Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 12/1 p. 9-14
  • “Ozi Obi Ụtọ” Sitere n’Apọkalips

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ozi Obi Ụtọ” Sitere n’Apọkalips
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Nkwusa nke Ozi Obi Ụtọ
  • Ihe Mkpughe Nwere Maka Anyị
  • Nwa Atụrụ ahụ nke Kwesịrị Nsọpụrụ
  • “Ikpe Ya Nile Bụ Eziokwu Bụrụkwa Ikpe Ziri Ezi”
  • Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ Dị Ebube
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Mkpughe—Mmezu Ya nke Na-enye Obi Ụtọ!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Mkpughe na Gị Onwe Gị
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 12/1 p. 9-14

“Ozi Obi Ụtọ” Sitere n’Apọkalips

“M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, [dị ka ozi obi ụtọ, NW ].”—MKPUGHE 14:6.

1. Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova kwere na e ji ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ Apọkalips, n’ihi gịnị ka ha na-ejighị bụrụ “ịrọ òtù nke apọkalips”?

N’ỤZỌ megidere ebubo ndị a na-ebo ha, Ndịàmà Jehova abụghị “ịrọ òtù nke apọkalips” ma ọ bụ “òtù nzuzo nke ụbọchị ikpe.” Otú ọ dị, ha na-anakwere Apọkalips, ma ọ bụ akwụkwọ Mkpughe, dị ka akụkụ nke Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. N’eziokwu, Mkpughe nwere ozi ikpe ọmụma megide ndị na-emebi iwu. Ma n’ozi ihu ọha ha, ndị ohu Chineke na-elekwasị anya n’ụzọ bụ́ isi n’olileanya dị ebube e dekọrọ n’ime Bible, gụnyere nke ahụ dị n’Apọkalips, ma ọ bụ Mkpughe. N’ihi ya, ha adịghị etinye ma ọ bụ na-ewepụ ihe ọ bụla n’okwu amụma ndị ahụ dị n’ime ya. —Mkpughe 22:18, 19.

Ndị Nkwusa nke Ozi Obi Ụtọ

2. Olee ụfọdụ akụkụ akwụkwọ nsọ Ndịàmà Jehova na-ejikarị eme ihe n’ọrụ nkwusa ha?

2 Ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ a na-ehotakarị maka ozi ihu ọha nke Ndịàmà Jehova bụ okwu Jisọs bụ́: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Gịnịkwa bụ “ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe”? Ọtụtụ Ndịàmà ga-aza ya site n’ihota amaokwu ndị sitere ná Mkpughe isi nke 20 na 21 bụ́ ndị na-ezo aka n’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst na n’ọchịchị Alaeze ya na ọha mmadụ, ebe ọnwụ, iru újú, na ahụ ụfụ “agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 20:6; 21:1, 4.

3. Olee ozi ya na ozi ihu ọha nke Ndịàmà Jehova kwekọrọ?

3 Dị ka ndị nkwusa nke ozi obi ụtọ ndị a, Ndịàmà Jehova bụ n’ezie ọnụ na-ekwuchitere onye ozi ihe atụ nke si n’eluigwe bụ́ onye a kọwakwara ọrụ e nyere ya ná Mkpughe. “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, [dị ka ozi obi ụtọ, NW], bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” (Mkpughe 14:6) “Ozi ọma ebighị ebi” ahụ na-agụnye ịma ọkwa bụ́ na “alaeze [ma ọ bụ, ịchịisi] nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị, na nke Kraịst Ya” nakwa na “oge” Jehova eruwo maka “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” (Mkpughe 11:15, 17, 18) Nke ahụ ọ́ bụghị ozi ọma n’ezie?

Ihe Mkpughe Nwere Maka Anyị

4. (a) Olee eziokwu ndị bụ́ isi e depụtara n’isi 1 nke Mkpughe? (b) Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị chọrọ irite uru n’ozi obi ụtọ ahụ?

4 Isi mbụ nke akwụkwọ Mkpughe na-egosi Jehova dị ka “Alfa ahụ na Omega ahụ, . . . Onye na-adị adị, Onye dịkwarị, Onye na-abịakwa, Onye pụrụ ime ihe nile.” Ọ na-akọwakwa Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, dị ka “onye àmà kwesịrị ntụkwasị obi,” “onye e buru ụzọ mụọ n’etiti ndị nwụrụ anwụ,” bụrụkwa “onyeisi nke ndị eze ụwa.” Ọ na-ekwukwa banyere Jisọs dị ka “Onye ahụ Nke na-ahụ anyị n’anya, Onye tọpụkwara anyị ná mmehie nile anyị n’ime ọbara Ya.” (Mkpughe 1:5, 8) N’ụzọ dị otú a, site ná mmalite, Mkpughe na-ekwupụta eziokwu ndị bụ́ isi na-azọpụta ndụ. “Ndị na-anọdụ n’elu ụwa” agaghị erite uru n’ozi obi ụtọ ahụ e ziteere ha ọ gwụla ma ha nakweere ọbụbụeze Jehova, nwee okwukwe n’ọbara Jisọs wụfuru, ma kwere na Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ nakwa na Kraịst bụzi Onye Ọchịchị ụwa nke Chineke họpụtara.—Abụ Ọma 2:6-8.

5. Ọrụ dị aṅaa ka a kọwara na Kraịst na-arụ n’isi nke 2 na nke 3 nke Mkpughe?

5 Isi abụọ na-esonụ na-egosi Kraịst Jisọs dị ka Onye Nlekọta na-ahụ n’anya bi n’eluigwe nke na-elekọta ọgbakọ ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa. Akwụkwọ ahụ e degaara ọgbakọ ndị Kraịst asaa dị n’Asia Minor na narị afọ mbụ O.A. nwere agbamume na ndụmọdụ siri ike bụ́ ndị ka dị irè taa. Ozi ahụ e zigaara ọgbakọ ndị ahụ na-ejikarị okwu ndị dị ka “amatara m ọrụ gị nile” ma ọ bụ “amatara m mkpagbu gị” amalite. (Mkpughe 2:2, 9) Ee, Kraịst maara kpọmkwem ihe na-aga n’ọgbakọ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ jara ụfọdụ mma maka ịhụnanya, okwukwe, ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ozi, ntachi obi, na ikwesị ntụkwasị obi ha n’ebe aha na okwu ya dị. Ndị ọzọ ka ọ baara mba n’ihi na ha ekwewo ka ịhụnanya ha n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ jụọ oyi, ma ọ bụ na ha adabawo ná mmekọahụ rụrụ arụ, ikpere arụsị, ma ọ bụ ịrọ òtù nke ndị si n’ezi ofufe dapụ.

6. Gịnị ka ọhụụ ahụ e dekọrọ n’isi nke 4 na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta?

6 Isi nke 4 na-enye ọhụụ na-akpali egwu banyere ocheeze eluigwe nke Jehova Chineke. Ọ na-eme ka a hụperetụ ebube nke ọnụnọ Jehova nakwa nke ndokwa e mere n’eluigwe maka ọchịchị nke ọ ga-eji eme ihe. Ndị ọchịchị ahụ e kpukwasịrị okpueze, bụ́ ndị ocheeze ha gbara ocheeze bụ́ isi nke eluigwe na ala gburugburu, na-akpọ isiala nye Jehova ma na-ekwupụta, sị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịịrị, ka e kekwara ha eke.”—Mkpughe 4:11.

7. (a) Gịnị ka mmụọ ozi ahụ na-akpọ ndị bi n’ụwa òkù ime? (b) Gịnị bụ otu akụkụ dị mkpa nke ọrụ izi ihe anyị?

7 Ọ̀ dị ihe nke a pụtara nye ndị mmadụ taa? N’ezie ọ dị. Ọ bụrụ na ha chọrọ ndụ n’okpuru Alaeze Narị Afọ Iri ahụ, ha aghaghị ịṅa ntị n’ihe ‘mmụọ ozi ahụ na-efe n’etiti eluigwe’ na-ekwusa : “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto; n’ihi na oge awa nke ikpe Ya abịawo.” (Mkpughe 14:6, 7) Otu n’ime nzube ndị bụ́ isi nke ọrụ nkụzi Bible nke Ndịàmà Jehova na-arụ bụ inyere “ndị na-anọdụ n’elu ụwa” aka ịmara ma fee Jehova, nakwere na ọ bụ Onye Okike, ma jiri obi ha na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze ezi omume ya.

Nwa Atụrụ ahụ nke Kwesịrị Nsọpụrụ

8. (a) È si aṅaa gosi Kraịst n’isi nke 5 na nke 6? (b) Gịnị ka ndị nile na-ege ntị n’ozi obi ụtọ ahụ pụrụ ịmụta site n’ọhụụ a?

8 Isiakwụkwọ abụọ ndị na-esonụ, nke 5 na nke 6, na-egosi Jisọs Kraịst dị ka Nwa Atụrụ nke kwesịrị ekwesị ịsaghe otu akwụkwọ nke nwere akara asaa, si otú a na-eji asụsụ ihe atụ ekpughe ihe ndị na-eme n’oge anyị. (Tụlee Jọn 1:29.) Olu ndị si n’eluigwe na-agwa Nwa Atụrụ ihe atụ a, sị: “I kwesịrị ịnata akwụkwọ ahụ, na ịsaghe akara ya: n’ihi na e gburu Gị egbu, I werekwa ọbara Gị gbatara Chineke mmadụ si n’ebo nile ọ bula, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla, pụta, I wee mee ha ka ha bụrụ alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị; ha bụkwa eze n’elu ụwa.” (Mkpughe 5:9, 10) Ọhụụ a na-akụzi na ná ndabere nke ọbara Kraịst wụfuru, a na-akpọ ụfọdụ mmadụ site ná mba nile ịbịa nọnyere ya n’eluigwe ma ‘bụrụ eze n’elu ụwa.’ (Tụlee Mkpughe 1:5, 6.) E mesịrị kpughee ọnụ ọgụgụ ha a kpaara ókè ná Mkpughe.

9. Olee otú e si gosi Kraịst n’isi nke 6?

9 N’ọhụụ ọzọ, a na-egosi Kraịst dị ka onye e kpukwasịrị okpueze nke na-agba ịnyịnya ọcha, na-aga n’ihu “na-emeri, ya na ka O wee merie.” N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ ga-emeri mmetụta ọjọọ nke ndị ịnyịnya atọ ndị ọzọ nke Apọkalips sere onyinyo ha, bụ́ ndị oké ọsọ ha wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ agha, ụnwụ nri, na ọnwụ kemgbe afọ ahụ dị oké mkpa bụ́ 1914. (Mkpughe 6:1-8) Ọrụ pụrụ iche Kraịst, bụ́ Nwa Atụrụ Chineke, na-arụ ná nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ nakwa ná mmezu nke nzube ndị dị ebube nke Jehova bụ isiokwu bụ́ isi nke ọrụ nkụzi Bible Ndịàmà Jehova na-arụ.

10. (a) Olee ihe ọmụma dị mkpa a na-enye n’isi nke 7? (b) Olee otú Kraịst si kwuo okwu banyere ndị na-anata Alaeze ahụ?

10 Isi nke 7 nwere ozi obi ụtọ n’ezie. Ọ bụ nanị n’akwụkwọ Mkpughe ka anyị na-ahụ ọnụ ọgụgụ nke ndị Jisọs kpọrọ “ìgwè atụrụ nta” ahụ bụ́ ndị Nna Nwa Atụrụ ahụ na-enye Alaeze. (Luk 12:32; 22:28-30) Jehova Chineke ji mmụọ ya kaa ndị a akara. (2 Ndị Kọrint 1:21, 22) Jọn onyeozi, bụ́ onye natara Mkpughe ahụ, na-agba akaebe, sị: “M wee nụ ọnụ ọgụgụ ndị a kararịị, [narị puku na iri puku anọ na anọ].” (Mkpughe 7:4) N’isiakwụkwọ nke ka dị n’ihu, e mesiri ya ike na ọnụ ọgụgụ a a kpọrọ aha bụ ngụkọta nke ndị “a gbatara n’etiti mmadụ” iso Nwa Atụrụ ahụ chịa n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe. (Mkpughe 14:1-4) N’ụzọ na-akpali mmasị, ọ bụ ezie na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm na-enye nkọwa ndị na-edoghị anya na ndị na-erijughị afọ banyere ọnụ ọgụgụ a, ọkà mmụta Bible bụ́ E. W. Bullinger na-ekwu banyere ya, sị: “Ọ bụ eziokwu e kwuru n’ụzọ dị mfe: ọnụ ọgụgụ a kpọrọ aha nke dị iche n’ọnụ ọgụgụ ahụ a na-akpọghị aha n’isiakwụkwọ a kpọmkwem.”

11. (a) Olee ozi obi ụtọ ndị a ga-ahụ n’isi nke 7? (b) Olee atụmanya ndị na-emeghere ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ?

11 Olee ọnụ ọgụgụ a na-akpọghị aha nke Bullinger na-ezo aka na ya? N’amaokwu nke 9, Jọn onyeozi dere, sị: “Mgbe ihe ndị a gasịrị m wee hụ, ma lee, oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” (Mkpughe 7:9) Olee ndị mejupụtara oké ìgwè mmadụ a, gịnị bụ ọnọdụ ha nwere ugbu a n’ebe Chineke nọ, gịnịkwa ka ọdịnihu ga-abụrụ ha? Azịza Apọkalips na-enye bụụrụ ndị bi n’ụwa ozi ọma. Anyị na-agụ, sị: “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta, ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ.” Site n’okwukwe ha nwere n’ọbara Kraịst wụfuru, a ga-echebe ha “n’oké mkpagbu ahụ.” Kraịst “ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ: Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” (Mkpughe 7:14-17) Ee, ọtụtụ nde ndị dị ndụ taa pụrụ ịghọ akụkụ nke ìgwè mmadụ ahụ a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ́ ndị ga-alanarị ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a. Dị ka ndị Eze ahụ bụ́ Jisọs Kraịst ga-achị n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ya, ọ ga-eduru ha gaa ná ndụ ebighị ebi n’ụwa. Nke ahụ ọ́ bụghị ozi ọma?

“Ikpe Ya Nile Bụ Eziokwu Bụrụkwa Ikpe Ziri Ezi”

12, 13. (a) Gịnị dị n’isi nke 8 ruo 19? (b) Gịnị mere amụma ndị dị otú ahụ na-ejighị kwesị inye ndị nwere obi eziokwu nsogbu?

12 Ọ bụ Isi nke 8 ruo 19 mere n’ụzọ bụ́ isi ka a mara akwụkwọ Apọkalips, ma ọ bụ Mkpughe, dị ka akwụkwọ na-ebu amụma ọdachi ndị na-eyi egwu. Ha nwere ozi ikpe ndị dị ike (bụ́ ndị ụda opi, ihe otiti, na ọkwa nke iwe Chineke sere onyinyo ha) bụ́ ndị a kpọsara megide akụkụ dị iche iche nke usoro ihe Setan. A ga-ebu ụzọ mezuo ihe ndị a e kpere n’ikpe n’ahụ okpukpe ụgha (“Babilọn Ukwu ahụ”), e mesịzie, megide usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adịghị asọpụrụ Chineke, bụ́ ndị anụ ọhịa sere onyinyo ha.—Mkpughe 13:1, 2; 17:5-7, 15, 16.a

13 Isiakwụkwọ ndị a na-akọwa nhicha nke eluigwe, ebe a chụdatara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’elu ụwa. Nke a na-enye nkọwa ọ bụ nanị ya ka ezi uche dị na ya maka ahụhụ a na-enwetụbeghị ụdị ya n’ụwa kemgbe 1914. (Mkpughe 12:7-12) Ha jikwa asụsụ ihe atụ na-akọwa mbibi nke ajọ usoro ihe Setan n’ụwa. (Mkpughe 19:19-21) Ihe omume ndị a dị ịrịba ama hà kwesịrị ime ka ndị nwere obi eziokwu kụja? Ee e, n’ihi na mgbe a ga-emezu ihe Chineke kpere n’ikpe, usuu ndị nọ n’eluigwe ga-eti mkpu, sị: “Haleluya; Nzọpụta nile na otuto nile na ike nile na-adịrị Chineke anyị: n’ihi na ikpe Ya nile bụ eziokwu bụrụkwa ikpe ziri ezi.”—Mkpughe 19:1, 2.

14, 15. (a) À ga-esi aṅaa weta ajọ usoro ihe dị ugbu a ná njedebe n’ụzọ ezi omume? (b) N’ihi gịnị ka akụkụ a nke Apọkalips kwesịrị iji bụrụ ihe ọṅụ nye ndị nwere obi eziokwu?

14 Jehova agaghị eweta usoro ihe ezi omume n’ebibighị ndị na-emebi ụwa. (Mkpughe 11:17, 18; 19:11-16; 20:1, 2) Otú ọ dị, ọ dịghị mmadụ ma ọ bụ ọchịchị nke nwere ikike ma ọ bụ ike imezu nke a. Ọ bụ nanị Jehova na Eze na Ọkàikpe ọ họpụtara, bụ́ Kraịst Jisọs, pụrụ ime nke a n’ezi omume.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9.

15 Dị ka Apọkalips na-egosi nnọọ n’ụzọ doro anya, Jehova na-ezube iweta ajọ usoro ihe dị ugbu a ná njedebe. Eziokwu a kwesịrị ịbụ ihe ọṅụ nye ndị ikom na ndị inyom “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme.” (Ezikiel 9:4) Nke a kwesịrị ịkụbanye n’ime ha mkpa ọ dị ịṅa ntị ngwa ngwa n’òkù mmụọ ozi ahụ nke bu ozi obi ụtọ ahụ kpọrọ, bụ́ onye kwupụtara, sị: “Tụọnụ egwu Chineke, . . . n’ihi na oge awa nke ikpe Ya abịawo: kpọọkwanụ isiala nye Ya, bụ́ Onye kere eluigwe na ala.” (Mkpughe 14:7) Ka ndị dị otú ahụ sonyere Ndịàmà Ya , “bụ́ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs,” na-efe ma na-ejere Jehova ozi.—Mkpughe 12:17.

Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ Dị Ebube

16. (a) N’ihi gịnị ka chọọchị dị iche iche nke Krisendọm jiworo jụ olileanya nke Narị Afọ Iri ahụ? (b) Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji kwere na a ga-aza ekpere nlereanya ahụ?

16 Isi nke 20 ruo 22 nke akwụkwọ Mkpughe nwere ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka inwe olileanya na Narị Afọ Iri ahụ. N’ezie, nke a bụ nanị akụkụ Bible nke kwuru banyere otu puku afọ nke ga-abụ mmalite nke obi ụtọ ebighị ebi n’eluigwe nakwa n’elu ụwa. Chọọchị dị iche iche nke Krisendọm ajụwo olileanya nke Narị Afọ Iri ahụ. Ebe ọ bụ na nkwenkwe chọọchị bụ na ndị ezi omume na-aga eluigwe ebe ndị ajọ omume na-aga hel, o nweghị ọnọdụ ọ bụla maka ụwa paradaịs. Ekpere nlereanya ahụ, bụ́ nke na-arịọ ka “e mee uche [Chineke] n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe,” enwekwaghị ihe ọ bụla ọ pụtara nye ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ekpe chọọchị nile nke Krisendọm. (Matiu 6:10, New International Version) Ma ọ dịghị otú ahụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Ha kwenyesiri ike na Jehova Chineke ekeghị ụwa ka ọ “tọgbọrọ n’efu,” kama “ka e wee biri n’ime ya.” (Aịsaịa 45:12, 18) N’ụzọ dị otú a, amụma oge ochie, ekpere nlereanya ahụ, na olileanya apọkalips nke Narị Afọ Iri ahụ, kwekọrịtachara. N’oge Ọchịchị Puku Afọ ya, Kraịst ga-ahụ na e mere uche Jehova n’ụwa, ọbụna dị ka e si eme ya n’eluigwe.

17. Gịnị na-egosi na e kwesịrị ịghọta “puku afọ ahụ” n’ụzọ nkịtị?

17 Okwu ahụ bụ́ “otu puku afọ” na-apụta ugboro isii n’amaokwu asaa ndị mbụ nke Mkpughe isi nke 20. Ihe kwesịrị ịrịba ama bụ́ eziokwu ahụ bụ́ na e ji ya na okwu bụ́ “ahụ” mee ihe ugboro anọ, na-egosi na ọ na-ezo aka na narị afọ iri nkịtị, ọ bụghị nnọọ n’ogologo oge a na-ekwughị otú ọ hà, dị ka ọtụtụ ndị Krisendọm na-enye nkọwa ga-achọ ime ka anyị kwere. Gịnị ga-ewere ọnọdụ na Narị Afọ Iri ahụ? Nke mbụ, a ga-eme ka Setan ghara ịrụ ihe ọ bụla n’oge ahụ dum. (Mkpughe 20:1-3; tụlee Ndị Hibru 2:14.) Lee ozi ọma nke ahụ bụ!

18. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ Narị Afọ Iri ahụ “ụbọchị” ikpe? (b) Gịnị ga-eme mgbe puku afọ ahụ gwụrụ?

18 Ebe ọ bụ na a ga-ewere “[ike ikpe] ikpe” nye ndị “ga-esokwa Ya [Kraịst] bụrụ eze [otu puku afọ] ahụ,” n’ezie, oge a ga-abụ, otu puku afọ nke “ụbọchị” ikpe. (Mkpughe 20:4, 6; tụlee Ọrụ 17:31; 2 Pita 3:8.) A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, a ga-ekpekwa ha na ndị lanarịrị ‘oké mkpagbu ahụ’ ikpe n’ụzọ ha nhata dị ka ọrụ, ma ọ bụ omume ha si dị, n’oge ahụ. (Mkpughe 20:12, 13) Ná ngwụsị nke puku afọ ahụ, a ga-atọhapụ Setan ruo nwa oge iji lee ihe a kpọrọ mmadụ ule ikpeazụ, mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-ebibi ya, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ndị nnupụisi ọ bụla nọ n’ụwa bụ́ ndị sooro ya, ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 20:7-10) A ga-edeba aha ụmụ mmadụ bụ́ ndị gafere ule ahụ “n’akwụkwọ nke ndụ ahụ” n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ehichapụ, a ga-emekwa ka ha banye ná ndụ obi ụtọ ebịghị ebi, na-ejere Jehova ozi, na-efekwa ya ofufe n’ụwa paradaịs.—Mkpughe 20:14, 15; Abụ Ọma 37:9, 29; Aịsaịa 66:22, 23.

19. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na a ga-emezurịrị nkwa ndị ahụ dị ebube e depụtara n’akwụkwọ Mkpughe? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ihe ndị a bụ ozi obi ụtọ a kọwara n’Apọkalips. Ha abụghị nkwa efu nke mmadụ. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” (Mkpughe 21:5) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji kere òkè ná mmezu nke ozi obi ụtọ ndị a? Akwụkwọ Mkpughe nwere ọtụtụ ndụmọdụ maka ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Ịgbaso ndụmọdụ dị otú ahụ ga-ewetara anyị obi ụtọ na-enweghị ọgwụgwụ, ma ugbu a ma mgbe ebighị ebi, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Iji nweta nkọwa zuru ezu banyere akwụkwọ Mkpughe, lee akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1994.

Isi Ihe Ndị A Ga-atụleghachi

◻ Eziokwu ndị dị aṅaa bụ́ isi a na-achọta ná Mkpughe isi nke 4 ruo 6 mejupụtara otu akụkụ dị mkpa nke ozi obi ụtọ ahụ?

◻ Olee ozi obi ụtọ ndị a ga-ahụ ná Mkpughe isi nke 7?

◻ Gịnị mere ozi ikpe ndị a na-ahụ ná Mkpughe na-ejighị kwesị inye ndị nwere obi eziokwu nsogbu n’obi?

◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Narị Afọ Iri ahụ ga-eji bụrụ “ụbọchị” ikpe?

[Foto dị na peeji nke 10]

Eze Jisọs Kraịst ga-ewepụ agha, ụnwụ nri, na ọnwụ kpam kpam n’ụwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya