Jiri Isiokwu Bụ́ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara” nke Dị na jw.org Na-ekwusa Ozi Ọma
Ị gaa n’ebe e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi” na jw.org, ị ga-ahụ isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.” Ọ bụrụ na anyị na-agụ isiokwu ndị dị ebe ahụ, anyị ga-enwe ike ịgwa onye jụrụ anyị nke ọ bụla n’ime ha ka ọ gaa na jw.org gụọ ya. Anyị nwekwara ike ịjụ mmadụ otu n’ime ha ma anyị chọọ izi ya ozi ọma. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike họrọ otu ajụjụ ndị bi n’ókèala anyị na-ajụkarị, jụọ ya onye anyị gara na nke ya, jirizie Baịbụl zaa ya ya otú ahụ e si zaa ya na jw.org. E mechaa, anyị nwere ike ịgwa ya ma ọ bụ gosi ya ebe anyị si nweta ya. Ihe ọzọ anyị nwere ike ime bụ ịgwa ya ka ọ gụpụta azịza ajụjụ ahụ na jw.org. Nwunye otu onye nlekọta sekit n’Amerịka na-eji ajụjụ ndị a ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ya bịa na nke mmadụ, ya asị ya: “Ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: ‘Ọ̀ bụ Chineke na-akpata nsogbu ụwa?’ Ị̀ ga-achọ ka m jiri ihe na-erughị otu nkeji zaa gị ajụjụ a?” Onye ahụ kweta, ya ewere ekwentị ya kpọnyere ya ya ka o gere. Ọ kpọchaa, ya asapeta isi nke iri na otu n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, tụlee paragraf ole na ole na ya.