Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Na-ezi Ozi Ọma
Gwa Ndị Mmadụ Ka Ha Na-aga n’Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet: Ụfọdụ ndị anaghị achọ ka anyị zie ha ozi ọma, e nwekwara ndị nke na-anaghị achọ ịgụ akwụkwọ anyị. Ma, ha nọrọ n’ụlọ ha, ha nwere ike ịga na jw.org gụọ banyere anyị. N’ihi ya, na-agwa ndị mmadụ ka ha na-aga na jw.org.
Jiri Ya Na-aza Ndị Mmadụ Ajụjụ: Mgbe ụfọdụ, onye anyị bịara izi ozi ọma, onye na-abịa ọmụmụ ihe anyị mgbe ụfọdụ, ma ọ bụkwanụ onye anyị na ya na-arụ ọrụ nwere ike ịjụ anyị ajụjụ. O nwere ike ịchọ ịma banyere Ndịàmà Jehova na ihe anyị kweere. I nwere ike iji kọmputa, ekwentị ma ọ bụ ngwá elektrọniks nwere Ịntanet gosi ya azịza ya ozugbo. Ọ na-akacha mma ma e jiri Baịbụl gụọ amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe ahụ. Ọ bụrụ na ị naghị ejili ekwentị gị aba n’Ịntanet, gwa onye ahụ otú o nwere ike isi gaa chọta azịza ajụjụ ahụ na jw.org. Ebe ọ ga-ahụ azịza ajụjụ ụfọdụ na jw.org bụ ebe e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi.” Ya pịa ya, ọ ga-ahụ ebe e dere “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.” O nwekwara ike pịa ebe e dere “Gbasara Anyị.” Ya mepee, ya apịa ebe e dere “Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Banyere Ndịàmà Jehova.”
I Nwere Ike Isi Ebe ahụ Zigara Mmadụ Akwụkwọ ma Ọ Bụ Isiokwu Ị Chọrọ Ka Ọ Gụọ: I nwere ike isi na jw.org zigara mmadụ akwụkwọ anyị n’ụdị PDF ma ọ bụ EPUB. I nwekwara ike isi n’ebe ahụ tinye akwụkwọ anyị nke a na-egere egere na siidi zigara mmadụ. Ọ bụrụ na i si n’Ịntanet zigara mmadụ akwụkwọ, broshọ, Ụlọ Nche ma ọ bụkwanụ Teta!, i nwere ike ịgụnye ya n’akwụkwọ i nyere n’ọnwa ahụ. Ezigakwarala onye ị na-amaghị ihe ọ bụla, etinyekwala ihe ọ bụla anyị dewere ebe ahụ n’ebe ọzọ n’Ịntanet. Ị chọọ ịhụ akwụkwọ anyị i nwere ike iwere ma ị gaa na jw.org, gaa n’ebe e dere “Ihe Anyị Nwere.”
Ị Ga-ahụ Ihe Ọhụrụ Ndị E Kwuru Banyere Ndịàmà Jehova: Nke a ga-enyere ndị ị na-amụrụ Baịbụl na ndị ọzọ aka ịma ebe ozi ọma anyị rurula na otú anyị si dịrị n’otu. (Ọma 133:1) Ị chọọ ịhụ ha ma ị gaa na jw.org, gaa n’ebe e dere “Akụkọ.”
[Ihe Osise dị na peeji nke 5]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Megodị Ihe A
1 N’ebe ahụ e dere “Ihe Anyị Nwere,” ị ga-ahụ ihe ụfọdụ e nwere ike ịgụ agụ ma ọ bụ gere egere. Pịa ebe ahụ họrọ nke ị chọrọ.
2 Pịa ebe ahụ e dere MP3 ka o bupụtara gị isiokwu dị iche iche dị n’akwụkwọ ahụ. Pịzie isiokwu nke ị chọrọ ka i nwee ike iwere ya ma ọ bụ gị apịa ▸ ka i nwee ike igere ya egere.
3 Ọ bụrụ na ị chọrọ iwere akwụkwọ anyị n’asụsụ ọzọ, pịa ebe ahụ e dere “Gosi M nke” ma họrọ asụsụ nke ị chọrọ.