IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA
Obi Dị Ha Ụtọ Maka Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET
N’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Jun afọ 2013, a mara ọkwa na jw.org na e nwere ike ịchọta ihe n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET n’otu narị asụsụ. Mmadụ nwere ike ịchọta ihe na ya otú ahụ e si achọta ihe na Watchtower Library nke dị na CD-ROM. E nwere ike iji kọmputa, ekwentị ma ọ bụ ihe ndị e ji aga Ịntanet gaa n’ebe ahụ. Ọ bụ ihe ndị e dere n’akwụkwọ anyị malite n’afọ 2000 gbagowe ka e tinyere na ya. N’ọtụtụ asụsụ, e tinyekwara ya Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nakwa akwụkwọ Insight. I nwekwara ike jiri ya chọta otu mkpụrụ okwu ma ọ bụ karịa, otú ahụ e si eji Watchtower Library achọta ihe. Ọ bụrụ na e nwere amaokwu Baịbụl ma ọ bụ isiokwu ị chọrọ ịgụ, i nwere ike ịchọ ya n’ọ́bá akwụkwọ a. Ị chọọkwa, ya emepere gị ya n’asụsụ ọzọ. Ọtụtụ mmadụ edetarala anyị akwụkwọ ozi ekele. Lee ụfọdụ n’ime ha:
“Unu emeela maka inye anyị ọ́bá akwụkwọ a. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m hụrụ ihe ọhụrụ a e ji amụ ihe. Amaghị m anya kọmputa ma ọ bụ Ịntanet, ma ama m na otú unu si rụọ ya enweghị atụ. O gosiri na unu hụrụ ma Jehova ma ndị agbata obi unu ma ụmụnna unu n’anya. E nweghị onyinye ka onyinye a Jehova nyere anyị. Jidenụ ka unu ji.”—A., Ajentina.
“Ọ tụrụ m n’anya mgbe m bara n’Ịntanet n’ehihie a hụ na asụsụ Heshan Kriol bụ otu n’ime asụsụ ọhụrụ e tinyere n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET. Amaghị m na ụdị ihe a nwere ike ime eme. Amaghị m otú m ga-esi kelee unu. Ka Jehova gọzie mbọ niile unu na-agba, ka mmụọ nsọ ya nọgidekwa na-edu unu.”—D.C., Amerịka.