Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Na-abara ma Anyị ma Ndị Ọzọ Uru
Jizọs gwara anyị ka anyị kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke “n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” (Mat. 24:14) N’ihi ya, anyị ejikọtala watchtower.org, jw-media.org, na jw.org ka ha bụrụ otu. Aha a na-akpọzi ya bụ jw.org. Ihe mere anyị ji jikọta ha bụ ka o nyere anyị aka ‘ijezu ozi anyị.’—2 Tim. 4:5.
“N’elu Ụwa Dum Mmadụ Bi”: E kee mmadụ niile bi n’ụwa ụzọ atọ, ihe dị ka otu ụzọ n’ime ha na-aga Ịntanet. Ọ bụ ebe ahụ ka ọtụtụ ndị, nke ka nke ndị na-eto eto, na-aga amata ihe na-aga n’ụwa. Ọ bụrụ na ndị mmadụ agaa ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet, ha na-ahụ ajụjụ dị iche iche ndị mmadụ na-ajụ na otú e si jiri Baịbụl zaa ha. Ọ na-eme ka ha matakwuo ọgbakọ Ndịàmà Jehova, meekwa ka ọ dịrị ha mfe ikwu ka a bịa mụwara ha Baịbụl. Ọ na-emekwa ka ozi ọma Alaeze Chineke ruo n’ebe anyị na-enweghị ike iru.
“Mba Niile”: E kwesịrị ibipụta akwụkwọ anyị ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ n’ihi na ọ ga-eme ka anyị kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke ná “mba niile.” Ọ bụrụ na ndị mmadụ agaa na jw.org, ọ ga-adịrị ha mfe ịhụ ihe ha na-achọ n’ihi na ihe ndị anyị dewere ebe ahụ dị n’ihe ruru narị asụsụ anọ.
Na-aga na Ya: Ihe mere e ji rụgharịa jw.org abụghị naanị ka e jiri ya na-ezi ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ozi ọma. E bukwa ụmụnna anyị n’obi wepụta ya n’ihi na anyị chọrọ ka ha na-agakwa na ya. Ọ bụrụ na ị na-aga n’Ịntanet, gbalịa na-aga na jw.org. N’okpuru ebe a, anyị kwuru otú ị ga-esi gaa na ya.
[Ihe Osise dị na peeji nke 3]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Megodị Ihe A
1 N’ebe ahụ a na-edenye adres Ịntanet na kọmputa ma ọ bụ n’ekwentị, dee www.jw.org.
2 Ya mepee, pịa otu n’ime ihe ndị e dere ná mgbago mgbago ma ọ bụkwanụ ndị nke e dere na peeji o mepeere gị.
3 Ọ bụrụ na i nwere kọmputa, ekwentị ma ọ bụ ngwá elektrọniks ọzọ nwere Ịntanet, gbalịa jiri ya gaa na jw.org. Anyị rụrụ ya otú ọ ga-adị mfe iji ngwá elektrọniks ọ bụla na-aba n’Ịntanet gaa na ya. Ma ì ji kọmputa ma ì ji ngwa elektrọniks ọ bụla ọzọ gaa na ya, ọ bụ otu ụdị ihe ka ị ga-ahụ.