Ihe Mere n’Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ, n’Afọ 1913
ỤLỌ NCHE (Bekee) nke January 1, 1913, kwuru ihe otu nwoke onye Amerịka bụ́ onye nta akụkọ kwuru. Aha nwoke ahụ bụ Herbert Kaufman. Ọ sịrị: ‘O nweghịzi onye na-eche na o nwere ihe na-agaghị ekwe omume. Ọtụtụ ihe ndị mmadụ chere na ha agaghị ekwe omume n’oge gara aga emechaala mee.’ Ná mbido afọ 1913, ndị mmadụ nọ na-atụ anya na ihe ọma na-abịa, na o ruwela mgbe ihe ga-adị mma.
Ihe so mee ka ndị mmadụ na-eche na o ruwela mgbe ihe ga-adị mma bụ ihe ndị dị ịtụnanya ndị nkà na ụzụ na-arụpụta. Dị ka ihe atụ, n’Amerịka, otu ụlọ ọrụ na-emepụta ụgbọala (ya bụ, Ford Motor Company) mepere ụlọ ọrụ ọhụrụ ha n’ebe a na-akpọ Haịland Pak, na Mishigan. Obere oge ha mepechara ụlọ ọrụ ọhụrụ ahụ, ọnụ ego a na-ere ụgbọala bịara daa, ya emezie ka ọ dịrị ọtụtụ ndị mfe ịzụta ụgbọala. Olee ihe mere ọnụ ego ụgbọala ji daa? Ụlọ ọrụ a bịara kee otú ha si arụ ụgbọala eke. Dị ka ihe atụ, onye na-arụ ahụ́ ya rụchaa, e bufeere ya onye ga-ete ya ágbá. Ka onye ahụ na-ete ya ágbá, onye nke ahụ na-arụ ahụ́ ya ebido rụwa ahụ́ ụgbọala ọzọ. Otú a ha sizi arụ ụgbọala mere ka ha na-arụpụta ụgbọala ngwa ngwa. Ọ bụ otú a ka ha si rụpụta ọtụtụ ụgbọala ha a na-akpọ Model T. Ihe a mere ka ha gbutuo ọnụ ego ha na-ere ụgbọala ha.
Ndị Jehova e nwere n’oge ahụ nọkwa na-atụ anya ihe ọma ga-emenụ. Ma, ihe ọma ha na-atụ anya ya dị iche. O teela ha gwawara ndị mmadụ na afọ 1914 ga-abụ afọ pụrụ iche, ha nọkwa na-atụsi anya ike maka ihe ga-eme n’afọ ahụ. Ma, ha anọghị nkịtị na-eche. Ha ji obi ha niile na-efesi Chineke ike.
Mpempe akwụkwọ ụmụnna ji agwa ndị nke ha ebe ha na Pastor Russell na-aga mgbakọ
N’ọnwa Jun afọ 1913, ha bidoro inwe mgbakọ n’obodo dị iche iche. Ha nwere nke mbụ were otu ụbọchị n’ebe a na-akpọ Kanzas Siti, dị na Mizuri, n’Amerịka. Ihe karịrị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị dị narị abụọ ji tren gaa mgbakọ n’obodo ndị ọzọ dị n’ebe ọdịda anyanwụ Amerịka nakwa na Kanada. O were ha izu anọ iji gachaa mgbakọ ndị a. Ná mgbakọ nke ọ bụla, a na-agwa ndị ọhụrụ bịaranụ na onye chọọ ịmatakwu gbasara Baịbụl, ya kwuo. Ọtụtụ puku ndị bịaranụ kwuru na ha ga-achọ. Ndị mmụta Baịbụl gakwara nyere ha aka.
N’afọ 1913, ndị na-arụ n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin mepụtara ihe nkiri a na-akpọ n’asụsụ Bekee “Photo-Drama of Creation” (ya bụ, Foto Ihe Nkiri nke Okike). Ọ na-ewe awa asatọ iji lechaa ya. A kpọnye ya, a na-anụ okwu ndị si na Baịbụl, na-anụkwa egwú, foto ndị mara mma a na-egosikwa. Ọ bụ eziokwu na ihe e nwere mgbe ahụ bụ naanị ihe dị ka puku Ndị Mmụta Baịbụl ise na otu narị na-agachi ozi ọma anya, ha chọrọ ka ọtụtụ nde ndị ha na-ezi ozi ọma lee ihe nkiri ahụ. Ihe bụ mkpa ha bụ ka ha lee ma ọ̀ ga-ekwe omume ka mmadụ niile n’ụwa lee ya.
Olee ihe ga-eme n’afọ 1914? Ndị mmadụ hà ga-enwe mmasị ile ihe nkiri ahụ? Gịnị ga-eme ma Oge Ndị Jentaịl gwụchaa? Ndị Mmụta Baịbụl chọsiri ike ịma azịza ajụjụ ndị a, ma, obi siri ha ike na Jehova kwụ ha n’azụ.
Agha dị egwu ga-adanụ, nke e mechara kpọwa Agha Ụwa Mbụ, ga-eme ka ndị mmadụ buru aka n’isi maka na ihe ọma ha na-atụ anya ya emechaghị mee. Ihe ndị dị ịtụnanya ndị nká na ụzụ na-emepụta agaghị enwe ike ịnapụta ha ná nsogbu ndị ga-abịara ha. Ihe ga-eme n’afọ 1914 ga-agbanwe nnukwu ihe ná ndụ Ndị Mmụta Baịbụl nakwa n’ụwa niile.