Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 72
  • Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Mkpughe—Mmezu Ya nke Na-enye Obi Ụtọ!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Mkpughe 21:1—“Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ”
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Isi Nso
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 72
Ebe otu nwoke nke na-agụ akwụkwọ Mkpughe ji uche ya na-ahụ anụ ọhịa na ndị na-agba ịnyịnya e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Apọkalips

Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?

Ihe Baịbụl kwuru

Okwu Grik e si na ya nweta aha akwụkwọ Baịbụl a a na-akpọ Mkpughe bụ A·po·kaʹly·psis (apọkalips). Ihe ọ pụtara bụ “Imeghe” ma ọ bụ “Ikpughe.” Aha akwụkwọ a gosiri na o meghere ihe ndị e zochiri ezochi, kpugheekwa ihe ndị ga-emenụ ọtụtụ afọ e dechara akwụkwọ a. Ọtụtụ amụma ndị e dere na ya emezubeghị.

Isi ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe

  • Okwu mmalite.​—Mkpughe 1:​1-9.

  • Ozi Jizọs zigaara ọgbakọ asaa.​—Mkpughe 1:10-​3:​22.

  • Ọhụụ Jọn hụrụ ka Chineke nọ n’ocheeze ya n’eluigwe.​—Mkpughe 4:1-​11.

  • Ọhụụ dị́ iche iche Jọn hụrụ, ya hụchaa otu, ọzọ esochie:

    • Ihe asaa a kara akara.​—Mkpughe 5:1-​8:6.

    • Opi asaa, atọ ndị nke ikpeazụ n’ime ha kpatara ahụhụ.​—Mkpughe 8:7-​14:20.

    • Efere asaa. Ihe dị́ n’ime nke ọ bụla n’ime ha bụ ihe otiti, ya bụ, ikpe Chineke nke a ga-awụpụ n’ime ụwa.​—Mkpughe 15:1-​16:21.

    • Ọhụụ ndị Jọn hụrụ gbasara mbibi ndị iro Chineke.​—Mkpughe 17:1-​20:10.

    • Ọhụụ ndị Jọn hụrụ gbasara otú Chineke ga-esi agọzi eluigwe na ụwa.​—Mkpughe 20:11-​22:5.

  • Okwu mmechi.​—Mkpughe 22:​6-​21.

Ihe ndị ga-enyere mmadụ aka ịghọta akwụkwọ Mkpughe

  1. Ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe bara uru, ọ bụghị ihe na-emenye ndị na-efe Chineke egwu. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-ekwu na “apọkalips” pụtara oké ọdachi, ma ihe e kwuru ná mmalite akwụkwọ Mkpughe nakwa ná ngwụcha ya bụ na obi ụtọ ga-adịrị onye ọ bụla na-agụ ihe ndị e dere na ya, na-aghọta ha ma na-eme ha eme.​—Mkpughe 1:3; 22:7.

  2. E nwere ọtụtụ “ihe atụ” ma ọ bụ ihe nnọchianya n’akwụkwọ Mkpughe. E kwesịkwara ịghọta ha ka ihe atụ.​—Mkpughe 1:1.

  3. E nweela ebe ndị ọzọ na Baịbụl e bu ụzọ dee gbasara ọtụtụ ndị e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe nakwa ọtụtụ ihe atụ e dere na ya:

    • Jehova, “ezi Chineke n’eluigwe,” Onye kere ihe niile.​—Diuterọnọmi 4:​39; Abụ Ọma 103:19; Mkpughe 4:​11; 15:3.

    • Jizọs Kraịst, “Nwa Atụrụ Chineke.”​—Jọn 1:​29; Mkpughe 5:6; 14:1.

    • Setan bụ́ Ekwensu, onye na-emegide Chineke.​—Jenesis 3:​14, 15; Jọn 8:​44; Mkpughe 12:9.

    • Babịlọn Ukwu ahụ, onye iro Jehova Chineke na onye iro ndị na-efe Chineke. Ọ bụ na ya ka e si nweta ụgha ndị a na-akụzi n’okpukpe dị́ iche iche. Babịlọn Ukwu ahụ yiri Babịlọn oge ochie (ya bụ, Bebel) n’ihi na Babịlọn oge ochie bụkwa onye iro Jehova na ndị fere Jehova, e sikwa na ya nweta ọtụtụ ozizi ụgha.​—Jenesis 11:​2-9; Aịzaya 13:​1, 11; Mkpughe 17:​4-6; 18:​4, 20.

    • “Oké osimiri,” ya bụ, ndị ajọ omume na-emegide Chineke.​—Aịzaya 57:20; Mkpughe 13:1; 21:1.

    • Ihe ndị dị́ n’ụlọikwuu e ji fee Chineke n’oge ochie. Ụfọdụ n’ime ha bụ igbe ọgbụgba ndụ, oké osimiri nke yiri enyo (ya bụ, nnukwu efere mmiri dị n’ime ya), oriọna, ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na ebe ịchụàjà.​—Ọpụpụ 25:10, 17, 18; 40:24-32; Mkpughe 4:​5, 6; 5:8; 8:3; 11:19.

    • Anụ ọhịa nke nọchiri anya ọchịchị ụmụ mmadụ.​—Daniel 7:​1-8, 17-​26; Mkpughe 13:​2, 11; 17:3.

    • Ọnụ ọgụgụ ndị nwere ihe ha nọchiri anya ha.​—Mkpughe 1:​20; 8:​13; 13:18; 21:16.

  4. Ọhụụ ndị ahụ bụ maka ‘ụbọchị Onyenwe anyị,’ nke malitere mgbe Alaeze Chineke bidoro n’afọ 1914, Jizọs amalitekwa ịchị. (Mkpughe 1:​10) Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịtụ anya na ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe ga-akacha emezu n’oge anyị a.

  5. Ihe ndị ga-enyere anyị aka ịghọta akwụkwọ Mkpughe bụkwa ihe ndị na-enyere anyị aka ịghọta akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ, ya bụ, amamihe sí n’aka Chineke na aka ndị ghọtarala ihe Baịbụl na-ekwu ga-enyere anyị.​—Ọrụ Ndịozi 8:​26-​39; Jems 1:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya