Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb16 p. 170-p. 171 para. 7
  • Mụ na Nwanne M Mechara Mata

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mụ na Nwanne M Mechara Mata
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe Iwe Na-ewe Anyị n’Ihi na Anyị ‘Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Mee Mkpesa’
    Lọghachikwute Jehova
  • “Ahụtụbeghị M Ndị Agbata Obi Dị Ka Unu”
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
  • Mgbe Ezigbo Ọrịa Ji Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Dara Ogbi Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
yb16 p. 170-p. 171 para. 7
Ndị a bụ Linda na Sally Ong

INDONESHIA

Mụ na Nwanne M Mechara Mata

Akụkọ Linda Ong na nwanne ya Sally kọrọ

Linda: Mgbe m dị afọ iri na abụọ, mama m gwara m na e nwere nwanne m nwaanyị m tọrọ a kpọnyere ndị ọzọ ka ha jiri ya mere nwa. M nọ na-eche ma ọ̀ dakwara ogbi ka mụnwa. Amaghịkwa m onye ọ bụ n’oge m na-eto.

Sally: Amaghị m na ọ bụghị ndị mụ na ha bi mụrụ m. Nwaanyị mụ na ya bi m chere na ọ bụ mama m na-akụ m ezigbo ihe. Ọ na-emekwa m ka m̀ bụ ohu. Nke a mere na obi anaghị adị m mma, owu na-amakwa m, tinyere na m dara ogbi. Ọ bụ mgbe ihe ndị a na-eme ka Ndịàmà Jehova bịara zie m ozi ọma, mụ na ha ebidokwa ịmụ Baịbụl. Mgbe nwaanyị ahụ mụ na ya bi matara, ọ pịara m belt, gbanweekwa ugodi ụzọ anyị. Nke a mere ka m tọ n’ime ụlọ. Mgbe m dị afọ iri abụọ, m si n’ụlọ gbapụ, Ndịàmà Jehova kpọbatara m n’ụlọ ha, mụ na ha ebiri. Ná mmalite afọ 2012, e mere m baptizim.

Linda: Mgbe m dị afọ iri abụọ, mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ka oge na-aga, m bidoro ịga mgbakọ distrikti na Jakata. A na-asụgharịrị ndị ogbi gara mgbakọ na Jakata okwu ndị a na-ekwu. Ọ bụ na mgbakọ ahụ ka m hụrụ ọtụtụ ndị ogbi ibe m, ma Sally. Sally bụ Onyeàmà Jehova bi n’Ebe Ugwu Sumatra. Mgbe m hụrụ ya, m chọpụtara na mụ na ya yiri, ma o nweghị ihe m ji nke ahụ kpọrọ.

Sally: Mụ na Linda bịara ghọọ ezigbo enyi. Obi m nọkwa na-agwa m na mụ na ya yiri, ma m wepụrụ ya n’obi m.

Linda: N’ọnwa Ọgọst afọ 2012, n’ụbọchị bọtara ụbọchị m mere baptizim, agụụ ịhụ nwanne m nwaanyị ahụ m na-achọ achọ bịara gụsiwe m ike. M rịọrọ Jehova, sị: “Biko mee ka m hụ nwanne m nwaanyị n’ihi na m chọrọ ịgwa ya onye ị bụ.” Obere oge m kpechara ekpere a, onye ma nwanne m nwaanyị ahụ ziteere mama m ozi n’ekwentị. Ọ bụ ihe a bụ ihe mbụ merenụ tupu mụ amata na Sally bụ nwanne m.

Sally: Mgbe Linda gwara m na m bụ nwanne ya nwaanyị ọ na-achọ achọ, m banyere ụgbọelu ozugbo gaa Jakata ka mụ na ya hụ. Mgbe m pụtara n’ebe ndị na-eche nche n’ọdụ ụgbọelu nọ, m hụrụ Linda, hụ mama m na papa m, na nwanne m nwaanyị ọzọ tọrọ m ebe ha nọ na-eche m. Ahụ́ nọ na-ama m jijiji. Onye ọ bụla n’ime ha makụrụ m, susuo m ọnụ. Mama m ekweghị ahapụ m ahapụ. Anyị niile bewere ákwá. Mgbe papa m na mama m ji anya mmiri rịọ m ka m gbaghara ha maka ịkpọnye m onye ọzọ ka o were m mere nwa, anyị bekwuru ákwá ma makụọ ibe anyị ọzọ.

Linda: Ebe ọ bụ na otú e si zụọ m dị iche na otú e si zụọ Sally, anyị amụtala otú anyị ga-esi na-ebi n’udo n’agbanyeghị na àgwà anyị na otú anyị si eme ihe abụghị otu. Ma anyị hụrụ ibe anyị n’anya nke ukwuu.

Sally: Mụ na Linda bi ugbu a, anyị nọkwa n’otu ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na Jakata.

Linda: E kegara mụ na Sally ruo ihe karịrị afọ iri abụọ. Ma anyị na-ekele Jehova na anyị mechara mata.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya