Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 79
  • Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Obi Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Obi Gị?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Alaeze Chineke Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mmadụ n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Alaeze Chineke
    Teta!—2013
  • Ihe Alaeze Chineke Pụrụ Ịpụta nye Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Ime Obi Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 79
Ebe e sere ahụ́ mmadụ. O nweghị otú alaeze ma ọ bụ ọchịchị ga-esi dịrị n’ime ya

Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Obi Gị?

Ihe Baịbụl kwuru

Mba. Alaeze Chineke abụghị ihe dị́ n’obi Ndị Kraịst, ọ bụghịkwa otú obi dị ha.a Baịbụl gosiri ebe alaeze ahụ dị mgbe o kwuru na ọ bụ “alaeze eluigwe.” (Matiu 4:​17) Ka anyị hụ otú Baịbụl si gosi na alaeze ahụ bụ ọchịchị nke ga-esi n’eluigwe na-achị.

  • Alaeze Chineke nwere iwu, nwee ndị ọ na-achị nakwa ndị ọchịchị. Ihe mere e ji nwee Alaeze Chineke bụ ka uche Chineke mezuo n’eluigwe nakwa n’ụwa.​—Matiu 6:​10; Mkpughe 5:​10.

  • Ọchịchị Chineke, ma ọ bụ Alaeze Chineke, ga-achị “ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche” n’ụwa. (Daniel 7:​13, 14) Ọ bụ Chineke nyere Alaeze a ike o ji achị, ọ bụghị ndị ọ na-achị.​—Abụ Ọma 2:​4-6; Aịzaya 9:7.

  • Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi na ha ga-eso ya ‘nọdụ ala n’ocheeze’ n’Alaeze Chineke.​—Luk 22:28, 30.

  • Alaeze Chineke nwere ndị iro. Ma, ọ ga-ebibi ha.​—Abụ Ọma 2:​1, 2, 8, 9; 110:​1, 2; 1 Ndị Kọrịnt 15:25, 26.

Baịbụl anaghị akụzi na Alaeze eluigwe dị n’obi ndị mmadụ ma si n’obi ha na-achị. Kama, ọ na-akụzi na “okwu banyere alaeze ahụ” ma ọ bụ ‘ozi ọma alaeze’ nwere ike iru anyị n’obi. O kwesịkwara ime otú ahụ ma gbanwee obi anyị.​—Matiu 13:19; 24:14.

Mgbe Jizọs kwuru na “alaeze Chineke dị n’etiti unu,” gịnị ka o bu n’obi?

Otú ụfọdụ ndị si akọwa ihe Jizọs kwuru na Luk 17:21 emeela ka ebe Alaeze Chineke dị gbagwojuo ụfọdụ ndị anya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị chere na ihe Jizọs kwuru pụtara na Alaeze Chineke dị n’obi ndị mmadụ. Ma, ka anyị lebagodị anya n’ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru n’oge ahụ. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe o bu n’obi.

Ụfọdụ ndị isi okpukpe ndị Juu bụ́ ndị na-achọghị iji anya ahụ Jizọs

Alaeze Chineke adịghị n’obi ndị Farisii obi tara mmiri bụ́ ndị kpara nkata ka ha gbuo Jizọs

N’oge ahụ, ọ bụ ndị Farisii ka Jizọs na-agwa okwu. Ndị Farisii bụ ndị isi okpukpe ndị Juu. Ha ejighị anya ahụ Jizọs, ha sokwa kpaa nkata ka e gbuo Jizọs. (Matiu 12:14; Luk 17:20) Ànyị kwesịrị ichewe na Alaeze Chineke ga-adị n’obi ndị ahụ obi ha kpọrọ nkụ? Jizọs gwara ha na ihe juru n’ime ha bụ ‘ihu abụọ na mmebi iwu.’​—Matiu 23:27, 28.

N’ihi ya, ihe Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru na “alaeze Chineke dị n’etiti” ndị Farisii bụ na yanwa, bụ́ Onye Chineke họpụtara ịbụ Eze alaeze ahụ, guzo n’ihu ha.​—Luk 1:​32, 33.

a E nwere ọtụtụ chọọchị ndị na-akụzi na Alaeze Chineke dị n’ime mmadụ ma ọ bụ n’ime obi mmadụ. Dị ka ihe atụ, Òtù Chọọchị Ndị Baptist E Nwere n’Amerịka kwuru na otu n’ime ihe bụ́ Alaeze Chineke bụ “Chineke ịchị n’obi mmadụ nakwa ná ndụ ya.” Poopu Benedict nke Iri na Isii kwukwara n’akwụkwọ ya bụ́ Jesus of Nazareth na “otú Alaeze Chineke si abịa bụ mmadụ iji obi ya na-ege [Chineke] ntị.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya