Rọshịa Amalitela Ịlụso Yukren Agha
N’isi ụtụtụ abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Febụwarị afọ 2022, Rọshịa buuru agha bata Yukren n’agbanyeghị mbọ niile ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ụwa gbara ka a ghara ịlụ agha. Olee otú agha a ga-esi emetụta ụwa niile? Odeakwụkwọ Ukwu nke Òtù Mba Ụwa bụ́ António Guterres kwuru n’abalị ole na ole gara aga, sị: “Agha a ga-eme ka e nwee nnukwu ọgba aghara na Yurop nakwa n’ụwa niile, meekwa ka ọtụtụ mmadụ taa ahụhụ na-enweghị atụ.”
Olee ihe Baịbụl kwuru gbasara ụdị ihe a na-eme?
Jizọs Kraịst buru amụma “na mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.” (Matiu 24:7) Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?” ka ị hụ otú Baịbụl si mee ka o doo anya na agha ndị a na-alụ n’oge a na-emezu amụma ahụ Jizọs buru.
N’akwụkwọ Mkpughe, Baịbụl kwuru gbasara onye na-agba ịnyịnya “na-acha uhie uhie,” onye ‘wepụrụ udo n’ụwa.’ Ihe a o kwuru nọchiri anya agha dị iche iche a na-alụ n’ụwa. (Mkpughe 6:4) Ị chọọ ịchọpụta otú anyị si mara na amụma ahụ na-ekwu gbasara agha ndị a na-alụ taa, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?”
Amụma dị n’akwụkwọ Daniel kwuru gbasara agha “eze ugwu” na “eze ndịda” ga na-alụ. (Daniel 11:25-45) Ị chọọ ịmata otú anyị si mara na ọ bụ Rọshịa na mba ndị na-akwado ya bụ eze ugwu, lee vidio bụ́ Otú Amụma E Buru na Daniel Isi 11 Si Mezuo.a
Akwụkwọ Mkpughe kwukwara gbasara “agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke.” (Mkpughe 16:14, 16) Ma, agha a abụghị agha mba na mba na-alụ, ụdị nke a Rọshịa na Yukren na-alụ ugbu a. Ị chọọ ịghọtakwu gbasara agha a a ga-alụ n’ọdịnihu, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Agha Amagedọn?”
Olee ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu?
Baịbụl kwuru na Chineke ga-eme “ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.” (Abụ Ọma 46:9) Ị chọọ ịmatakwu gbasara otú ọdịnihu ahụ Chineke kwere anyị ná nkwa ga-adị, gụọ isiokwu bụ́ “Olileanya E Ji n’Aka na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu.”
Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. (Matiu 6:9, 10) Alaeze ahụ ga-adị n’eluigwe. Ọ ga-eme ka uche Chineke gbasara ụwa a mezuo. Otu n’ime ihe bụ́ uche Chineke gbasara ụwa a bụ ka udo dị na ya. Ị chọọ ịmata ihe ọma ndị Alaeze ahụ ga-emere gị, lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
E nwere ihe karịrị otu narị puku Ndịàmà Jehova na puku iri abụọ na itoolu (129,000) bi na Yukren. Ma hanwa ma Ndịàmà Jehova ndị bi na mba ndị ọzọ na-eme ka Jizọs. Ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha anaghịkwa alụ agha. (Jọn 18:36) N’ebe niile n’ụwa, Ndịàmà Jehova na-ekwusa “ozi ọma Alaeze Chineke,” na-agwa ndị mmadụ na ọ bụ ya ga-eme ka agha na ihe ndị ọzọ na-enye ndị mmadụ nsogbu kwụsị. (Matiu 24:14) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ gbasara ihe Baịbụl kwuru Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu, kpọtụrụ anyị.
a Ị chọọ ịmata ihe e kwuru gbasara amụma a n’ozuzu ya, gụọ isiokwu abụọ bụ́ “‘Ndị Bụ́ “Eze Ugwu” n’Oge Ikpeazụ” na “Ònye Bụ “Eze Ugwu” Taa?”