugbo. Anyị ekwesịghị igbu oge ịgwa ha ka anyị na ha mụwa Baịbụl nakwa ka ha bịa ọmụmụ ihe anyị n’oge mbụ anyị na ha na-akparịta ụka.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 9:26.
4. Kọọ akụkọ gosiri otu onye dị njikere ịmụ Baịbụl ozugbo.
4 Ịgwa ndị mmadụ ka a mụwara ha Baịbụl. Ụfọdụ ndị anyị na ha na-akparịta ụka na-adị njikere ka a mụwara ha Baịbụl ozugbo. Dị ka ihe atụ, n’otu Tọzdee, otu nwa agbọghọ bịara n’ebe e ji ihe nkwagharị ekwusa ozi ọma, were broshọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Nwanna nwaanyị ji ihe ahụ na-ezi ozi ọma kọwaara ya na e nwere ike iji akwụkwọ ahụ mụwara ya Baịbụl n’efu. Nwa agbọghọ ahụ nwere mmasị, nyezie nwanna nwaanyị ahụ nọmba ekwentị ya, nwanna nwaanyị ahụ enyekwa ya nke ya. Mgbe oge gatụrụ n’ụbọchị ahụ, nwa agbọghọ ahụ ziteere nwanna nwaanyị ahụ ozi n’ekwentị ma jụọ ya mgbe ha ga-amụ ihe ahụ. Nwanna nwaanyị ahụ gwara ya na ọ ga-abịa ná ngwụcha izu, nwa agbọghọ ahụ asị ya: “M ga-enwe ohere echi. Ị̀ ga-abịanụ?” Ha malitere ịmụ ihe na Fraịdee ahụ. Nwa agbọghọ ahụ bịakwara ọmụmụ ihe mbụ ya ná ngwụcha izu ahụ, mewekwa nke ọma ozugbo.
5. Gịnị ga-enyere anyị aka ịma ụzọ kacha mma anyị ga-esi agwa mmadụ ka anyị na ya mụwa Baịbụl? (Kọwaakwa foto.)
5 N’eziokwu, anyị anaghị atụ anya ka onye ọ bụla anyị ziri ozi ọma kweta ka a mụwara ya Baịbụl ozugbo otú ahụ nwa agbọghọ ahụ mere. O nwere ike ịdị mkpa ka e nyekwuoro ụfọdụ ndị aka ka ha nwekwuo mmasị. Anyị nwere ike iji ihe na-amasị mmadụ malite mkparịta ụka. Ọ bụrụ na anyị ana-ele onye nwere mmasị anya otú kwesịrị ekwesị ma gosi ya na ihe gbasara ya na-emetụ anyị n’obi, n’oge na-adịghị anya, o nwere ike ikweta ka a mụwara ya Baịbụl. Gịnị ka anyị nwere ike ikwu ma anyị chọọ ịgwa mmadụ ka anyị na ya mụwa Baịbụl? A jụrụ ụfọdụ ụmụnna na-eme nke ọma n’ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl ajụjụ ahụ.
Olee ihe anyị nwere ike ịgwa ndị anyị na-ahụ na foto ebe a ga-eme ka ịmụ Baịbụl masị ha? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)a
6. Gịnị ka anyị ga-agwa mmadụ iji nyere ya aka ịmata na ịmụ Baịbụl ga-abara ya uru?
6 Ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ a jụrụ gbasara ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl kọwara na n’obodo ụfọdụ, o nwere ike ịdị mma ka anyị ghara ikwu ihe ndị dị ka “ịmụ ihe,” “ọmụmụ Baịbụl,” ma ọ bụ “ịkụziri gị” mgbe anyị na-akọwara mmadụ gbasara anyị na ya ịmụ Baịbụl. Ha chọpụtara na ọ na-aka adaba adaba mgbe ụfọdụ ikwu ihe dị ka “ịkparịta ụka,” “ikwurịta okwu,” na “ịmatakwu Baịbụl.” I nwere ike ime ka onye ahụ chọọ ka gị na ya kwuo okwu n’oge ọzọ ma ị sị ya: “Otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa ná ndụ ga-atụ gị n’anya” ma ọ bụ “Baịbụl abụghị naanị akwụkwọ okpukpe, ọ na-enyekwara anyị aka ịma ihe ndị ga-abara anyị uru anyị ga-eme.” I nwekwara ike ịsị ya: “Ọ naghị egbu oge. I nwere ike iji nkeji iri ma ọ bụ nkeji iri na ise mụta ihe ga-abara gị uru.” I nwekwara ike ikwu ihe ndị a n’ekwughị ihe ndị dị ka “iyi agba” ma ọ bụ “kwa izu,” ka ọ ghara iche na o ji ụgwọ gị na ya ịna-ekwu n’izu ọ bụla.
7. Olee mgbe ụfọdụ ndị chọpụtara na ha amatala eziokwu dị na Baịbụl? (1 Ndị Kọrịnt 14:23-25)
7 Kpọọ ha ka ha bịa ọmụmụ ihe. O yiri ka n’oge Pọl onyeozi, ụfọdụ ndị matara na ha achọtala eziokwu dị na Baịbụl mgbe mbụ ha bịara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 14:23-25.) Ụdị ihe ahụ na-emekarịkwa taa. Ọtụtụ ndị ọhụrụ na-aka eme nke ọma ma ha malite ịbịa ọmụmụ ihe. Olee mgbe anyị ga-akpọ ha ka ha bịa ọmụmụ ihe? N’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi nke 10, a kpọrọ ndị a na-amụrụ ihe ka ha bịa ọmụmụ ihe. Mana, i kwesịghị ichere ruo mgbe unu mụruru ebe ahụ tupu gị akpọọ onye ị na-amụrụ ihe ka ọ bịa ọmụmụ ihe. Malite n’oge mbụ gị na ya kwurịtara okwu, i nwere ike ịgwa ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe ngwụcha izu. I nwere ike ịgwa ya isiokwu a ga-ekwu n’okwu ihu ọha ma ọ bụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe Ụlọ Nche.
8. Gịnị ka anyị nwere ike ịgwa mmadụ ma anyị kpọọ ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe anyị? (Aịzaya 54:13)
8 Ị kpọwa ndị nwere mmasị ka ha bịa ọmụmụ ihe, kọwaara ha otú ihe a na-eme n’ọmụmụ ihe anyị si dị iche n’ihe a na-eme n’okpukpe ndị ọzọ. Mgbe otu onye a na-amụrụ Baịbụl bịara ọmụmụ ihe ngwụcha izu nke mbụ ya, ọ jụrụ nwanna nwaanyị na-amụrụ ya ihe ma onye na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ọ̀ ma aha onye ọ bụla. Nwanna nwaanyị ahụ kọwaara ya na anyị niile na-agbalị ịmata aha ndị niile nọ n’ọgbakọ anyị otú ahụ anyị ma aha ndị ezinụlọ anyị. Onye ahụ a na-amụrụ Baịbụl chọpụtara na ihe ahụ dị ezigbo iche n’ihe na-eme na chọọchị ha. Otú ahụ ka ọ na-adị ọtụtụ ndị bịara ọmụmụ ihe anyị na nke mbụ ya. Ha amaghị ihe mere anyị ji abịa ọmụmụ ihe. (Gụọ Aịzaya 54:13.) Anyị na-ezukọta ka anyị fee Jehova, mụta gbasara ya, gbaakwa ndị ọzọ ume. (Hib. 2:12; 10:24, 25) Ihe a na-eme ka a na-ahazi ọmụmụ ihe anyị ahazi, ya ana-abakwara anyị uru. Anyị anaghị eme omenala na ya. (1 Kọr. 14:40) A na-arụkwa ebe anyị na-anọ amụ ihe otú ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-amụta ihe. Anyị anaghị ekwu na otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ibe ya mma n’ihi na anyị anaghị akwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị anaghịkwa etinye ọnụ n’esemokwu ọhaneze ma ọ bụ nke mmadụ na ibe ya. O nwere ike ịba uru ma anyị buru ụzọ gosi onye anyị na-amụrụ Baịbụl vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Ọ ga-enyere ya aka ịma ihe ọ ga-atụ anya ya ma ọ bịa.
9-10. Anyị kpọwa mmadụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe, gịnị ka anyị ga-eme ka obi sie ya ike na a gaghị amanye ya ịghọ Onyeàmà Jehova ma ọ bụkwanụ ikwu okwu n’ọmụmụ ihe? (Kọwaakwa foto.)
9 Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịbịa ọmụmụ ihe anyị n’ihi na ụjọ na-atụ ha na ha ga-aghọ Ndịàmà Jehova. Mee ka obi sie onye ọ dị otú ahụ ike na ọ na-amasị anyị ma ndị mmadụ bịa ọmụmụ ihe anyị nakwa na anyị anaghị amanye mmadụ ịbụ Onyeàmà Jehova ma ọ bụkwanụ ikwu okwu n’ọmụmụ ihe. Ezinụlọ nwere ike ịbịa, ma ụmụaka. N’ọmụmụ ihe anyị, ụmụaka anaghị anọ iche, kama ha na ndị mụrụ ha na-anọkọta ọnụ na-amụ ihe. Ihe a na-eme ka ndị nne na nna mara ebe ụmụ ha nọ nakwa ihe a na-akụziri ha. (Diut. 31:12) Anyị anaghị ana ụtụ ma ọ bụ na-eke ndị mmadụ envelopu a ga-eji etinye ego. Kama, anyị na-eme ihe Jizọs kwuru nke bụ́: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Mat. 10:8) I nwekwara ike ịgwa ya na ọ dịghị mkpa ka o yiri uwe dara oké ọnụ bịa. Ihe dị Chineke mkpa bụ otú obi mmadụ dị, ọ bụghị otú ọ dị n’anya.—1 Sam. 16:7.
10 Onye ahụ bịa ọmụmụ ihe, mee ihe ị ga-emeli ka ahụ́ ruo ya ala. Gosi ya ụfọdụ ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ. Ọ bụrụ na obi eruo ya ala, o nwere ike ime ka ọ bịa ọzọ. A malite ọmụmụ ihe, ọ bụrụ na o nweghị Baịbụl, na-egosi ya ebe a na-agụ na Baịbụl nke gị, meekwa ka ọ ghọta ihe a na-ekwu gbasara ya na otú anyị si amụ ihe.
Mmadụ bịawa ọmụmụ ihe, ya na Jehova na-amalite ịdị ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10)
A MALITE ỊMỤRỤ MMADỤ BAỊBỤL
11. Olee otú ị ga-esi egosi na ị ma na e nwere ihe ndị ọzọ onye ị na-amụrụ Baịbụl na-eme?
11 Olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi ma anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl? Gosi na ị ma na e nwere ihe ndị ọzọ onye ị na-amụrụ Baịbụl na-eme nakwa na e nwere oge o wepụtara iji mụọ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na gị na ya ekpebie mgbe ị ga-abịa, gaa n’oge, ọ bụrụgodị na ndị bi n’ebe unu bi anaghị agakarị ihe n’oge. Ihe ọzọ bụ na i nwere ike ịchọpụta na ọ ga-akacha mma ka ọmụmụ ihe mbụ unu dị nkenke. Ụfọdụ ndị nkwusa bụ́ aka ochie n’iduzi ọmụmụ Baịbụl kwuru na ọ dị mma ịmụcha ihe ahụ ngwa ngwa ọ bụrụgodị na onye ahụ chọrọ ka unu mụtụkwuo. Ekwukwala ọtụtụ okwu. Hapụ onye ahụ ka o kwuo otú obi dị ya.—Ilu 10:19.
12. Gịnị kwesịrị ịka anyị mkpa malite n’oge mbụ anyị bidoro ịmụrụ mmadụ Baịbụl?
12 Malite n’oge mbụ i bidoro ịmụrụ mmadụ Baịbụl, ihe kwesịrị ịbụ mkpa gị bụ inyere ya aka ịmata Jehova na Jizọs na ịhụ ha n’anya. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-egosi ya ihe Baịbụl kwuru kama ịna-agwa ya ihe ị ma ma ọ bụ ihe i chere. (Ọrụ 10:25, 26) Pọl onyeozi gosiri otú e si eme ya. Ọ kụziiri ndị mmadụ gbasara Jizọs Kraịst, onye Jehova zitere ka o nyere anyị aka ịmụta banyere ya na ịhụ ya n’anya. (1 Kọr. 2:1, 2) Pọl mekwara ka o doo anya na ọ dị mkpa ka e nyere ndị ọhụrụ aka ka ha mụta ịkpa ezigbo àgwà, àgwà ndị e nwere ike iji atụnyere ọlaedo, ọlaọcha, na nkume ndị dị oké ọnụ. (1 Kọr. 3:11-15) Àgwà ndị so n’àgwà ndị ahụ bara uru bụ okwukwe, amamihe, ịghọta ihe, na ịtụ egwu Jehova. (Ọma 19:9, 10; Ilu 3:13-15; 1 Pita 1:7) Na-akụzi ihe ka Pọl. Otú ị ga-esi eme ya bụ inyere onye ị na-amụrụ ihe aka inwe okwukwe siri ike nakwa ka ya na Nna ya nke eluigwe hụrụ ya n’anya bụ́ Jehova dịkwuo ná mma.—2 Kọr. 1:24.
13. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-enwe ndidi ma na-aghọta ihe ma anyị na-enyere ndị nwere mmasị aka? (2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5) (Kọwaakwa foto.)
13 Na-akụzi ihe ka Jizọs. Na-enwe ndidi ma na-egosi na ị na-aghọta ihe. Ajụkwala mmadụ ajụjụ ga-eme ka ahụ́ ghara iru ya ala. Ọ bụrụ na e nwere ihe siiri ya ike ịghọta, ọ dịghị mkpa ka unu ka na-ekwu ya. Unu nwere ike mụrụ ihe na-aga, e mechaa unu elebagharịa ya anya. Kama ịgbalị ịmanyewe onye ahụ ka o kweta ihe ị na-akụziri ya mgbe ọ na-adịbeghị njikere, hapụ ka oge ụfọdụ gaa ka eziokwu gbanye mgbọrọgwụ n’obi ya. (Jọn 16:12; Kọl. 2:6, 7) Baịbụl kwuru na nkụzi ụgha dị ka “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” anyị kwesịrị ịkụghasị. N’asụsụ Grik, ihe ndị ahụ gbanyesiri mgbọrọgwụ ike na-ekwu gbasara ebe a rụsiri ike e kwesịrị ịkwatu. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5.) O nwere ike ọ gaghị adịrị onye a na-amụrụ Baịbụl mfe ịkwụsị ikwere ihe o kweere kemgbe. N’ihi ya, ọ ga-adị mma inyere ya aka inweta ebe ọzọ a rụsiri ike, ya bụ, ịtụkwasị Jehova obi. Ọ ga-emezi ka ọ dịrị ya mfe ịhapụ ihe ahụ o kweburu.—Ọma 91:9.
Hapụ ka oge ụfọdụ gaa ka eziokwu nwee ike ịgbanye mgbọrọgwụ n’obi onye ị na-amụrụ Baịbụl (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)
MGBE NDỊ ỌHỤRỤ BỊARA ỌMỤMỤ IHE
14. Olee otú anyị ga-esi na-emeso ndị bịara ọmụmụ ihe anyị?
14 Jehova chọrọ ka anyị ghara ịna-ele ndị mmadụ anya n’ihu ma anyị na-emeso ndị ọhụrụ ihe n’agbanyeghị omenala ha, ma hà ji ego ma ọ bụ na ha ejighị, ma ọ bụkwanụ obodo ha. (Jems 2:1-4, 9) N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ndị bịara ọmụmụ ihe anyị n’anya?
15-16. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọhụrụ aka ka ahụ́ ruo ha ala ma ha bịa ọmụmụ ihe anyị?
15 Ụfọdụ ndị nwere ike ịbịa ọmụmụ ihe anyị n’ihi na ha chọrọ ịma ihe na-eme ebe ahụ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na onye bi ebe ọzọ gwara ha bịa. N’ihi ya, anyị ekwesịghị igbu oge ịgakwuru onye ọhụrụ bịara ọmụmụ ihe anyị. Nabata ya, mana emekwala ka ahụ́ ghara iru ya ala. Gwa ya ka gị na ya nọrọ. Jiri Baịbụl gị ma ọ bụ akwụkwọ anyị ji amụ ihe na-egosi ya ihe a na-eme ma ọ bụkwanụ gị ewetara ya Baịbụl nke ya na akwụkwọ nke ya. Cheekwa ihe ị ga-eme ka ahụ́ ruo ya ala. Otu nwoke bịara ọmụmụ ihe anyị gwara nwanna nabatara ya na ụjọ nọ na-atụ ya na ákwà o yi adịchaghị mma n’anya ka nke ndị ọzọ. Nwanna ahụ mere ka obi ruo ya ala ma kọwaara ya na Ndịàmà Jehova bụkwa ndị mmadụ ibe ya. Nwoke a mechara mewe nke ọma ma mee baptizim. Ma, o chefughị ihe ahụ nwanna ahụ gwara ya. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ma anyị na-agwa ndị bịara ọmụmụ ihe okwu tupu ọmụmụ ihe ebido na mgbe a gbasachara. Gosi ha na i nwere mmasị n’ebe ha nọ, mana etinyekwala anya n’ihe na-agbasaghị gị.—1 Pita 4:15.
16 Anyị nwekwara ike ime ka ahụ́ ruo ndị ọhụrụ ala. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-akwanyere ha ùgwù ma anyị kwuwe gbasara ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na ihe ha kweere mgbe anyị na ndị ọzọ na-akparịta ụka, mgbe anyị na-aza ajụjụ, nakwa mgbe anyị na-eme ihe omume. Anyị ekwesịghị ikwu ihe ndị nwere ike iwute ha ma ọ bụkwanụ mee ka ha ghara ịbịa ọzọ. (Taị. 2:8; 3:2) Dị ka ihe atụ, anyị agaghị na-ekwu gbasara ihe ndị ha kweere otú na-egosi na anyị anaghị akwanyere ha ùgwù. (2 Kọr. 6:3) Ndị na-ekwu okwu ihu ọha kwesịrị ịkpachara ezigbo anya gbasara ihe a. Ha kwesịkwara igosi na ha bu ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-ege okwu ahụ n’obi ma ha na-akọwa okwu ụfọdụ ha na-anaghị aghọta.
17. Olee ihe na-abụ mkpa anyị ma anyị hụ ndị “chọrọ inweta ndụ ebighị ebi” n’ozi ọma?
17 Ozi ọma anyị na-ekwusa na-adịkwu ezigbo mkpa kwa ụbọchị. Anyị ka na-achọkwa ndị “chọrọ inweta ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Anyị hụ ha, anyị ekwesịghị igbu oge ịgwa ha ka anyị na ha mụwa Baịbụl ma ọ bụ ka ha bịa ọmụmụ ihe anyị. Anyị mee otú ahụ, anyị na-enyere ha aka ime ihe mbụ ga-enyere ha aka ịgawa ije ‘n’okporo ụzọ nke na-eduba ná ndụ.’—Mat. 7:14.
ABỤ NKE 64 Anyị Ji Ọṅụ Soro Na-ewe Ihe Ubi
a NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna abụọ gara izi otu onye amị lara ezumike nká nọ ọdụ n’oche ozi ọma; ebe ụmụnna nwaanyị abụọ na-ezi otu nwaanyị ji ọrụ n’aka ozi ọma dị nkenke.