Otu Ụzọ Isi Nyere Ha Aka
Ezi Ndị Kraịst na-ekere òkè n’ozi a na-eje maka ọha nke bụ́ ikwusa ozi ọma. (Fil. 2:17) Iji mezuo nke a, e tinyewo broshuọ, traktị, na isiokwu ndị bụ́ isi dị n’asụsụ 20 n’adres bụ́ www.watchtower.org bụ́ ebe anyị na-edebe ihe ọmụma n’Intanet. E meghị ebe a a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet iji kesaara Ndịàmà Jehova akwụkwọ ndị ọhụrụ. Ebumnobi e ji mepee ya bụ iji mee ka ọha na eze nweta ihe ọmụma bụ́ eziokwu banyere ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi site na Bible.
Na nso nso a, e nweela ihe gbara ọkpụrụkpụ e tinyekwuru n’ebe anyị na-edebe ihe ọmụma n’Intanet. Ọ bụ broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? n’ihe karịrị asụsụ 220. Ọzọkwa, malite ná mbipụta nke January 1 nakwa January 8, 2004, a malitere ide adres ebe anyị na-edebe ihe ọmụma n’Intanet na peeji ikpeazụ nke Ụlọ Nche na Teta! n’asụsụ nile.
Olee otú ị pụrụ isi jiri ngwá ọrụ a mee ihe? Ị pụrụ izute onye o yiri ka ò nwere mmasị ma ya abụrụ na ọ na-aghọta nanị asụsụ ọzọ. Ọ bụrụ na o nwere ike ịga n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet, ị pụrụ igosi ya adres ahụ dị na peeji ikpeazụ nke Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! N’ụzọ dị otú ahụ, ọ pụrụ ịgụ broshuọ Na-achọ n’asụsụ nke ya ruo mgbe ị ga-ewetara ya akwụkwọ n’asụsụ ya. Ma ọ bụ, ị pụrụ ime ka ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè na-asụ asụsụ onye ahụ na-asụ mara banyere onye ahụ.