Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb13 p. 2-3
  • Isiokwu Afọ 2013

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Isiokwu Afọ 2013
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Joshụa 1:9—‘Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike’
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Ihe Jọshụa Chetara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Nwee Obi Ike, Jehova Nọnyeere Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ọ Chọrọ Ka Ihe Gaara Anyị nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2013
yb13 p. 2-3

Isiokwu Afọ 2013

‘Nwee obi ike, dịkwa ike. Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị.’ Jọshụa 1:9

N’ihe karịrị puku afọ atọ na narị afọ anọ gara aga, ọ fọrọ ntakịrị ka ndị Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ. Ma, tupu ha abanye na ya, ha ga-agafe ọtụtụ obodo ndị iro ha. N’ihi ya, Chineke gwara Jọshụa ka o ‘nwee obi ike, ma dị ike.’ Ọ bụrụ na Jọshụa anọgide na-erubere Chineke isi, ọ ga-emeri ndị iro ha. Chineke gwakwara ya ka ọ ghara ‘ịma jijiji ma ọ bụ tụọ ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ya ebe ọ bụla ọ na-aga.’ N’eziokwu, Chineke nọnyeere ya n’ihi na o were ndị Izrel naanị afọ isii iji merie ndị iro ha.—Jọsh. 1:7-9.

Ọ fọkwara ntakịrị ka ezigbo Ndị Kraịst banye n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ha ná nkwa. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị nwee obi ike ma dị ike. Otú ahụ Jọshụa nwere ndị iro, anyịnwa nwekwara ndị iro na-agbalị ime ka anyị kwụsị ife Chineke. Agha anyị na-alụ abụghị agha e ji mma na ube alụ. Ngwá agha anyị abụghịkwa ngwá agha nkịtị. Ọ bụ Jehova na-akụziri anyị otú anyị ga-esi jiri ngwá agha ndị a na-alụ agha. Ma ihe ọ̀ dịịrị gị mma ma ihe ò siiri gị ike, mara na ọ bụrụhaala na i nwee obi ike, dịkwa ike, ma na-eme ihe Jehova na-achọ, ọ ga-anọnyere gị. Ọ ga-emekwa ka i nwee mmeri.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya