Isi nke 1
Mkpughe—Mmezu Ya nke Na-enye Obi Ụtọ!
1. Anyị si aṅaa mara na Chineke chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ?
MKPUGHE E KPUGHEERE JỌN—akwụkwọ Bible nke a na-akpali mmasị na-eweta ihe ndekọ ahụ dị nsọ ná ngwụsị na-enye obi ụtọ. N’ihi gịnị ka anyị ji sị na ọ bụ nke na-enye “obi ụtọ”? Ee, a kọwara Onye ahụ Bible sitere n’uche ya dị ka “Chineke obi ụtọ,” onye na-enyefe “ozi ọma dị ebube” n’aka ndị hụrụ ya n’anya. Ọ chọrọ ka anyị nweekwa obi ụtọ. Otú a, ná mmalite, Mkpughe na-ekwe anyị nkwa, sị: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị onye na-agụ . . . okwu nile nke amụma nke a.” N’isi ikpeazụ ya, a gwara anyị, sị: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị onye na-edebe okwu nile nke amụma nke akwụkwọ a.”—1 Timoti 1:11, NW; Mkpughe 1:3; 22:7.
2. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta obi ụtọ site n’akwụkwọ Mkpughe?
2 Ànyị si aṅaa achọta obi ụtọ site n’akwụkwọ Mkpughe? Anyị na-eme nke a site n’ịchọpụta ihe ihe àmà ma ọ bụ ihe atụ dị iche iche dị n’ime ya pụtara, wee na-emekwa omume n’ụzọ kwekọrọ na ya. Akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ, nke dịworo n’oké ọgba aghara ga-abịaru ná ngwụsị nke bụ oké mbibi n’oge na-adịghị anya, ka Chineke na Jisọs Kraịst ga-emezu ihe e kpere n’ikpe megide ajọ usoro ihe nke dị ugbu a, na-eji “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” na-edochi anya ya, ebe ọbụna ‘ọnwụ na-agaghị adịkwa ọzọ.’ (Mkpughe 21:1, 4) Ọ̀ bụ na anyị nile achọghị ibi n’ime usoro ọhụrụ dị otú ahụ, n’ezi udo na ntụkwasị obi? Anyị pụrụ ime nke a ma ọ bụrụ na anyị ewulite okwukwe anyị site n’ịmụ Okwu Chineke, gụnyere amụma ahụ na-akpali akpali nke dị ná Mkpughe.
Apọkalips—Gịnị Ka Ọ Bụ?
3. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-eche na Apọkalips na Amagedọn pụtara?
3 Ọ̀ bụ na a dịghị akpọkwa Mkpughe, Apọkalips? Otú ahụ ka ọ dị, ebe “mkpughe” bụ nsụgharị asụsụ Igbo nke okwu Grik bụ a·po·kaʹly·psis. Ọtụtụ ndị na-akọwa okwu ahụ bụ Apọkalips ịbụ mbibi ụwa site n’agha nuklia. N’otu obodo ukwu dị na Texas, U.S.A., bụ́ ebe e mepụtara ọtụtụ bọmbụ nuklia, ọtụtụ ndị okpukpe kwuru, sị, “Anyị ga-abụ ndị mbụ a ga-ebibi.” A kọrọ na ndị ụkọchukwu nọ n’ógbè ebe ahụ “kweere na ọ bụkwaghị nanị na Amagedọn bụ ihe a na-apụghị izere ezere, kama na ọ dịkwa nso, ọzọkwa, na agha ikpeazụ ahụ n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ, n’etiti Chineke na Setan, ga-ewere ọnọdụ dị ka oké mkpochapụ nke agha nuklia.”a
4. Gịnị ka okwu ahụ bụ “apọkalips” pụtara n’ezie, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka e ji nye akwụkwọ ikpeazụ nke Bible aha ahụ kwesịrị ekwesị bụ “Mkpughe”?
4 Ma gịnị ka apọkalips bụ n’ezie? Ọ bụ ezie na akwụkwọ ọkọwa okwu dị iche iche na-akọwa ya site n’iji okwu ndị dị ka “oké mbibi dị nso nke eluigwe na ala,” okwu Grik ahụ bụ a·po·kaʹly·psis pụtara n’ụzọ bụ isi “ikpughe” ma ọ bụ “ime ka a hụ ihe.” N’ihi nke a, e nyere akwụkwọ ikpeazụ nke Bible aha ahụ kwesịrị ekwesị bụ “Mkpughe.” N’ebe a anyị na-ahụ, ọ bụghị ozi efu nke mbibi ụwa, kama mkpughe nke eziokwu dị iche iche sitere n’aka Chineke ndị kwesịrị iwulite n’ime obi anyị ezi olileanya na okwukwe guzosiri ike.
5. (a) Olee ndị a ga-ebibi n’Amagedọn, olee ndị ga-alanarịkwa? (b) Ọdịnihu dị aṅaa nke magburu onwe ya na-echere ndị lanarịrịnụ?
5 N’eziokwu, a kọwara Amagedọn n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible dị ka “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Mkpughe 16:14, 16) Ma ọ ga-adị nnọọ iche n’oké mbibi nke agha nuklia! Mbibi dị otú ahụ ga-akpata mkpochapụ nke ihe nile dị ndụ n’elu ala. N’ụzọ na-eyighị nke ahụ, Okwu Chineke na-eme ka e nwee olileanya obi ụtọ nke bụ na nanị ndị mmebi iwu na-emegide Chineke ka a ga-ebibi—site n’aka ndị agha Chineke na-eduzi. (Abụ Ọma 37:9, 10; 145:20) Oké ìgwè mmadụ, ndị si ná mba nile, ga-agabiga mmezu ikpeazụ nke ihe Chineke kpere n’ikpe n’Amagedọn. Mgbe ahụ, Kraịst Jisọs ga-azụ ndị a dị ka atụrụ, durukwa ha jee ná ndụ ebịghị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs. Ọ̀ bụ na ị chọghị ịbụ otu n’ime ha? Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na akwụkwọ Mkpughe na-egosi na ị pụrụ ịbụ!—Mkpughe 7:9, 14, 17.
Ịchọpụta Ihe Omimi nke Chineke
6. N’afọ ndị gaworo aga, akwụkwọ dịgasị aṅaa ka Ndịàmà Jehova bipụtaworo iji kọwaa Mkpughe?
6 Laa azụ na 1917, Watch Tower Society bipụtara akwụkwọ bụ́ The Finished Mystery. Ọ bụ nkọwa e nyere n’amaokwu n’amaokwu banyere akwụkwọ Bible Ezikiel na Mkpughe. E mesịa, ka ihe na-eme n’ime ụwa nọgidere na-aga n’ihu ná mmezu nke amụma Bible, a kwadebere akwụkwọ nwere mpịakọta abụọ nke bịara n’ezi oge nke isiokwu ya bụ Light, wee wepụta ya na 1930. Nke a nyere ihe ọmụmụ kasị ọhụrụ nke Mkpughe. Ìhè nọgidere ‘na-enwuru ndị ezi omume,’ nke mere na n’afọ 1963, Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ ahụ nwere peji 704, bụ́ “Babylon the Great Has Fallen!” God’s Kingdom Rules! Nke a nyere nkọwa doro anya banyere akụkọ nke mbilite na ọdịda nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ihe e jikwa mechie ya bụ ntụle nke isi itoolu ndị ikpeazụ nke Mkpughe. Ka ‘okporo ụzọ nke ndị ezi omume nọgidere na-enwuwa dị ka ìhè,’ karịsịa n’ihe banyere ọrụ a na-arụ n’ọgbakọ, e wepụtara na 1969 akwụkwọ ahụ nwere 384 peji, bụ́ “Then Is Finished the Mystery of God,” nke tụlere isi 13 ndị mbụ nke Mkpughe.—Abụ Ọma 97:11; Ilu 4:18.
7. (a) Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji wepụta akwụkwọ a na-ekwu banyere Mkpughe? (b) Enyemaka ndị dị aṅaa ka e nwere n’akwụkwọ a nke ga-abara ndị na-agụ ya uru?
7 N’ihi gịnị ka e ji wepụta ma bipụtaghachi akwụkwọ ọzọ na-ekwu banyere Mkpughe n’oge a? Ihe e bipụtaworo banyere ya nyere nnọọ nkọwa hiri nne nke ukwuu, o kwebeghịkwa omume ịsụgharị ya wee bipụta ya gburugburu ụwa n’ọtụtụ asụsụ. N’ihi nke a, a hụrụ na o kwesịrị ekwesị ibipụta akwụkwọ banyere Mkpughe nke ga-enwe nanị otu mpịakọta, nke a ga-emekwa n’ụzọ ọ ga-adị mfe iwepụta ya n’ọtụtụ asụsụ. Ọzọkwa, e ji ohere nke ibipụta mpịakọta nke a mee ihe iwepụta ihe enyemaka e ji ezi ihe, gụnyere ihe osise, chaatị dị iche iche, na nchịkọta dị iche iche, ndị ga-enyere ndị na-agụ ya aka ịghọta nke ọma oké ịdị mkpa nke amụma nke a dị ebube.
8. Gịnị bụ ihe ọzọ nke siri ike ọbụna karị, nke mere e ji na-ebipụta akwụkwọ nke a?
8 Ọbụna ihe siri ike karị, nke mere e ji ebipụta akwụkwọ a bụ mkpa nke inwe nghọta ziri ezi nke eziokwu dị ka ọ dị ugbu a. Jehova nọgidere na-eme ka ìhè ka ukwuu na-enwukwasị nghọta nke Okwu ya, anyị pụkwara ịtụ anya na a ga-eme ka nghọta anyị nwere banyere Mkpughe na amụma ndị ọzọ na-adịwanye mma ka anyị na-abịaru nso mkpagbu ukwu ahụ. (Matiu 24:21; Mkpughe 7:14) Ọ dị mkpa ka anyị nwee ezi ihe ọmụma. Dị ka Pita onyeozi dere banyere amụma nke Chineke: “Unu na-emekwa nke ọma n’ịṅa ya ntị dị ka oriọna nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọcha kpakpando isi ụtụtụ wee biliekwa, n’ime obi unu.”—2 Pita 1:19, NW.
9. (a) Tinyere amụma ndị ọzọ, gịnị ka Mkpughe na-egosi na Chineke ga-eke? (b) Gịnị bụ ụwa ọhụrụ ahụ, oleekwa ụzọ ị pụrụ isi dị ndụ banye n’ime ya?
9 Mkpughe na-atụkwasị ihe àmà ya n’ọtụtụ amụma Bible ndị ọzọ, na-egosi na Jehova Chineke na-ezube ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. (Aịsaịa 65:17; 66:22; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1-5) N’ụzọ bụ isi, ozi dị n’ime ya dịịrị ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị Jisọs jiworo ọbara ya zụta ịghọ ndị ha na ya ga-eso chịa achịa n’ime eluigwe ọhụrụ ahụ. (Mkpughe 5:9, 10) Ma otú ọ dị, ozi ọma nke a ga-ewusi okwukwe nke ọtụtụ nde ndị ahụ ike, bụ́ ndị nwere olileanya inweta ndụ ebighị ebi n’okpuru Alaeze Kraịst. Ị̀ bụ otu n’ime ndị a? Ya bụrụ otú ahụ, Mkpughe ga-ewusi olileanya gị nke ịdị ndụ n’ime Paradaịs ike, dị ka akụkụ nke ụwa ọhụrụ ahụ, na-enweta ịba ụba nke udo, ezi ahụ ike, na njubiga ókè nke onyinye Chineke nke na-adịghị agwụ agwụ. (Abụ Ọma 37:11, 29, 34; 72:1, 7, 8, 16) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịdị ndụ wee banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ọ dị oké mkpa, ee, ọ bụ ihe ị na-aghaghị ime, ịṅa ntị ná nkọwa doro anya nke Mkpughe banyere oké ihe omume ikpeazụ ahụ nke dị nso ugbu a.—Zefanaịa 2:3; Jọn 13:17.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Süddeutsche Zeitung, Munich, Germany, January 24, 1987.
[Foto dị na peeji nke 7]