INDONESHIA
Abụbu M Onyeisi Ndị Omempụ, Ma Abụzi M Ezigbo Nwa Amaala
Hisar Sormin
A MỤRỤ YA N’AFỌ 1911
E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1952
ONYE Ọ BỤ Ọ bụbu onyeisi ndị omempụ. Ma o mechara soro na Kọmitii Alaka.
O NWERE ụbọchị otu onye ọrụ gọọmenti ọnụ na-eru n’okwu kpọrọ m ka m bịa n’ọfis ọkàikpe ukwu nke Indoneshia.
Mgbe m bịara, ọ gwara m, sị: “Ị bụ onye Indoneshia. N’ihi ya, gwa m eziokwu. Gịnị n’eziokwu ka Ndịàmà Jehova na-eme n’obodo a?”
Nwanna Sormin gwara ya, sị: “Ka m kọọrọ gị banyere onwe m. M bụbu onyeisi ndị omempụ. Ma ugbu a, m na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ọ bụ ya ka Ndịàmà Jehova na-eme n’obodo anyị a. Ha na-enyere ndị ọjọọ dị ka mụ aka ka ha ghọọ ezigbo ụmụ amaala.”
Onye ọrụ gọọmenti ahụ mechara kwuo, sị: “M nụla ọtụtụ mkpesa banyere Ndịàmà Jehova. Ma, ama m na ọ bụ ezigbo chọọchị n’ihi na o nyeere Maazi Sormin aka ịgbanwe.”