Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb14 p. 14-17
  • E Ji JW.ORG Ezi “Mba Niile” Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Ji JW.ORG Ezi “Mba Niile” Ozi Ọma
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Na-abara ma Anyị ma Ndị Ọzọ Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Jiri jw.org Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma—“Bụrụ Enyi Jehova”
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Jiri Isiokwu Bụ́ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara” nke Dị na jw.org Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka
    Teta!—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
yb14 p. 14-17

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

E Ji JW.ORG Ezi “Mba Niile” Ozi Ọma

Jizọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:14) N’obere oge a fọrọnụ tupu Jehova ebibie ụwa Setan, ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ jw.org, na-enyere anyị aka izi ndị nọ ná “mba niile” ozi ọma.

E nwere di na nwunye bụ ndị ozi ala ọzọ na Sọlọmọn Aịlandz. Otu ụbọchị, ha gara ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-akụ azụ̀ n’otu ime obodo. Ha hụrụ ụmụ nwoke anọ jicha ekwentị. Ha jụrụ ha ma hà na-eji ekwentị ha aga n’Ịntanet, ha asị ha “ee.” Ha gosizie ha otú e si aga na jw.org, otú ha ga-esi chọta asụsụ ha, otú ha ga-esi danloduo magazin na Baịbụl, otú ha ga-esi gaa n’ebe kwuru banyere ihe ga-enyere ezinụlọ aka nakwa ebe kwuru maka ụmụaka. Di na nwunye a gaa ozi ọma hụ ụmụaka, ha na-egosi ha vidio ụmụaka bụ́ Na-ekpe Ekpere Mgbe Niile. E nwere mgbe ha gosichara ya ụfọdụ ụmụaka, ha agbara ọsọ gụrụ egwú ahụ lawa.

Ulanbatọọ dị na Mọngolịa

Ọtụtụ ndị edetarala isi ụlọ ọrụ anyị dị na Niu Yọk akwụkwọ ozi ekele maka ihe ndị dị na jw.org. Lee ụfọdụ n’ime ha:

“Mụ na di m kwagara Meksiko ọhụrụ, anyị na-amụkwa asụsụ Spanish ka anyị nwee ike ịna-eji ya ezi ndị mmadụ ozi ọma. E nwere ma magazin, ma akwụkwọ dị iche iche, ma abụ, ma ihe nkiri dị n’asụsụ dị iche iche na jw.org. M na-ekele Jehova maka na mgbe ọ bụla m gara ebe ahụ, m na-ahụ ihe na-enyere anyị aka ịmụta asụsụ Spanish. Obi dị m ezigbo ụtọ maka mbọ niile unu na-agba.”—D.H., Meksiko.

“Ekpuru m ìsì ma, obi na-adị m ụtọ ịga jw.org maka na e nwere ọtụtụ ihe m na-egere n’ebe ahụ. Biko, na-etinyenụ ma akwụkwọ unu ma broshọ unu ma ihe ndị ọzọ unu biri n’akwụkwọ n’ebe m ga-enwe ike na-egere ha.”—K.G., Amerịka.

“Jw.org enweghị oyiri. O meela ka m na-amụchi ihe anya, na-agachikwa ozi ọma anya. Adị m iri afọ asaa na abụọ, o ruola iri afọ anọ na asaa m mere baptizim, ọ karịakwala iri afọ atọ m sụwara ụzọ. Amụrụ m ụmụ itoolu, nwee ụmụ ụmụ iri na isii na ụmụ ụmụ ụmụ atọ. Ụfọdụ n’ime ụmụ m, ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. M na-ekele Jehova maka otú o si jiri jw.org na-enye anyị nri n’oge kwesịrị ekwesị.”—M.T., Amerịka.

“Ihe na-akụ mgbe m dere akwụkwọ ozi a bụ elekere anọ nke isi ụtụtụ. Ọrịa m na-arịa anaghị ekwe m hie ụra abalị nke ọma. Ama m na ụdị ihe a na-eme m na-emekwa ọtụtụ ụmụnna anyị n’ụwa niile. M na-ekele Jehova maka na ọ na-enye anyị niile ihe na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. M na-aka aghọta ihe e sere ese. N’ihi ya, otú e si mee jw.org na-enyere m nnọọ aka. Obi dị m ezigbo ụtọ maka ọtụtụ ihe ndị e sere ebe ahụ, nakwa vidio dị iche iche dị na ya. Ha na-eme ka m na-aghọta ihe a na-ekwu.”—B.B., Niu Ziland.

“Unu emeela nke ukwuu maka jw.org. M na-arụ n’ime ime obodo dị na Siri Lanka ebe m na-anaghị enweta magazin n’asụsụ ndị obodo anyị. Ma m na-aga jw.org danloduo ihe ọ bụla m chọrọ n’asụsụ m. Jw.org so n’onyinye pụrụ iche Jehova nyere ndị dị ka m.”—N.F., Siri Lanka.

“M na-ekele unu maka mbọ unu na-agba iji nyere ndị mmadụ aka ịmara Jehova. Biko, unu akwụsịkwala itinye vidio na jw.org. Vidio ndị ahụ enyerela mụ na ụmụnne m aka. Vidio kacha nyere m aka bụ nke kwuru ihe mmadụ ga-eme ma e nwee ndị na-achọ ya okwu. Unu agbalịala.”—Y.S., ọ dị afọ itoolu. O si Amerịka.

“M na-ekele Jehova maka nri ime mmụọ unu na-enye anyị. Ebe na-ekwu banyere ndị na-eto eto na jw.org enyerela m aka. Ihe ndị dịkwa n’ebe e dere Bụrụ Enyi Jehova na-atọkwa m ụtọ. Ụmụnne m ndị nwaanyị atọ ka dị obere, ihe ndị ahụ na-enyekwara ha aka ịna-akpa ezigbo àgwà. N’agbanyeghị na obodo anyị dị anya n’ebe unu nọ, anyị niile bụ ụmụnna n’ihi na anyị ma na Jehova hụrụ anyị n’anya. Jidenụ ka unu ji.”—A.B., Peruu.

Otú Ihe Si Na-aga na JW.ORG

  • Asụsụ ole ị ga-achọta ihe n’ebe ahụ: 316

  • Peeji ole i nwere ike imeghe karịrị: 220,000

  • Asụsụ ole i nwere ike ịdanlodu akwụkwọ anyị: 600

  • Mmadụ ole si ihe karịrị narị obodo abụọ na iri atọ na-agwa anyị kwa ụbọchị ka anyị bịa mụwara ha Baịbụl: 130

  • Vidio ole ndị mmadụ na-ele kwa ọnwa karịrị: Nde 5

  • Ihe ndị mmadụ na-adanlodu kwa ụbọchị: Nde 1.5

  • Ndị si ihe karịrị narị obodo abụọ na iri atọ aga na ya karịrị: 900,000

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya