Ozi Ọma n’Internet
N’ọgbọ nkà na ụzụ anyị, ụfọdụ ndị na-enweta ihe ọmụma site ná ngwá electronic, gụnyere Internet. Ya mere Society etinyewo n’Internet ihe ọmụma ụfọdụ ziri ezi banyere nkwenkwe na ọrụ Ndịàmà Jehova.
Ógbè Njikọ Internet anyị nwere adres bụ́ http://www.watchtower.org, nweekwa ụdị traktị, broshuọ, na isiokwu Ụlọ Nche na Teta! dị iche iche na Bekee, Chinese (E mere ka ọ dị mfe), German, Russian, na Spanish, nakwa n’asụsụ ndị ọzọ. A nọworị na-enweta mbipụta ndị dị n’ógbè Njikọ a site n’ọgbakọ, a na-ejikwa ha eme ihe n’ozi. Nzube nke ógbè Njikọ anyị bụ, ọ bụghị iwepụta mbipụta ndị ọhụrụ, kama ime ka ọha mmadụ nweta ihe ọmụma n’usoro electronic. Ọ dịghị mkpa ka onye ọ bụla kwadebe ihe ọmụma maka Internet banyere Ndịàmà Jehova, ọrụ anyị, ma ọ bụ nkwenkwe anyị. Ógbè anyị kwadoro na-enye ihe ọmụma ziri ezi maka onye ọ bụla chọrọ ya.
Ọ bụ ezie na ógbè anyị enweghị ohere maka ozi electronic (E-mail), o nwere ndepụta adres post ọfịs nke alaka dị iche iche gburugburu ụwa. Ya mere ndị mmadụ pụrụ ideta akwụkwọ iji nwetakwuo ihe ọmụma ma ọ bụ iji nweta enyemaka onwe onye site n’aka Ndịàmà n’ógbè ha. Alala azụ iso onye ọ bụla nwere ike ịchọ ịmalite ịmụ eziokwu Bible site n’usoro a kerịta adres Internet dị n’elu.