Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Na-amụ Ihe
Gaa n’Ịntanet Gụọ Magazin Ndị E Bipụtara Ọhụrụ: Bụrụ ụzọ gụọ Ụlọ Nche na Teta! n’Ịntanet tupu e bute ha n’ọgbakọ. I nwekwara ike ịnọ ebe ahụ gere Ụlọ Nche na Teta! ndị nke Bekee. Ị chọọ ịhụ ha ma ị gaa na jw.org, pịa ebe e dere “Ihe Anyị Nwere.” Ya mepee, ị ga-ahụ ebe e dere “Magazin.”
Gụọ Isiokwu Ndị Na-adị Naanị n’Ịntanet: O nwere isiokwu ndị na-agbakarị n’Ụlọ Nche na Teta! Ha bụ: “Maka Ndị Na-eto Eto,” “Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl,” “Ihe Ezinụlọ Ga-atụle,” na “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị.” Bido n’ọnwa Jenụwarị, isiokwu ndị ahụ agaghịzi na-adị na magazin e biri ebi. Ha ga na-adịzi naanị n’Ịntanet. Ị chọọ ịgụ ha, gaa n’Ịntanet. I nwere ike ịgụ ha mgbe naanị gị na-amụ ihe ma ọ bụkwanụ mgbe gị na ndị ezinụlọ gị na-amụ ihe. Ị chọọ ịhụ ha ma ị gaa na jw.org, pịa ebe e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi.” Ya mepee, ị ga-ahụ ebe e dere “Ụmụaka” ma ọ bụkwanụ “Ndị Na-eto Eto.”
Gụọ Ihe Ọhụrụ Ndị E Kwuru Banyere Ọrụ Anyị: Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-ahụ akụkọ na ahụmahụ ndị ga-eme ka okwukwe gị sikwuo ike. Ị ga-ahụkwa vidio ndị gosiri otú ọrụ anyị si na-aga n’ụwa niile. E nwekwara ihe ụfọdụ e kwuru banyere ọdachi na otú e si na-akpagbu ụmụnna anyị. Ha ga-enyere gị aka ịna-echeta ụmụnna anyị n’ekpere. (Jems 5:16) Ị chọọ ịhụ ha ma ị gaa na jw.org, pịa ebe e dere “Akụkọ.”
Jiri Ọ́bá Akwụkwọ Anyị Dị n’Ịntanet Mee Nchọnchọ: Jiri kọmputa ma ọ bụ ekwentị gị na-eme nchọnchọ na jw.org. I nwekwara ike iji ya gụọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Ị chọọ ịhụ ya ma ị gaa na jw.org, pịa ebe e dere “Ihe Anyị Nwere.” Ya mepee, lee anya n’ala ala, ị ga-ahụ ebe e dere “Ọ́bá Akwụkwọ.” Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: N’ebe ahụ a na-edenye adres Ịntanet na kọmputa ma ọ bụ n’ekwentị, dee www.wol.jw.org.
[Ihe Osise dị na peeji nke 4]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Megodị Ihe A
1 Ị pịa ebe ahụ e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi,” ị ga-ahụ ebe e dere “Ụmụaka.” Pịa ebe ahụ ka o mepeere gị ihe ndị dị na ya. Lee anya ná mgbada mgbada, ị ga-ahụ ebe e dere “Foto E Ji Akụzi Ihe.” Si ebe ahụ bipụtara nwa gị otu ma gwa ya ka o mee ihe a sị ya mee.
2 Ị chọọ ile vidio, pịa ebe ahụ e dere “Kpọwa.”