Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 115
  • Gịnị Bụ Oké Mkpagbu Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Oké Mkpagbu Ahụ?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Na-erubere Chineke Isi n’Oge “Oké Mkpagbu”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • “Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Mgbapụta Ná Mkpughe Nke Jisọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Chineke Ga-eji Alaeze Ya Bibie Ndị Iro Ya
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 115
Ebe ndị si n’oké mkpagbu ahụ pụta na-amakụ ibe ha

Gịnị Bụ Oké Mkpagbu Ahụ?

Ihe Baịbụl kwuru

Oké mkpagbu ahụ ga-eme ka ihe siere ụmụ mmadụ ezigbo ike otú ọ na-esitụbeghị mbụ. Amụmụ a e buru na Baịbụl gosiri na ihe a ga-eme “n’oge ikpeazụ,” ma ọ bụ ‘n’ọgwụgwụ oge.’ (2 Timoti 3:1; Daniel 12:4, Bible Nsọ Ọhụụ) Ọ ga-abụ “mkpagbu nke a na-enwebeghị ụdị ya kemgbe ihe ndị Chineke kere malitere ịdị ruo mgbe ahụ, a gaghị enwekwa ya ọzọ.”​—Mak 13:19; Daniel 12:1; Matiu 24:21, 22.

Ihe ndị ga-eme n’oge oké mkpagbu ahụ

  • A ga-ebibi okpukpe ụgha. A ga-ebibi okpukpe ụgha n’otu ntabi anya. (Mkpughe 17:​1, 5; 18:​9, 10, 21) Ọ bụ Òtù Mba Ụwa, nọchiri anya ndị ọchịchị, ga-ebibi okpukpe ụgha.​—Mkpughe 17:​3, 15-​18.a

  • A ga-alụso ndị Chineke ọgụ. Ọtụtụ mba ndị gbakọrọ aka ọnụ, a kpọrọ “Gọg nke ala Megọg” n’ọhụụ Ezikiel hụrụ, ga-agbalị igbukpọ ndị na-efe Chineke. Ma, Chineke ga-echebe ndị na-efe ya ka a ghara ibibi ha.​—Ezikiel 38:​1, 2, 9-​12, 18-​23.

  • A ga-ekpe ndị bi n’ụwa ikpe. Jizọs ga-ekpe ụmụ mmadụ ikpe. “Ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ.” (Matiu 25:31-​33) Ihe ọ ga-elekwasị anya kpee ikpe ahụ bụ mà anyị kwadoro “ụmụnna” Jizọs, bụ́ ndị ga-eso ya chịa n’eluigwe, ka ọ̀ bụ na anyị akwadoghị ha.​—Matiu 25:34-​46.

  • Ịchịkọta ndị ga-achị n’Alaeze. Ndị niile a họọrọ ka ha soro Kraịst chịa, ga na-ejere Chineke ozi ruo mgbe ha ga-anwụ, a kpọlite ha n’ọnwụ, ha agaa eluigwe.​—Matiu 24:31; 1 Ndị Kọrịnt 15:50-​53; 1 Ndị Tesalonaịka 4:​15-​17.

  • Amagedọn. Agha a bụ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” A na-akpọkwa ya “ụbọchị Jehova.” (Mkpughe 16:14, 16; Aịzaya 13:9; 2 Pita 3:​12) A ga-ebibi ndị Kraịst ga-ama ikpe. (Zefanaya 1:​18; 2 Ndị Tesalonaịka 1:​6-​10) Ihe ọzọ a ga-ebibi bụ ọchịchị niile e nwere n’ụwa, bụ́ nke Baịbụl kọwara dị ka anụ ọhịa nwere isi asaa.​—Mkpughe 19:19-​21.

Ihe ndị ga-eme mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị

  • A ga-eke Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya agbụ. Otu mmụọ ozi dị ike ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ “n’ime abis.” N’ebe ahụ, ọ ga-adị ka hà nwụrụ anwụ n’ihi na ha agaghịzi na-akpa ike. (Mkpughe 20:​1-3) E nwere ike iji ọnọdụ Ekwensu ga-anọ na ya n’ime abis tụnyere onye nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ gaghịzi na-akpa ike.​—Mkpughe 20:7.

  • Ọchịchị otu Puku Afọ ga-ebido. Alaeze Chineke ga-ebido ịchị ruo otu puku afọ. Ọchịchị ahụ ga-emere ụmụ mmadụ ọtụtụ ihe ọma na-enweghị atụ. (Mkpughe 5:​9, 10; 20:​4, 6) “Oké ìgwè mmadụ” onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta,’ jiri anya ha hụ mgbe ọchịchị Puku Afọ ahụ ga-amalite.​—Mkpughe 7:9, 14; Abụ Ọma 37:9-11.

a N’akwụkwọ Mkpughe, Babịlọn Ukwu ahụ ma ọ bụ “oké nwaanyị akwụna ahụ,” nọchiri anya okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:​1, 5) Anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, bụ́ nke ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ, nọchiri anya òtù na-anọchite anya mba niile dị́ n’ụwa, na-agbakwa mbọ ka ha dị n’otu. Mgbe mbụ òtù a pụtara, a kpọrọ ya Njikọ Mba Niile, ma a na-akpọzi ya Òtù Mba Ụwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya