Mgbapụta Ná Mkpughe Nke Jisọs Kraịst
“Na-aṅụrịnụ ọṅụ; ka unu wee werekwa obi na-atọ ụtọ nke ukwuu n’ime mkpughe nke ebube ya.”—1 PITA 4:13.
1. Olee otú Jehova siworo mee ka ndị na-ejere ya ozi baa ụba?
JEHOVA enyewo Ndịàmà ya ọtụtụ onyinye. Dị ka Onye Ozizi anyị Kasị Ukwu, o mewo ka anyị nwezuo ihe ọmụma banyere uche na nzube ya. Site ná mmụọ nsọ ya, ọ zụlitewo n’ime anyị ikike nke iji nkwuwa okwu na-enye ìhè. Pọl onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ na-agwa anyị ná 1 Ndị Kọrint 1:6, 7, sị: “E mere ka àmà nke Kraịst guzosie ike n’ime unu: nke mere na ọ dịghị onyinye amara fọdụrụ nke unu na-enweghị; unu na-echekwa mkpughe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.”
2. Olileanya ọṅụ dị aṅaa ka “mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst” na-ekwe nkwá ya?
2 “Mkpughe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst”—gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ na-ezo aka n’oge a ga-ekpughe Jisọs dị ka Eze dị ebube, na-eme ihe iji kwụghachi ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ ma mezuo ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Dị ka 1 Pita 4:13 na-egosi, ọ ga-abụ oge maka ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe na ndị enyi ha na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ inwe “obi na-atọ ụtọ nke ukwuu,” n’ihi na ọ na-egosi ngwụsị nke usoro ihe Setan.
3. Olee otú anyị na-aghaghị isi guzosie ike, dị ka ụmụnna anyị na Tesalọnaịka mere?
3 Ka oge ahụ na-abịaru nso, Setan ji iwe na-amụba nrụgide ya n’ahụ anyị. Dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-agbalị iripịa anyị. Anyị aghaghị iguzosi ike! (1 Pita 5:8-10) Mgbe ha dị ọhụrụ n’eziokwu, ụmụnna anyị na Tesalọnaịka nwere mkpagbu yiri ndị ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-enwe taa. N’ihi nke a okwu ndị Pọl onyeozi degaara ha bara uru nke ukwuu nye anyị. O dere, sị: “O ziri ezi n’ebe Chineke nọ inyeghachi ndị na-akpagbu unu mkpagbu, na inyeghachi unu, bụ́ ndị a na-akpagbu, ahụ efe, anyị na unu, n’ime mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi nke ike ya, n’ime ọkụ na-ere ere, na-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8) Ee, ahụ efe ga-abịa!
4. N’ihi gịnị ka ndị ụkọchukwu ji kwesị ịnata ikpe ọmụma a ga-emezu ná mkpughe Jisọs?
4 N’oge Pọl, ọ bụ ndị ndú okpukpe Juu kpatara ihe ka ọtụtụ ná mkpagbu ahụ. N’ụzọ yiri ya taa, ọ bụ ndị na-asị na ha na-anọchi anya Chineke, karịsịa ndị ndú okpukpe nke Krisendọm, na-akpali mmegide a na-emegide Ndịàmà nke Jehova hụrụ udo n’anya. Ndị a na-eme ka à ga-asị na ha maara Chineke, ma ha na-ajụ ‘ịbụ otu nke Jehova’ nke Bible, jiri Atọ n’Ime Otu dị omimi na-edochi ya. (Mak 12:29) Ha adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jisọs, na-elegara ọchịchị mmadụ anya maka nnapụta ma na-ajụ ozi ọma nke ọbịbịa Alaeze ezi omume nke Kraịst. Ndị mmegide ndị a nile nke okpukpe aghaghị ịla n’iyi n’oge “mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe”!
‘Ọbịbịa’ Jisọs Kraịst
5. Olee otú e si gosipụta mkpughe Jisọs nke ọma na Matiu 24:29, 30?
5 Jisọs gosipụtara mkpughe ahụ nke ọma na Matiu 24:29, 30. N’ịkọwa akụkụ dị iche iche nke ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ oge a, ọ sịrị: “Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya, kpakpando nile ga-adakwa site n’eluigwe, a ga-emekwa ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ.” N’oge ahụ “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe.” Mba nile nke ụwa “ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ [Eze Mesaịa nke Chineke] ka ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.” ‘Ọbịbịa’ nke a, er·khoʹme·non na Grik, na-ezo aka ná mpụta Jisọs dị ka Onye Na-ewepụ Jehova n’Ụta.
6, 7. Olee otú o si bụrụ na “anya nile ọ bụla ga-ahụ ya,” olè ndị kwa ka a gụnyere na nke a?
6 Jọn onyeozi kọwakwara ‘ọbịbịa’ nke a ná Mkpughe 1:7, ebe ọ na-asị: “Lee, ọ na-abịa, ya na igwe ojii.” Oo, ndị iro ahụ agaghị eji anya nkịtị hụ Jisọs, n’ihi na “igwe ojii” na-egosi na ọ ga-abịa n’ụzọ anya na-adịghị ahụ ịbịa mezuo ihe e kpere n’ikpe. Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ efu ga-eji anya nkịtị hụ ebube eluigwe nke a, ha ga-ekpu ìsì, dị nnọọ ka e mere ka Sọl kpuo ìsì n’ụzọ Damaskọs, mgbe Jisọs ahụ e mere ka ọ dị ebube bịakwutere ya, na-eji oké ìhè ọkụ.—Ọrụ 9:3-8; 22:6-11.
7 Ihe ndekọ Mkpughe ahụ na-ekwu na “anya nile ọ bụla ga-ahụzukwa ya, bụ́ ndị mara ya ube; ebo nile nke ụwa ga-etikwara ya aka n’obi.” Nke a pụtara na ndị mmegide nọ n’ụwa ga-aghọta ná mbibi ahụ na Jisọs na-abịakwasị ha, na ọ bịawo n’ike na oké ebube dị ka Onye Na-emezu Ihe Jehova Kpere n’Ikpe. N’ihi gịnị ka e ji kọwaa ndị iro ahụ dị ka “ndị mara ya ube”? Ọ bụ n’ihi na àgwà ha nke inwe obi ilu n’ebe ndị na-ejere Jehova ozi nọ taa yiri nke ndị ahụ kpagburu Jisọs. N’ezie ha ‘ga-etiri ya aka n’obi n’ụzọ dị ilu.’
8. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka ma Jisọs ma Pọl nyere banyere mbibi mberede?
8 Olee otú ụbọchị ahụ nke ịbọ ọ́bọ̀ Jehova ga-esi bịa? N’amụma dị na Luk isi nke 21, Jisọs na-akọwa oké ihe omume ọjọọ ndị bụworo ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya kemgbe 1914. Mgbe ahụ, n’amaokwu nke 34 na 35 (NW), Jisọs na-adọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara iji iribiga nri ókè na oké aṅụrụma na nchekasị nke ndụ bogbuo obi unu, ná mberede, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu ngwa ngwa dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa dum.” Ee, ụbọchị ahụ nke ịbọ ọ́bọ̀ Jehova na-abịa na mberede, ngwa ngwa! Pọl onyeozi mesiri nke a ike ná 1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3, na-asị: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] na-abịa. Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.” Ọbụna ugbu a, mba dị iche iche na-ekwu banyere udo na ntụkwasị obi ma na-eme atụmatụ ime ka òtù United Nations siwanye ike iji jiri ike ibu agha chịkwaa ebe ndị jupụtara ná nsogbu.
9. Maka ònye ka ‘ìhè’ mụkeere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
9 N’amaokwu nke 4 na 5, onyeozi ahụ gara n’ihu ịgwa anyị, sị: “Ma, unu onwe unu, ụmụnna anyị, anọghị n’ọchịchịrị, ka ụbọchị ahụ wee jide unu na mberede dị ka onye ohi: n’ihi na unu onwe unu nile bụ ụmụ nke ìhè, na ụmụ nke ehihie: anyị abụghị ndị nke abalị, ma ọ bụ nke ọchịchịrị.” Anyị nwere ọṅụ ịbụ ụmụ nke ìhè—ndị na-enye ndị ọzọ na-achọsi ezi udo na ntụkwasị obi ike n’ụwa ọhụrụ Chineke ìhè. N’Abụ Ọma 97:10, 11, anyị na-agụ, sị: “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị: ọ na-edebe mkpụrụ obi ndị ebere ya; ọ na-anapụta ha n’aka ndị na-emebi iwu. A ghaworo onye ezi omume ìhè dị ka mkpụrụ, a ghawokwara ndị ziri ezi n’obi ọṅụ.”
Usoro Ihe Omume Dị Iche Iche
10. Ihe ịrịba ama dị aṅaa e nyere n’oge ka anyị kwesịrị ịṅa ntị banyere ụbọchị Chineke maka ime mpịazi? (Mkpughe 16:15)
10 Olee usoro ihe dị iche iche ga-esi mee mgbe mkpagbu ukwu ahụ bịara? Ka anyị saghee Mkpughe isi nke 16. Rịba ama, dị ka a kọwara n’amaokwu nke 13 ruo 16, na ndị mmụọ ọjọọ na-adịghị ọcha na-eme ka mba nile nke ụwa zukọọ na Ha–Magedọn, bụ́ agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ọzọ, e mesiri ọbịbịa yiri nke onye ohi nke ụbọchị mpịazi ahụ ike, a dọkwara anyị aka ná ntị ịmụrụ anya—ịnọgide na-eyi uwe ime mmụọ ahụ nke na-aka anyị akara maka nzọpụta. Oge eruwo maka ikpe ndị bi n’ụwa ikpe, bụ́ mba dị iche iche, na—onye ọzọkwa. Ònye bụ onye ahụ?
11. Olee otu nwanyị nke Mkpughe 17:5 siworo kọwaa onwe ya?
11 Ọ bụ nwanyị ihe atụ nke gbalịworo n’ezie ime onwe ya ka ọ bụrụ “onye dị mkpa.” A kọwara ya ná Mkpughe 17:5 dị ka “ihe omimi, Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko na nke ihe arụ nile nke ụwa.” Ma ọ bụkwaghị ihe omimi nye Ndịàmà Jehova ọzọ. O gosipụtawo onwe ya nke ọma ịbụ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, nke ịrọ òtù dị iche iche nke Krisendọm mejupụtara akụkụ ya ka ukwuu. Ihe arụ n’anya Jehova bụ mwaba ọ na-awaba n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ya ịbụ onye ‘ọbara ndị nsọ na-aba n’anya’ site n’ịkpagbu ezi ndị Kraịst, na ya ịbụ onye ọbara nke “ndị nile e gbuworo n’elu ụwa” dị n’isi, gụnyere ihe karịrị otu narị nde ndị e gburu n’agha dị iche iche nke narị afọ nke 20 nke a nanị.—Mkpughe 17:2, 6; 18:24.
12. N’ihi gịnị ka ikpe ji ma ịrọ òtù nile nke Krisendọm?
12 Nke kasị njọ, ịrọ òtù nile nke Krisendọm ewetawo nkọcha n’aha Chineke nke ha ji ihu abụọ na-asị na ha na-anọchite anya ya. Ha akụziwo nkà ihe ọmụma ndị Babilọn na Gris kama nke Okwu Chineke dị ọcha, ha ekerewokwa òkè n’ọnọdụ omume rụrụ arụ nke mba nile site n’ịkwado ụzọ ndụ nke ime otú dị onye mma, bụ́ nke na-emegide ụkpụrụ Bible. Ndị oké azụmahịa dị anyaukwu nọ n’etiti ha nọ n’amamikpe site n’okwu ndị ahụ nke Jemes 5:1, 5: “Geenụ ntị, unu ndị ọgaranya, kwaa ákwá, tiekwanụ mkpu n’ihi ịhụju anya nile unu nke na-abịakwasị unu. Unu biri n’oké oriri na ọṅụṅụ n’elu ụwa, dịkwa ndụ ọjọọ dị ka ọ na-atọ ahụ unu ụtọ; unu zụrụ obi unu n’ụbọchị ogbugbu.”
Kwatuo Babilọn Ukwu Ahụ!
13. Olee otu ntiwapụ mbụ nke mkpagbu ukwu ahụ si abịa, ịdị ngwa dị aṅaa ka e mesikwara ike ná Mkpughe 18:4, 5?
13 Ntiwapụ mbụ nke mkpagbu ukwu ahụ ga-eji mmezu nke ikpe Jehova megide Babilọn Ukwu ahụ bịa. Mkpughe 17:15-18 na-akọwa “ìzù” Chineke—ịkwali “mpì iri,” bụ́ usuu ndị agha dị ike ndị nọ n’ime “anụ ọhịa” nke òtù UN nke ọtụtụ mba mejupụtara, ibibi ya. “Mpi iri ahụ ị hụrụ, ha na anụ ọhịa ahụ, ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ. N’ihi na Chineke tinyere n’obi ha ime ìzù ya.” Ka a sịkwa ihe mere olu nke si n’eluigwe ji nye ịdọ aka ná ntị dị ngwa ná Mkpughe 18:4, 5: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile: n’ihi na mmehie ya nile rapakọọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile.” Òkù ahụ ka nọ na-aga n’ihu: Gbubie njikọ nile n’ebe okpukpe ụgha nọ tupu oge agafee!
14. Olè ndị ga-eruru ntikpọsi nke Babilọn Ukwu ahụ újú, n’ihi gịnịkwa?
14 Olee otú ụwa ga-esi lee mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ anya? Site n’ebe dị anya, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ—“ndị eze ụwa,”—ruoro ya újú n’ihi na ruo ọtụtụ narị afọ, ha na ya enwekọwo ihe ụtọ n’ịkwa iko ime mmụọ ha. Ndị ọzọ na-akwakwa ákwá ma na-eruru ya újú bụ ndị azụmahịa anyaukwu, “ndị ahịa . . . ndị bụrụrịị ọgaranya site na ya.” Ndị a na-ewezụgakwa onwe ha n’ebe dị anya, na-asị: “Ahụhụ, ahụhụ, obodo ukwu ahụ, nke e gbokwasịworo ya ezi ákwà ọcha na ákwà na-acha ọbara ọbara na ákwà uhie, nke e werewokwaara ọlaedo na nkume dị oké ọnụ ahịa na pearl kee ya! N’ihi na n’otu oge hour e mere ka oké akụ dị otú a tọgbọrọ n’efu.” Ihe ịchọ mma nile nke uwe ndị ndú okpukpe na oké ịma mma nke katidral ukwu dị iche iche nke ụwa ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi! (Mkpughe 18:9-17) Ma ọ̀ bụ mmadụ nile ga-eruru Babilọn Ukwu ahụ újú?
15, 16. Ihe dị aṅaa na-akpata ite egwú ọṅụ ka ndị Chineke ga-enwe?
15 Mkpughe 18:20, 21 na-aza, sị: “Ka obi na-atọ gị ụtọ n’isi ya, gị eluigwe, na unu ndị nsọ, na unu ndị ozi, na unu ndị amụma; n’ihi na Chineke kpere ikpe unu n’ahụ ya.” Dị ka oké nkume igwe nri nke a tụbara n’ime osimiri, “a [ga-atụbaworị] Babilọn, bụ́ obodo ukwu ahụ, n’oké ọdịda, a gaghị ahụkwa ya ọzọ ma ọlị.”
16 Lee ihe na-akpata ite egwú ọṅụ ọ bụ! Mkpughe 19:1-8 na-egosipụta nke a. Ugbo anọ ka e tiri mkpu ahụ bụ “Haleluya” site n’eluigwe. Atọ ndị bu ụzọ na Haleluya ndị a na-eto Jehova n’ihi na o mezuwo ikpe ezi omume n’ahụ ajọ nwanyị ahụ na-akwa iko, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ. Alaeze ụwa nke okpukpe ụgha adịghịkwa ọzọ! Otu olu sitere n’ocheeze Chineke na-asị: “Na-etonụ Chineke anyị, unu ndị ohu ya nile, ndị na-atụ egwu ya, ndị nta na ndị ukwu.” Lee ihe ùgwù anyị ga-enwe n’ikere òkè n’abụ ahụ!
Alụmdi na Nwunye nke Nwa Atụrụ Ahụ
17. Iji Mkpughe 11:17 tụnyere 19:6, ná nghọta abụọ dị aṅaa ka Jehova na-abụ Eze?
17 Haleluya nke anọ na-ewebata isiokwu ọzọ: “Haleluya: n’ihi na Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, na-abụ eze.” Ma ọ̀ bụ na e kwughị okwu yiri nke ahụ ná Mkpughe 11:17? N’ebe ahụ anyị na-agụ: “Anyị na-ekele gị, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile . . . n’ihi na i werewo oké ike gị, ị bụkwara eze.” Ee. Otú ọ dị, nghọta dị gburugburu Mkpughe 11:17 na-ezo aka ná mweta Jehova ga-eweta Alaeze Mesaịa ahụ na 1914 ‘iji mkpanaka ígwè zụọ mba nile dị ka atụrụ.’ (Mkpughe 12:5) Nghọta dị gburugburu Mkpughe 19:6 bụ banyere mbibi Babilọn Ukwu ahụ. Mgbe e wepụsịrị okpukpe yiri akwụna, a ga-ewepụ ọbụbụ Chineke nke Jehova n’ụta. Ife ya ofufe dị ka Ọkaaka Kachasị na Eze ga-aga n’ihu site ugbu a ruo mgbe nile ebighị ebi!
18. Mwepụ nke Babilọn Ukwu ahụ na-emeghe ụzọ maka ọkwa dị aṅaa nke na-enye ọṅụ?
18 N’ihi nke a, a pụrụ ịma ọkwa ahụ na-enye ọṅụ, bụ́: “Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, ka obi na-atọkwa anyị ụtọ nke ukwuu, ka anyị werekwa otuto nile nye [Ja]: n’ihi na ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ abịawo, nwunye ya edoziwokwa onwe ya. E wee kwenyere ya ka o gbokwasị onwe ya ezi ákwà ọcha na-enwu enwu, nke dịkwa ọcha: n’ihi na ezi ákwà ọcha ahụ bụ ezi omume nile nke ndị nsọ.” (Mkpughe 19:7, 8) E kwughị kpọmkwem mgbe ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa ga-anata mbilite n’ọnwụ ha gaa n’eluigwe. Ma a na-emesi anyị obi ike site n’ihe e kwuru n’ebe a na ha ikere òkè n’ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, ga-abụ oge obi ụtọ, karịsịakwa ebe ha ga-ahụworị n’onwe ha mweda n’ala nke ajọ nwanyị ahụ na-akwa iko, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ.
E Bibie Ụwa Setan
19. Olee ihe omume ndị ọzọ a kọwara ná Mkpughe 19:11-21?
19 Ịnyịnya ọcha nke e mere nhota mbụ ya ná Mkpughe 6:2 apụta ọzọ. Anyị na-agụ ná Mkpughe 19:11: “Onye na-anọkwasị [n’elu ịnyịnya ọcha ahụ], bụ́ onye a na-akpọ Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu; ọ bụkwa n’ezi omume ka ọ na-ekpe ikpe, na-ebukwa agha.” Otú a, Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwe nile” na-agba na-aga igbu ndị mba dị iche iche na ịzọkwa ebe nzọcha mmanya vine nke ọnụma nke iwe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” Ná nkịtị ka “ndị eze ụwa, na usuu nile nke ndị agha ha” na-ezukọ ibu agha na Ha–Magedọn. Onye na-anọkwasị n’ịnyịnya ọcha ahụ na-enwezu mmeri ya. Ọ dịghị ihe ọ bụla fọdụrụ ná nzukọ elu ala nke Setan.—Mkpughe 19:12-21.
20. Gịnị dakwasịrị Ekwensu n’onwe ya?
20 Ma olee banyere Ekwensu n’onwe ya? Ná Mkpughe 20:1-6, a kọwara Kraịst Jisọs dị ka “mmụọ ozi ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-eji mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya.” O jidere dragọn ahụ, bụ́ Agwọ ochie ahụ, nke bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ, tụba ya n’abyss, ma kpuchie ya, kaakwa akara n’elu ya. Ebe e wepụworo Setan ma mee ka ọ ghara inwe ike iduhie mba nile ọzọ, Ọchịchị Narị Afọ Iri dị ebube nke Nwa Atụrụ ahụ na nwunye ya na-amalite. Anya mmiri nke mwute agaghị adịkwa ọzọ! Ọnwụ sitere n’aka Adam agaghị adịkwa ọzọ! Iru újú, ịkwa ákwá, ahụ ụfụ, agaghị adịkwa ọzọ! “Ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
21. Ka anyị na-echeresi mkpughe Jisọs Kraịst ike, gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị?
21 Ka anyị na-echeresi mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ike, ka anyị gosi ịnụ ọkụ n’obi n’ịgwa ndị ọzọ banyere nkwa ịhụnanya nile nke Alaeze Chineke. Mgbapụta dị nso! Ka anyị na-aga n’ihu, ee, na-aga n’ihu mgbe nile, dị ka ụmụ nweworo ihe ọmụma nke Eze Onyenwe anyị Jehova!
Ná Ntụleghachi
◻ Gịnị na-egosi na mkpughe Jisọs Kraịst dị nnọọ nso?
◻ Olee otú ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Jehova ga-esi rute?
◻ Olee otú “ndị hụrụ Jehova n’anya” kwesịrị isi lee ọnọdụ dị n’ụwa ugbu a anya?
◻ Gịnị ga-abụ usoro ihe ndị ga-eme mgbe mkpagbu ukwu ahụ malitere?
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Jisọs ‘na-abịa n’igwe ojii’ n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya imezu ihe e kpere n’ikpe
[Foto dị na peeji nke 25]
N’isi nso, okpukpe ụgha, usoro ihe ọjọọ Setan, na Setan n’onwe ya ga-apụsị n’anya