Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 9/13 p. 10-11
  • Alaeze Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Alaeze Chineke
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Alaeze Chineke ọ̀ dị n’obi ndị mmadụ?
  • Gịnị bụ Alaeze Chineke?
  • Ụmụ mmadụ hà nwere ike iweta Alaeze Chineke?
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Obi Gị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Eziokwu Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2013
g 9/13 p. 10-11

IHE BAỊBỤL KWURU

Alaeze Chineke

Alaeze Chineke ọ̀ dị n’obi ndị mmadụ?

“Ị nọghị alaeze Chineke ebe dị anya.”—Mak 12:34.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na Alaeze Chineke dị n’obi ndị mmadụ. E nwedịrị otu chọọchị na-akụzi na ọ bụrụ na mmadụ na-efe Chineke, ọ pụtara na Alaeze Chineke dị n’obi onye ahụ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Alaeze Chineke bụ ọchịchị si n’aka Chineke. O nwere eze, nweekwa ndị ọ na-achị. Ọ dịghị n’obi ndị na-efe Chineke. Baịbụl kwukwara na ọ ga-achị ụwa a.—Abụ Ọma 72:8; Daniel 7:14.

Na Luk isi iri na asaa amaokwu iri abụọ na otu, Jizọs sịrị, “alaeze Chineke dị n’ime unu.” (King James Version, nke Bekee) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? E nweghị otú Jizọs ga-esi kwuo na Alaeze Chineke dị n’obi ndị ahụ ọ na-agwa okwu. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Ọ bụ n’ihi na ndị ọ gwara ihe ahụ bụ ndị Farisii. Jizọs kwuru na ha agaghị eketa Alaeze Chineke n’ihi na ha bụ ndị ihu abụọ. (Matiu 23:13) Ọ bụ ya mere na ihe nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ dere n’amaokwu ahụ bụ Alaeze Chineke “dị n’etiti unu.” Ebe ọ bụ Jizọs ga-abụ eze nke Alaeze Chineke, o nwere ike ikwu otú ahụ n’ihi na o guzo n’ihu ha.—Luk 17:21.

Gịnị bụ Alaeze Chineke?

“Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” —Matiu 6:10.

IHE BAỊBỤL KWURU

Alaeze Chineke bụ ọchịchị si n’aka Chineke. Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ eze ya. (Matiu 28:18; 1 Timoti 6:14, 15) Alaeze a ga-eme ka e mee uche Chineke ma n’eluigwe ma n’ụwa. (Matiu 6:10) Mgbe Alaeze Chineke bịara, ihe niile na-akpatara ụmụ mmadụ nsogbu agaghịzi adị. Alaeze Chineke ga-eme ihe niile ọchịchị ụmụ mmadụ na-enweghị ike ime.

Mgbe Alaeze Chineke ga-abịa, ụwa ga-aghọ paradaịs, udo ga-adị n’ụwa, obi ga-erukwa mmadụ niile ala. (Abụ Ọma 46:9; Aịzaya 35:1; Maịka 4:4) Ọrịa agaghị adị, ọnwụ agaghị adịkwa. (Aịzaya 33:24; Mkpughe 21:4) Ndị mmadụ agaghịkwa na-aka nká. Baịbụl kwuru, sị: “Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata; ka ọ laghachi otú ọ dị n’oge o nwere ike okorobịa.”—Job 33:25.

IHE I NWERE IKE IME

I nwere ike iketa Alaeze Chineke ma i mee ihe Chineke chọrọ n’agbanyeghị onye ị bụ. Baịbụl sịrị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

Ụmụ mmadụ hà nwere ike iweta Alaeze Chineke?

“Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.”—Daniel 2:44.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ụmụ mmadụ ga-eweta Alaeze Chineke. Ha na-ekwu na otú a ga-esi mee ya bụ ime ka ndị ọzọ ghọọ ndị chọọchị ha ma ọ bụkwanụ ime ka mba niile dịrị n’otu.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọ bụ Chineke ga-eweta Alaeze ahụ, ọ bụghị mmadụ. (Daniel 2:44) Baịbụl kwuru na mgbe Alaeze ahụ malitere ịchị, Chineke kwuru, sị: “Mụ onwe m emewo ka eze m nọdụ n’ocheeze.” (Abụ Ọma 2:6) Ụmụ mmadụ agaghị ewetali Alaeze Chineke, ha agaghịkwa emebili ya n’ihi na ọ ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa.—Matiu 4:17.

GỊNỊ MERE IHE A JI GBASA GỊ?

Onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ka udo dị n’ụwa, mmadụ niile adịrịkwa n’otu. O nwedịrị ndị na-agba mbọ ịhụ na e nwere udo na ịdị n’otu n’ụwa. Ma, ike na-abịa gwụ ha mgbe mbọ ha na-agba kụrụ afọ n’ala. Kama mmadụ ịnọ na-agba ụdị mbọ a, ihe anyị kwesịrị ịna-eme bụ ịkwado Alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ naanị Chineke ga-emeli ka e nwee udo na ịdị n’otu n’ụwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya