Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 102
  • Ịgba Chaa Chaa Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgba Chaa Chaa Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Gịnị Dị Njọ n’Ịgba Chaa Chaa?
    Teta!—2002
  • Zere Ọnyà nke Ịgba Chaa Chaa
    Teta!—2002
  • Baịbụl Ọ̀ Katọrọ Ịgba Chaa Chaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ịgba Chaa Chaa
    Teta!—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 102
Ebe onye na-agba chaa chaa na-ele tiketi lọtrị anya mgbe a na-ama ọkwa na tiivi gbasara ndị ritere ihe na chaa chaa a gbara

Ịgba Chaa Chaa Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe gbasara ịgba chaa chaa. Ma, ihe ndị dị́ na Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịmata na Chineke weere ịgba chaa chaa ka ihe ọjọọ.​—Ndị Efesọs 5:​17.a

  • Ọ bụ anyaukwu mere ndị mmadụ ji agba chaa chaa. Ma, Chineke kpọrọ anyaukwu asi. (1 Ndị Kọrịnt 6:​9, 10; Ndị Efesọs 5:​3, 5) Ndị na-agba chaa chaa na-ebu n’obi na ha ga-eri ego ha na ibe ha tụkọtara. Ma, Baịbụl kwuru na anyị ekwesịghị ikwe ka agụụ inweta ihe ndị ọzọ na-agụ anyị.​—Ọpụpụ 20:17; Ndị Rom 7:7; 13:​9, 10.

  • A sịgodị na ọ bụ obere ego ka mmadụ chọrọ iji gbaa chaa chaa, o nwere ike ime ka onye ahụ malite ịhụ ego n’anya.​—1 Timoti 6:​9, 10.

  • Ndị na-agba chaa chaa na-atụkwasịkarị chi ihu ọma obi. Ma, Chineke weere ịtụkwasị chi ihu ọma obi ka ikpere arụsị. E nweghịkwa ihe jikọrọ ofufe Chineke na ikpere arụsị.​—Aịzaya 65:11.

  • Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na-arụsi ọrụ ike, kama ịnọ na-achọ inweta ego n’enweghị ọrụ anyị rụrụ. (Ekliziastis 2:​24; Ndị Efesọs 5:​28) Ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru na-eri “nri ha onwe ha rụtara.”​—2 Ndị Tesalonaịka 3:​10, 12.

  • Ịgba chaa chaa nwere ike ime ka ndị mmadụ na-amarịta aka. Baịbụl kagbukwara mmadụ na ibe ya ịmarịta aka ma ọ bụ ịsọ mpi.​—Ndị Galeshia 5:​26.

a Naanị ebe Baịbụl kwuru gbasara ya bụ mgbe a na-ekwu banyere ndị agha Rom, bụ́ ndị ji anyaukwu fee nza maka uwe Jizọs.​—Matiu 27:35; Jọn 19:23, 24.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya