Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb16 p. 112-p. 113 para. 8
  • Onye Ọsụ Ụzọ Na-anaghị Atụ Egwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Ọsụ Ụzọ Na-anaghị Atụ Egwu
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MMADỤ Ò NWERE IKE Ịkwụwa Aka Ọtọ N’ỤWA A NRỤRỤ AKA JURU?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ọchịchọ Ha Na-achọ Ezi Okpukpe Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Gịnị Ga-eme Ka Ndụ Anyị Baa Ezigbo Uru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Okwu Chineke Na-arụ “Ọrụ Ebube”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
yb16 p. 112-p. 113 para. 8

INDONESHIA

Onye Ọsụ Ụzọ Na-anaghị Atụ Egwu

André Elias

  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1915

  • MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1940

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụ ọsụ ụzọ obi kara nke kwụsiri ike n’okwukwe ya mgbe a na-agba ya ajụjụ na mgbe e yiri ya egwu ọnwụ.

Nwanna André Elias

N’OGE a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, Nwanna Elias na nwunye ya Josephine bịara n’isi ụlọ ọrụ ndị amị Japan zara ọnụ ha. A na-eze ndị amị Japan a eze. A na-akpọkwa ha ndị Kempeitai. Isi ụlọ ọrụ ha dị na Sukabumi, dị́ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Java. Ọ bụ Nwanna André ka ha bu ụzọ gbaa ajụjụ. Ha jụkara ya ajụjụ ahụ́. Ha jụrụ ya, sị: “Ole ndị bụ Ndịàmà Jehova? Ùnu na-agba ọchịchị Japan ụkwụ? Ùnu bụ ndị nledo?”

Nwanna André zara ha, sị: “Anyị bụ ndị ohu Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. O nweghịkwa ihe anyị mere.” Onyeisi ndị amị ahụ mịịrị mma agha e konyere n’ahụ́ ájá ma welie ya elu.

O ji iwe jụọ Nwanna André, sị: “Ị̀ ma na m nwere ike igbu gị ugbu a?” Nwanna André kpunyere ihu na tebụl ma kpee ekpere n’obi ya. Mgbe onyeisi ndị amị ahụ gbachara nkịtị ruo ogologo oge, ọ dapụrụ n’ọchị ma sị: “Ị bụ dimkpa!” Mgbe ahụ, ọ kpọziri nwunye ya Josephine ma gbaa ya ajụjụ. Mgbe ọ chọpụtara na ihe André na nwunye ya zara bụ otu, o ji olu ike kwuo, sị: “Unu abụghị ndị nledo. Sinụ ebe a pụọ!”

Mgbe ọtụtụ ọnwa gachara, “ụmụnna ụgha” gara gwa ndị ọchịchị na Nwanna André bụ onye ọjọọ. N’ihi ya, e jidere ya ma tụọ ya mkpọrọ. (2 Kọr. 11:26) Ruo ọtụtụ ọnwa, ihe ọ na-eri bụ nri ọ tụụtara na gọta dị n’ụlọ mkpọrọ. Ma, ndị ahụ tụrụ ya mkpọrọ emelighị ka ọ dapụ n’okwukwe. Mgbe nwunye ya bịara leta ya, o si n’ebe ahụ a tụrụ ya mkpọrọ takwunyere ya, sị: “Echegbula onwe gị. Ma hà gburu m ma hà hapụrụ m, agaghị m ahapụ Jehova. Ha nwere ike igbu m, ma ha agaghị emeli ka m gọnahụ Jehova.”

Mgbe Nwanna André nọchara ọnwa isii n’ụlọ mkpọrọ, ọ wụchara n’ụlọikpe dị na Jakata zara ọnụ ya. A tọhapụkwara ya.

Mgbe ihe dị ka afọ iri atọ gachara, n’oge gọọmenti Indoneshia machibidoro Ndịàmà Jehova iwu ọzọ, ọkàiwu nọ n’obodo Manado, dị́ n’Ebe Ugwu Sulawesi, gwara Nwanna André ka ọ bịa n’ọfis ya. Mgbe ọ bịara, ọ jụrụ ya, sị: “Ị̀ ma na a machibidola Ndịàmà Jehova iwu?”

Nwanna André zara ya na ya ma.

Ọ jụziri Nwanna André, sị: “Ì jikerela ugbu a ịgbanwe okpukpe gị?”

Nwanna André kụrụ aka n’obi ma si ya, “I nwere ike ịdọpụta obi m. Ma ị gaghị emeli ka m gbanwee okpukpe m.”

Ọkàiwu ahụ gwara Nwanna André lawa. O nyeghịkwa ya nsogbu ọzọ.

Nwanna André nwụrụ n’afọ 2000, mgbe ọ gbara afọ iri asatọ na ise. O ji obi ya niile sụọ ụzọ afọ iri isii.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya