Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Nyere Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Aka
Gosi Ha Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet: Ị hụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ, gosi ha otú ha nwere ike isi hụ asụsụ ha n’ebe ahụ e dere “Asụsụ Ị Chọrọ.” (O nwere ihe ndị a na-etinyebeghị n’asụsụ ụfọdụ.)
Gosi Ha Ebe Ha Ga-ahụ Asụsụ Ha n’Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet: Gaa na jw.org mepee otu peeji akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ọ bụ traktị bụ́ Ịma nke Bụ́ Eziokwu. Gazie n’ebe ahụ e dere “Gụọ nke” họrọ asụsụ onye ahụ na-asụ.
Kpọnyere Ya Otu Isiokwu Gbara n’Akwụkwọ Anyị: Chọọ ma è nwere isiokwu onye ahụ nwere ike igere egere n’asụsụ ya. Ọ bụrụ na e nwere, kpọnyere ya isiokwu ahụ. Ọ bụrụkwa na ị na-amụ asụsụ ọzọ, ị kpọnye akwụkwọ anyị dị n’asụsụ ahụ ị na-amụ, ọ ga-enyere gị aka. Ị chọọ ịhụ ha ma ị gaa na jw.org, pịa n’ebe e dere “Ihe Anyị Nwere.” Ya mepee, gị apịa ebe e dere “Akwụkwọ na Broshọ” ma ọ bụkwanụ ebe e dere “Magazin.”
Jiri Ya Zie Ndị Ogbi Ozi Ọma: Ị hụ onye ogbi, i nwere ike ịkpọnyere ya otu isiakwụkwọ Baịbụl dị n’asụsụ ndị ogbi. Ma ọ bụkwanụ gị akpọnyere ya otu isiokwu dị n’akwụkwọ anyị, broshọ, ma ọ bụ traktị ma ọ bụrụ na e nwere ya n’asụsụ ndị ogbi nke ọ na-aghọta. Ị chọọ ịhụ ya ma ị gaa na jw.org, pịa n’ebe e dere “Ihe Anyị Nwere.” Ya mepee, gị apịa ebe e dere “Asụsụ Ndị Ogbi.”
[Ihe Osise dị na peeji nke 6]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Megodị Ihe A
1 Pịa ebe a ▸ ka i gere akwụkwọ a na-egere egere (ma ọ bụrụ na ọ dị n’asụsụ Igbo). Ma ọ bụkwanụ gị apịa otu n’ime ihe ndị dị ebe ahụ e dere “Nke Ị Chọrọ Ịdanlodu” ka i nwee ike were ya.
2 Gaa n’ebe e dere “Gụọ nke” họrọ asụsụ ị chọrọ ka o gosi gị peeji a na ya.
3 Pịa “Gaa n’Ọzọ” ma ọ bụkwanụ isiokwu ọ bụla dị n’ebe ahụ e dere “Isiokwu Ndị Dị n’Ime Ya” ka o mepeere gị isiokwu ahụ.