Jiri jw.org Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma—“Bụrụ Enyi Jehova”
Ị gaa na jw.org pịa ebe e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi,” ị ga-ahụ ebe e dere “Ụmụaka.” Ị pịa ya, ị ga-ahụ ebe e dere “Bụrụ Enyi Jehova.” Ihe ndị dị ebe ahụ bụ maka ụmụaka. Ha bụ abụ, vidio, na “ihe ị ga-eme.” Ị̀ na-eji ha ezi ozi ọma? Ọ bụrụ na ị na-amụrụ nne ma ọ bụ nna ụmụ ya ka dị obere ihe, ọ ga-adị mma ma i gosi ya ihe ụfọdụ dị n’ebe ahụ. Ime otú ahụ nwere ike ime ka o nwee mmasị ịchọ ihe ndị ọzọ na jw.org.
Mgbe a na-ekesa Akụkọ Alaeze nke 38, otu nwanna nwoke nyere ya otu nwaanyị, ya amalite ịgụ ya ozugbo. Nwaanyị ahụ nwekwara ụmụaka ndị chọrọ ịma ihe dị na traktị ahụ. Nwanna ahụ ji nkeji ole na ole gwa ya ihe dị na ya ma gosi ya adres ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet n’azụ akwụkwọ ahụ. Ebe ọ bụ na nwaanyị ahụ nwere mmasị, nwanna ahụ wepụtara ekwentị ya jiri ya gosi ya na ụmụ ya otu vidio Kelechi.
O nwere nwanna nwaanyị gwara otu nwaanyị ya na ya na-arụkọ ọrụ banyere jw.org na ihe ndị na-enyere ezinụlọ aka dị na ya. Nwaanyị ahụ jiri aka ya gaa n’ebe ahụ, ya na ụmụ ya ekirie ihe ndị dị na ya. O mechara gwa nwanna ahụ na ụmụ ya na-abụzi abụ bụ́ “Kwusaa Okwu Chineke.” Abụ ahụ bụ otu n’ime abụ ndị dị na “Bụrụ Enyi Jehova.”
Gbalịa ka ebe ahụ e mere maka ụmụaka na jw.org dokwuo gị anya ka i wee si na ya tinye vidio, abụ ma ọ bụ ihe ndị e ji akụziri ụmụaka ihe n’ekwentị gị ma ọ bụ n’ihe ndị yiri ya. I tinye ha, ọ ga-adịrị gị mfe iji ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. O doro anya na ihe ndị dị n’ebe ahụ na-enyere anyị aka ịgbara Onyenwe anyị ohu.—Ọrụ 20:19.