Ọchịchọ Ha Na-achọ Ezi Okpukpe Ahụ
KEMGBE ha bụ ụmụaka ụfọdụ ndị anọwo na-achọ azịza na-eju afọ nye ajụjụ ha dị iche iche banyere ndụ. Mgbe ha na na-eto eto, ha pụrụ ijeworị ihe omume dị iche iche nke okpukpe. Ma ọtụtụ n’ime ha chọpụtara na ma azịza e nyere ha ma usoro mmeghachi ihe omume efu nke chọọchị adịghị nke nyeere ha aka n’ezie ịnagide nsogbu nile nke ndụ.
Ha pụrụ ikwu na ha ka nọ n’okpukpe nke ndị mụrụ ha, ọ bụ ezie na ha adịghị ejekebe ihe omume okpukpe. Dị ka otu bishọp nke Church of England si kwuo, okwukwe ha bụ nanị ụfọ okwukwe. Ha etinyewo okpukpe n’ụsọ ekwu. Ndị ọzọ n’ịbụ ndị kpọrọ omume ihu abụọ nke ha na-ahụ n’okpukpe asị, ajụwo okpukpe kpam kpam. Ma, ajụjụ ha banyere ndụ ka nọgidere na-adị.
Ihe Mere Ụfọdụ Ji Enwe Obi Abụọ Siri ke
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ maara na chọọchị dị iche iche nwere ngalaba dị iche iche iji nyere ndị na-enweghị ebe obibi aka, ikesara ndị nọ ná mkpa nri, na ịkwado ihe omume ọdịnala dị iche iche. Ma ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị ha na-anụkwa akụkọ ụwa nke ime ihe ike na nkwafu ọbara ndị gbanyere mkpọrọgwụ n’okpukpe ọ bụghị nanị n’etiti ndị na-abụghị ndị Kraịst kamakwa n’etiti ndị ahụ na-akpọ onwe ndị Kraịst. Ò kwesịrị iju anyị anya ma ọ bụrụ na ha nwee obi abụọ na òtù ndị aka ha dị n’ime ihe ike dị otú ahụ na-ekpe ezi okpukpe ahụ?
Ọtụtụ ndị e ji okpukpe zụlite na-eche na mbụ na ebe obibi nke ndị na-enweghị nne ma ọ bụ nna nke chọọchị dị iche iche na-akwado bụ ihe ọma. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ike agwụwo ha ka ndị ụkọchukwu site n’otu ebe ruo ebe ọzọ bụ ndị a na-ebo ebubo ịmetọ ụmụntakịrị enyere ha ịlekọta n’ụzọ mmekọahụ. Ná mmalite ndị mmadụ chere na ọ bụ ndị ụkọchukwu ole na ole ka aka ha dị na ya. Ugbu a ụfọdụ n’ime ha na-eche ma ọ̀ dị ihe dị njọ kpọmkwem na chọọchị ahụ n’onwe ya.
Ole na ole n’ime ha dị ka Eugenia, nwere mgbe ha mikpuru onwe ha nke ukwuu n’okpukpe ha. Dị ka onye na-eto eto n’Argentina, o so na ndị mere njem gaa ala nsọ ije fee Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke nke Itatí. O biri n’ebe obibi ndị nọn ruo afọ 14 dị ka nọn. Mgbe ahụ ọ hapụrụ iji ghọọ akụkụ nke òtù okpukpe nke bụkwa n’otu mgbe ahụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke na-ekwu ka e nwee oké mgbanwe ozugbo n’usoro ọha mmadụ na nke akụ na ụba nke ọha na eze site n’inwe oké nhazigharị ihe. N’ihi ihe ọ hụrụ ma nweekwa mmetụta ya, o nwekwaghị okwukwe na Chineke. Ọ dịghị achọ n’ezie okpukpe nke ọ pụrụ ikwenye na ya. Ihe ọ na-achọ bụ ụzọ isi wetara ndị ogbenye ikpe ziri ezi—ee, na enyi ọ pụrụ ịtụkwasị obi.
Ndị ọzọ chọpụtara ihe na-eme na chọọchị dị iche iche wee gbaara ha ọsọ. Otu onye na-ekweghị na Chineke nke e bipụtara echiche ya na 1991 na magazin bụ́ Sputnik kwuru n’obi eziokwu, sị: “Apụghị m ịhụ oké ọdịiche dị n’ọdịdị nke ịgọ mmụọ na nkwenkwe ụgha nke Iso Ụzọ Kraịst.” Dị ka ihe atụ, ọ kọwara otu ngagharị okpukpe nke ndị ụkọchukwu ndị yi uwe nwụda e ji ọlaedo chọọ mma ji nwayọọ buru otu igbe ozu nke ozu a gbasiri agbasi dị n’ime ya na-aga n’okporo ama nile nke Moscow. Ọ bụ ozu nke “otu onye nsọ bụ onye Kraịst nke chọọchị Orthodox” nke e bu site n’ebe ndebe ihe mgbe ochie na-aga n’ụlọ chọọchị, o chetakwaara onye edemede ahụ banyere ndị ụkọchukwu na ozu ndị a gbasiri agbasi n’Ijipt oge ochie. O chetaghachiri na dị ebe ndị ahụ na-ekere òkè ná ngagharị ahụ na Moscow kwetara na “Atọ n’Ime Otu Ndị Kraịst,” ndị Ijipt efewokwa chi atọ dị iche iche—Osiris, Isis, na Horus.
Otu onye edemede ahụ zoro aka n’echiche ndị Kraịst nke ịhụnanya—“Chineke bụ ịhụnanya,” nakwa “hụ onye agbata obi gị n’anya”—dị ka nke na-enweghị nke ya na ya yiri n’Ijipt ahụ na-agọ mmụọ. Ma o kwuru, sị: “Ịhụnanya ụmụnna akụwo afọ n’ala n’ime ụwa, ọbụna n’akụkụ ahụ nke na-akpọ onwe ya akụkụ ụwa bụ ndị Kraịst.” O kwukwara banyere mkpụrụ ọjọọ ndị siworo n’ọnwụ chọọchị siri ịnọgide na-etinye aka n’ihe omume Obodo pụta. Ihe ndị ọ hụrụ akpalighị ya iche na chọọchị nile nke Krisendọm nyere ihe ọ na-achọ.
N’ụzọ dị iche na nke a, ndị ọzọ achọtawo azịza ndị na-eju afọ ma ọ bụghị na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm.
Ọ Mụtara Eziokwu Banyere Ndị Nwụrụ Anwụ
Magdalena, onye dị 37 afọ ugbu a bi na Bulgaria. Ka nna di ya nwụsịrị na 1991, ike ụwa gwụrụ ya. Ọ jụghachiri onwe ya ugboro ugboro, sị, ‘Olee ebe ndị nwụrụ anwụ na-eje? Olee ebe nna di m nọ?’ Ọ gara chọọchị, o kpekwara ekpere n’ihu ihe oyiyi dị n’ụlọ, ma o nwetaghị azịza ọ bụla.
O ruo otu ụbọchị, otu onye agbata obi ya kpọrọ ya na fon ịbịa n’ụlọ ya. Otu nwa okorobịa so Ndịàmà Jehova na-amụ ihe na-abịa ileta onye agbata obi ahụ. O gere ntị ka nwa okorobịa ahụ na-ekwu banyere Alaeze Chineke na nzube Ya ime ụwa ka ọ ghọọ paradaịs ebe ndị mmadụ pụrụ ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’obi ụtọ. Akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala tọgbọrọ n’elu table. Site n’iji ya mee ihe, nwa okorobịa ahụ dọọrọ mmasị ya gaa n’ihe ahụ e dere na Bible n’Eklisiastis 9:5, nke na-asị: “Ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” N’uhuruchi ahụ ọ gụkwuru ya. Ọ mụtara na ndị nwụrụ anwụ ejeghị ná ndụ ọzọ n’eluigwe ma ọ bụ na hell; ha amaghị ihe ọ bụla, dị ka ha nọ n’oké ụra. O ji obi ụtọ nakwere okù a kpọrọ ya ịbịa nzukọ nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ. Mgbe nzukọ ahụ gasịrị, o kwetara ịdị na-enwe ọmụmụ Bible chiri anya. Ebe ọ hụworo otú e si kpegara Jehova ekpere na nzukọ ahụ, ọ malitekwara ikpegara Jehova ekpere n’imeri otu adịghị ike gbamiri mkpọrọgwụ o nwere. Mgbe a zara ekpere ya, ọ matara na ya achọtawo ezi okpukpe ahụ.
Ha Chọtara Ndụ nke Nwere Nzube
André tolitere n’ezinụlọ ji Katọlik kpọrọ ihe na Belgium ma jeekwa ozi dị ka onye na-enyere ụkọchukwu ógbè ahụ aka. Otú ọ dị, n’oge ahụ, ọ hụrụ ihe ndị mere ka ọ gharakwa inwe nkwanye ùgwù maka chọọchị. N’ihi nke ahụ, ọ bụ onye Katọlik nanị n’aha.
Ruo afọ 15 o ji ịgba bọl mere aka ọrụ. N’otu mgbe, mgbe òtù egwuregwu ya sọrọ mpi n’Itali, a kpọrọ ha okú ịbịa gee popu ntị. Ọ dịghị ihe ọ bụla na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ ná nleta ahụ, akụ na ụba ụwa ndị gbakwara popu ahụ gburugburu were André iwe. Obi abụọ ndị o nwere banyere chọochị ahụ dịwanyere omimi. Obi ụtọ adịghị ná ndụ nke onwe ya n’ihi alụmdị na nwunye abụọ dakpọrọ adakpọ. Ọnọdụ ụwa mere ka o nwee nkụda aka. Na 1989 o dere n’akwụkwọ o ji edetu ihe, sị: ‘Gịnị ka ihe nzuzu nile na-eme na gburugburu anyị pụtara?’ Ọ chọtaghị azịza ọ bụla site n’okpukpe ya.
Na 1990, mgbe André na-arụ ọrụ dị ka onye nkụzi egwuregwu ịgba bọl na Iceland, Iiris, bụ́ onye ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya. Ọ nakwaara akwụkwọ ma gwaa onye ozi ala ọzọ ahụ ka ọ laghachi. Ya na di ya, Kjell laghachịrị. Mgbe ha mesịrị nwee ike isoro André nọdụ ala wee kwurịta okwu, o doro anya na o nwere mmasị dị ukwuu ịghọta Bible. Nwunye ya bụ Ásta sooro ya kerịta ihe ọ na-amụ. N’etiti ụbọchị, ọ na-enwe hour atọ nke oge izurụtụ ike n’agbata ọrụ ịkụzi bọl nke ụtụtụ na nke uhuruchi, ha kpebikwara iji oge ahụ na-eme ihe maka ọmụmụ Bible. “M na-enwe ume ọhụrụ n’ịmụ Bible karị n’izu nnọọ ike efu,” ka ọ sịrị. Nke nta nke nta Bible zara ajụjụ ha. Nwayọọ nwayọọ okwukwe ha n’ebe Jehova na Alaeze ya dị toro. Nkwa dị ebube nke Bible banyere ụwa ọhụrụ nke udo, ụwa nke ‘ihe nzuzu nile na-emenụ’ na-adịghị n’ime ya ghọrọ ihe pụrụ ikwe omume nye ha. Ma André ma Ásta so ndị ọzọ ugbu a na-ekerịta okwukwe ọhụrụ ha.
Magdalena, André, na Ásta na-enwe obi ike na ha mesịrị chọta ezi okpukpe ahụ. Eugenia kwa, ka ọ gbalịsịrị idozi nsogbu ụwa site na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mesịrị chọta n’etiti Ndịàmà Jehova okpukpe nke yiri ya ka ọ bụ nke ziri ezi. Ma gịnị n’ezie na-ekpebi ma okpukpe ọ̀ bụ nke ziri ezi? Biko lee isiokwu na-esonụ.
[Foto dị na peeji nke 7]
Isoro Ndịàmà Jehova na-amụchi Bible anya na-enyere ihe karịrị nde mmadụ ise aka n’ọchịchọ ha na-achọ azịza ndị na-eju afọ