Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 12/1 p. 14-19
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọgbakọ nke Kraịst Na-eduzi
  • Iji Obi Ụtọ Na-anọ n’Okpuru Ọbụbụeze Jehova
  • ‘Obi Ụtọ Na-adịrị Onye Na-edebe Okwu Ndị A’
  • Mkpughe na Gị Onwe Gị
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Isi Nso
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • “Ozi Obi Ụtọ” Sitere n’Apọkalips
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 12/1 p. 14-19

Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe

“[Obi ụtọ, NW] na-adịrị onye na-agụ na ndị na-anụ okwu nile nke amụma nke a, ndị na-edebekwa ihe nile e deworo n’ime ya.”—MKPUGHE 1:3.

1. N’ọnọdụ dị aṅaa ka Jọn onyeozi nọ na ya mgbe o dere Mkpughe, ọ̀ bụkwa n’ihi nzube dị aṅaa ka e ji detuo ọhụụ ndị a edetu?

“MỤ ONWE m, bụ́ Jọn, . . . [nọ] n’àgwàetiti ahụ nke a na-akpọ Patmọs, n’ihi okwu Chineke na àmà Jisọs.” (Mkpughe 1:9) Ọ bụ n’ọnọdụ dị otú ahụ ka Jọn onyeozi nọ na ya dee akwụkwọ Apọkalips, ma ọ bụ Mkpughe. A na-eche na a chụgara ya Patmọs n’oge ọchịchị nke Eze Ukwu Domitian nke Rom (81-96 O.A.), bụ́ onye manyere ndị mmadụ ikere òkè n’ofufe eze ukwu ma ghọọ onye na-akpagbu ndị Kraịst. Ka Jọn nọ na Patmọs, ọ hụrụ ọhụụ dị iche iche bụ́ ndị o deturu. Ọ kọrọ ha, ọ bụghị iji menye ndị Kraịst oge gboo ụjọ, kama iji wusie ha ike, kasie ha obi, ma gbaa ha ume n’ihi ule ndị ha na-enwe na ndị ha ka ga-enwe.—Ọrụ 28:22; Mkpughe 1:4; 2:3, 9, 10, 13.

2. N’ihi gịnị ka ọnọdụ Jọn na ndị Kraịst ibe ya nọ na ya ji baara ndị Kraịst na-ebi n’oge a uru?

2 Ọnọdụ a nọ na ya dee akwụkwọ Bible a dị nnọọ mkpa nye ndị Kraịst na-ebi n’oge a. A na-akpagbu Jọn n’ihi na ọ bụ onye àmà nke Jehova na Ọkpara Ya, bụ́ Kraịst Jisọs. Ya na ndị Kraịst ibe ya bi n’ebe jupụtara n’ibu iro n’ihi na, ọ bụ ezie na ha na-agbalịsi ike ịbụ ezi ụmụ amaala, ha apụghị ikere òkè n’ofufe eze ukwu. (Luk 4:8) Ná mba ụfọdụ, ezi ndị Kraịst taa na-ahụta onwe ha n’ọnọdụ yiri nke ahụ, n’ebe Ọchịchị na-eweghara ikike nke ịkọwa ihe “ziri ezi n’ụzọ okpukpe.” Ya mere, lee ka okwu ndị ahụ a na-ahụ ná mmalite nke akwụkwọ Mkpughe si bụrụ ihe na-akasị obi: “[Obi ụto, NW ] na-adịrị onye na-agụ na ndị na-anụ okwu nile nke amụma nke a, ndị na-edebekwa ihe nile e deworo n’ime ya: n’ihi na oge ahụ dị nso.” (Mkpughe 1:3) Ee, ndị ji ịṅa ntị na nrubeisi na-agụ Mkpughe pụrụ ịchọta ezi obi ụtọ na ọtụtụ ngọzi.

3. Ònye bụ Isi Iyi nke Mkpughe ndị ahụ e nyere Jọn?

3 Ònye bụ́ Isi Iyi kasịnụ nke Mkpughe, oleekwa usoro e ji kpughee ya? Amaokwu mbụ na-agwa anyị, sị: “Mkpughe nke Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere Ya igosi ndị ohu Ya, bụ́ ihe na-aghaghị ịpụta n’isi nso: O wee site n’aka mmụọ ozi Ya ziga wee gosi Jọn ohu Ya.” (Mkpughe 1:1) N’ikwu ya n’ụzọ doro anya, Isi Iyi nke Mkpughe n’ezie bụ Jehova Chineke, bụ́ onye nyere ya Jisọs, Jisọs esikwa n’aka otu mmụọ ozi kpugheere ya Jọn. Imetụkwu nnyocha na-ekpughe na Jisọs jikwa mmụọ nsọ mee ihe iji zigara ọgbakọ dị iche iche ozi na iji mee ka Jọn hụ ọhụụ.—Mkpughe 2:7, 11, 17, 29; 3:6, 13, 22; 4:2; 17:3; 21:10; tụlee Ọrụ 2:33.

4. Olee otú Jehova ka si eduzi ndị ya nọ n’ụwa taa?

4 Jehova ka na-eji Ọkpara ya, bụ́ “isi nzukọ Ya,” eme ihe ịkụziri ndị ohu ya nọ n’ụwa ihe. (Ndị Efesọs 5:23; Aịsaịa 54:13; Jọn 6:45) Jehova na-ejikwa mmụọ ya akụziri ndị ya ihe. (Jọn 15:26; 1 Ndị Kọrint 2:10) Dịkwa nnọọ ka Jisọs si jiri “Jọn ohu Ya” mee ihe iji nye ọgbakọ ndị e nwere na narị afọ mbụ nri ime mmụọ na-edozi ahụ, n’otu aka ahụ taa, ọ na-eji “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” bụ́ nke “ụmụnna” ya e tere mmadụ nọ n’ụwa mejupụtara, eme ihe iji nye ezinụlọ ya na ndị enyi ha ‘nri ime mmụọ n’oge ya.’ (Matiu 24:45-47; 25:40) Obi ụtọ na-adịrị ndị maara Isi Iyi nke “ezi onyinye” ndị anyị na-enweta n’ụdị nri ime mmụọ nakwa usoro O ji na-eme ihe.—Jemes 1:17.

Ọgbakọ nke Kraịst Na-eduzi

5. (a) Gịnị ka e ji tụnyere ọgbakọ ndị Kraịst na ndị nlekọta ha? (b) N’agbanyeghị ezughị okè mmadụ, gịnị ga-atụnye ụtụ n’obi ụtọ anyị?

5 N’isiakwụkwọ ndị mbụ nke Mkpughe, e ji ọgbakọ ndị Kraịst tụnyere ihe ịdọba oriọna. E ji ndị nlekọta ha tụnyere ndị mmụọ ozi (ndị ozi) nakwa kpakpando. (Mkpughe 1:20)a N’ikwu banyere onwe ya, Kraịst gwara Jọn ka o dee, sị: “Ihe ndị a ka Ọ na-ekwu, bụ́ Onye na-eji kpakpando asaa ahụ n’aka nri Ya, Onye na-ejegharị n’etiti ihe ịdọba oriọna asaa ahụ nke e ji ọlaedo mee.” (Mkpughe 2:1) Ozi asaa ahụ e zigaara ọgbakọ asaa ahụ dị n’Esia na-egosi na na narị afọ mbụ O.A., ọgbakọ dị iche iche na ndị okenye ha nwere ebe ha dị ike na ebe ha na-adịghị ike. Otú ahụ ka ọ dị taa. Ya mere, anyị ga-aka enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị echefutụghị eziokwu ahụ bụ́ na Kraịst, bụ́ Isi anyị, nọ n’etiti ọgbakọ ya. Ọ maara kpọmkwem ihe na-aganụ. N’ụzọ ihe atụ, ndị nlekọta nọ “n’aka nri Ya,” ya bụ, n’okpuru nduzi na ntụziaka ya, ha ga-azakwa ya ajụjụ maka otú ha si na-azụ ọgbakọ dị ka atụrụ.—Ọrụ 20:28; Ndị Hibru 13:17.

6. Gịnị na-egosi na ọ bụghị nanị ndị nlekọta ga-aza ajụjụ n’ihu Kraịst?

6 Otú ọ dị, anyị ga na-aghọgbu onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị echee na ọ bụ nanị ndị nlekọta ga-aza Kraịst ajụjụ maka ihe ndị ha mere. N’otu n’ime ozi ya, Kraịst kwuru, sị: “Nzukọ Kraịst nile ga-amarakwa na Mụ onwe m bụ onye na-enyocha akụrụ na obi nile: M ga-enyekwa unu n’otu n’otu dị ka ọrụ nile unu si dị.” (Mkpughe 2:23) Nke a bụ ma ịdọ aka ná ntị ma agbamume—ịdọ aka ná ntị na Kraịst maara ebumnobi anyị ndị gbamiri mkpọrọgwụ, agbamume n’ihi na ọ na-emesi anyị obi ike na Kraịst maara mgbalị ndị anyị na-eme, na ọ ga-agọzikwa anyị ma ọ bụrụ na anyị emee ihe anyị pụrụ ime.—Mak 14:6-9; Luk 21:3, 4.

7. Olee otú ndị Kraịst nọ na Filadelfịa siworo ‘debe okwu nke ntachi obi Jisọs’?

7 Kraịst abaghị mba n’ozi o zigaara ọgbakọ dị n’obodo Filadelfịa nke dị na Lidia, ma o kwere nkwa nke kwesịrị ịmasịkarịsị anyị. “N’ihi na i debere okwu nke ntachi obi m, Mụ onwe m ga-edebekwa gị ka ị ghara ịba n’oge awa nke ọnwụnwa ahụ, bụ́ oge awa nke gaje ịbịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi, ịnwa ndị bi n’elu ụwa.” (Mkpughe 3:10) Okwu Grik e ji mee ihe maka “debere okwu nke ntachi obi m” pụkwara ịpụta “mere ihe m kwuru banyere ntachi obi.” Amaokwu nke 8 na-enye echiche na ọ bụghị nanị na ndị Kraịst nọ na Filadelfịa rubere isi n’iwu Kraịst kama ha gbasoro ndụmọdụ ya nke iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’onwe ha.—Matiu 10:22; Luk 21:19.

8. (a) Olee nkwa Jisọs kwere ndị Kraịst nọ na Filadelfịa? (b) Olee ndị ‘oge awa nke ọnwụnwa ahụ’ na-emetụta taa?

8 Jisọs gbakwụnyere na ọ ga-edebe ha ka ha ghara ịba “n’oge awa nke ọnwụnwa.” Anyị amaghị kpọmkwem ihe nke ahụ pụtaara ndị Kraịst ahụ laa azụ n’oge ahụ. Ọ bụ ezie na a kwụsịtụrụ mkpagbu ahụ mgbe Domitian nwụsịrị na 96 O.A., mkpagbu ọhụrụ kpụ ọkụ n’ọnụ malitere n’okpuru ọchịchị Trajan (98-117 O.A.), obi abụọ adịghị ya na nke ahụ wetakwuru ule. Ma ‘oge awa nke ọnwụnwa’ bụ́ isi na-ewere ọnọdụ “n’ụbọchị Onyenwe anyị” na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” bụ́ ebe anyị nọ ugbu a. (Mkpughe 1:10; Daniel 12:4) Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ banyere n’oge ọnwụnwa kpọmkwem n’Agha Ụwa Mbụ nakwa ngwa ngwa ọ gasịrị. Ma, ‘oge awa nke ọnwụnwa’ ahụ ka na-aga n’ihu. Ọ na-emetụta “elu ụwa dum mmadụ bi,” gụnyere ọtụtụ nde ndị mejupụtara oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị na-enwe olileanya ịlanarị oké mkpagbu ahụ. (Mkpughe 3:10; 7:9, 14) Anyị ga-abụ ndị nwere obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ‘emee ihe Jisọs kwuru banyere ntachi obi,’ ya bụ: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13.

Iji Obi Ụtọ Na-anọ n’Okpuru Ọbụbụeze Jehova

9, 10. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ọhụụ nke ocheeze Jehova kwesịrị isi metụta anyị? (b) Olee otú anyị ịgụ Mkpughe pụrụ isi tụnye ụtụ n’obi ụtọ anyị?

9 Ọhụụ nke ocheeze Jehova na nke nzukọ eluigwe ya bụ́ ndị e gosiri n’isi nke 4 na nke 5 nke Mkpughe kwesịrị ime ka anyị jupụta n’egwu. Anyị kwesịrị inwe mmasị n’okwu otuto ndị sitere n’ezi obi nke ihe ndị e kere eke dị ike n’eluigwe kwuru ka ha ji ọṅụ na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze ezi omume Jehova. (Mkpughe 4:8-11) E kwesịrị ịnụ olu anyị n’etiti ndị ahụ na-asị: “Ọ bụ Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, Ya na Nwa atụrụ ahụ, ka ngọzi nile na nsọpụrụ nile na otuto nile na ike nile dịịrị ruo mgbe nile ebịghị ebi.”—Mkpughe 5:13.

10 N’ụzọ dị irè, nke a pụtara anyị iji ọṅụ na-eme uche Jehova n’ihe nile. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe nile ọ bụla unu na-emekwa, n’okwu ma ọ bụ n’ọrụ, na-emenụ ha nile n’aha Onyenwe anyị Jisọs, na-ekele Chineke, bụ́ Nna anyị, site n’aka Ya.” (Ndị Kọlọsi 3:17) Anyị ịgụ Mkpughe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ n’ezie ma ọ bụrụ na n’ime ime uche na obi anyị, anyị anakwere ọbụbụeze Jehova ma na-eburu ọchịchọ ya n’uche n’akụkụ nile nke ndụ anyị.

11, 12. (a) À ga-esi aṅaa mee ka usoro ihe ụwa Setan maa jijiji ma bibie ya? (b) Dị ka Mkpughe isi nke 7 si kwuo, olee ndị ‘ga-enwe ike iguzo’ n’oge ahụ?

11 Iji ọṅụ na-anọ n’okpuru ọbụbụeze Jehova bụ ihe ndabere maka obi ụtọ onwe onye nakwa nke eluigwe na ala. N’oge na-adịghị anya, oké ala ọma jijiji ihe atụ ga-eme ka usoro ihe ụwa Setan maa jijiji ruo na ntọala ya kpọmkwem ma bibie ya. A gaghị enwe ebe mgbaba maka ụmụ mmadụ bụ́ ndị jụrụ ido onwe ha n’okpuru ọchịchị Alaeze eluigwe Kraịst, nke na-anọchite anya ọbụbụeze Chineke bụ́ nke kwesịrị ekwesị. Amụma ahụ na-ekwu, sị: “Ndị eze nke ụwa, na ndị amadị, na ndị isi ọchịagha, na ndị ọgaranya, na ndị dị ike, na ohu ọ bụla, na onye ọ bụla nweere onwe ya, wee zobe onwe ha n’ime ọgbà na n’ime oké nkume nke ugwu; ha na-asịkwa ugwu na oké nkume ahụ, Dakwasịnụ anyị, zopụ anyị n’ihu Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, zopụkwa anyị n’iwe nke Nwa atụrụ ahụ: n’ihi na oké ụbọchị nke iwe ha abịawo; ònye pụkwara iguzo?”—Mkpughe 6:12, 15-17.

12 Banyere ajụjụ ahụ, n’isiakwụkwọ na-esonụ, Jọn onyeozi na-akọwa ndị mejupụtara oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta, dị ka ndị “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:9, 14, 15) Ha iguzo n’ihu ocheeze Chineke na-egosi na ha nakweere ocheeze ahụ ma na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Jehova n’ụzọ zuru ezu. N’ihi ya, ha bụ ndị a na-anara nke ọma.

13. (a) Gịnị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ụwa na-efe ofufe, gịnịkwa ka akara ahụ dị n’egedege ihu ha ma ọ bụ n’aka ha na-ese onyinyo ya? (b) Ya mere n’ihi gịnị ka ntachi obi ga-eji dị mkpa?

13 N’aka nke ọzọ, isi nke 13 na-akọwa ndị fọdụrụ ná ndị bi n’ụwa dị ka ndị na-efe usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị Setan, bụ́ nke anụ ọhịa sere onyinyo ya. Ha na-anabata akara “n’egedege ihu” ha ma ọ bụ “n’aka” ha, bụ́ nke na-egosi nkwado ha ji uche na ọkpụkpụ aka ha na-akwado usoro ihe ahụ. (Mkpughe 13:1-8, 16, 17) Mgbe ahụ, isi nke 14 na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na ihe oyiyi ya, na-anatakwa akara ya n’egedege ihu ya, ma ọ bụ n’aka ya, ya onwe ya ga-aṅụkwa n’ime mmanya nke ọnụma Chineke, nke e doziworo n’agwaghị agwa n’ime iko nke iwe Ya . . . N’ebe a ka ntachi obi ndị nsọ dị, bụ́ ndị na-edebe ihe Chineke nyere n’iwu, na okwukwe Jisọs.” (Mkpughe 14:9, 10, 12) Ka oge na-aga, ajụjụ ga-abụwanye: Ònye ka ị na-akwado? Jehova na ọbụbụeze ya ka ọ̀ bụ usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ́ nke anụ ọhịa sere onyinyo ya? Obi ụtọ ga-adịrị ndị na-ezere ịnara akara anụ ọhịa ahụ, ndị jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ido onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Jehova.

14, 15. Olee ozi mere ka Mkpughe kwụsịtụ nkọwa ya banyere Amagedọn, gịnị ka ọ pụtaara anyị?

14 Ndị na-achị “elu ụwa dum mmadụ bi” na-aga ịsọkọta isi, ha na-aga ibuso Jehova agha n’okwu metụtara ọbụbụeze. Ebe ọ ga-akpọtụ ga-abụ n’Amagedọn, bụ́ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile.” (Mkpughe 16:14, 16) Okwu ndị na-akpali akpali e ji akara ngebichi gebichie dị kpọmkwem n’etiti nkọwa ahụ e nyere banyere ịchịkọta ndị ọchịchị ụwa maka ibuso Jehova agha. Jisọs n’onwe ya batara n’ọhụụ ahụ iji kwuo, sị: “Lee, ana m abịa dị ka onye ohi. [Obi ụtọ, NW] na-adịrị onye na-eche nche, na-edebekwa uwe ya, ka ọ ghara ijegharị n’ọtọ, ha wee hụ ihere ya.” (Mkpughe 16:15) Nke a pụrụ izo aka n’ebe ndị Livaị na-eche nche n’ụlọ nsọ nọ bụ́ ndị a na-agba ọtọ ma menye ha ihere n’ihu ọha ma ọ bụrụ na a hụ ha ka ha na-ehi ụra n’oge ha na-eche nche.

15 Ozi ahụ doro anya: Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịlanarị Amagedọn, anyị aghaghị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma yiri uwe ihe atụ ahụ nke na-egosipụta anyị dị ka Ndịàmà na-ekwesị ntụkwasị obi nke Jehova Chineke. Anyị ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ezere oké iro ụra ime mmụọ ma nọgide n’esepụghị aka, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ịgbasa “ozi ọma ebighị ebi” nke Alaeze Chineke e guzobere eguzobe.—Mkpughe 14:6.

‘Obi Ụtọ Na-adịrị Onye Na-edebe Okwu Ndị A’

16. N’ihi gịnị ka isiakwụkwọ ndị ikpeazụ nke Mkpughe ji bụrụ kpọmkwem ihe na-enye obi ụtọ?

16 Ndị ji obi ụtọ na-agụ akwụkwọ Mkpughe pụrụ nnọọ ịmali n’ọṅụ ka ha na-agụ isiakwụkwọ ndị ikpeazụ bụ́ ndị na-akọwa olileanya anyị dị ebube—eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, ya bụ, ọchịchị ezi omume nke Alaeze eluigwe, nke ga-achị ọha mmadụ ọhụrụ e mere ka ha dị ọcha, ha nile ana-ewetara “Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile” otuto. (Mkpughe 21:22) Ka usoro ọhụụ ndị ahụ dị ebube bịara ná njedebe, mmụọ ozi ahụ gwara Jọn, sị: “Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu: Onyenwe anyị, bụ́ Chineke nke ndị mmụọ nke ndị amụma, zitekwara mmụọ ozi Ya igosi ndị ohu Ya ihe nile na-aghaghị ịpụta na mgbe nta. Leekwa, ana m abịa ọsọ ọsọ. [Obi ụtọ, NW] na-adịrị onye na-edebe okwu nile nke amụma nke akwụkwọ a.”—Mkpughe 22:6, 7.

17. (a) Mmesi obi ike dị aṅaa ka a na-enye ná Mkpughe 22:6? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịnọ na nche izere?

17 Ndị ji obi ụtọ na-agụ Mkpughe ga-echeta na e kwuru okwu yiri ndị a ná mmalite nke “akwụkwọ” ahụ. (Mkpughe 1:1, 3) Okwu ndị a na-emesi anyị obi ike na “ihe nile” e buru n’amụma n’akwụkwọ ikpeazụ a nke Bible ‘ga-apụta na mgbe nta.’ Anyị na-ebi n’ime ime mgbe ọgwụgwụ ahụ bụ́ mgbe ihe omume ndị dị mkpa e buru n’amụma ná Mkpughe na-aghaghị imezu ngwa ngwa n’ụzọ na-esochi nnọọ ibe ha. Ya mere, ihe ọ bụla nke na-eme ka o yie ka ihe ọ dịwala mma n’usoro ihe Setan ekwesịghị ime ka anyị hie ụra. Onye mụ anya na-agụ ya ga-echeta ịdọ aka ná ntị ndị ahụ e nyere n’ozi ndị ahụ e zigaara ọgbakọ asaa dị n’Esia, ọ ga-ezerekwa ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, ikpere arụsị, omume rụrụ arụ, ịdị ṅara ṅara, na ịrọ òtù nke ndị si n’ezi ofufe dapụ.

18, 19. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs ka ga-eji bịa, oleekwa olileanya Jọn kwupụtara nke anyị onwe anyị na-ekwupụtakwa? (b) N’ihi nzube dị aṅaa ka Jehova ka ga-eji “bịa”?

18 N’akwụkwọ Mkpughe, Jisọs kwupụtara ọtụtụ ugboro, sị: “Ana m abịa ọsọ ọsọ.” (Mkpughe 2:16; 3:11; 22:7, 20a) Ọ ka ga-abịarịrị imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ Babilọn Ukwu ahụ, usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị Setan, nakwa n’ahụ ndị nile jụrụ ido onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Jehova, dị ka e gosipụtara ya ugbu a site n’Alaeze Mesaịa ahụ. Anyị na-esonyere Jọn onyeozi, bụ́ onye tiri mkpu, sị: “Amen: bịa, Onyenwe anyị Jisọs.”—Mkpughe 22:20b.

19 Jehova n’onwe ya na-ekwu, sị: “Lee, ana m abịa ọsọ ọsọ; ụgwọ ọrụ m dịkwa n’aka m, inyeghachi onye ọ bụla dị ka ọrụ ya sị dị.” (Mkpughe 22:12) Ka anyị na-echere ụgwọ ọrụ ahụ dị ebube nke ndụ na-enweghị ọgwụgwụ dị ka otu akụkụ nke ma ọ́ bụghị “eluigwe ọhụrụ” ahụ e kwere ná nkwa ọ̀ bụrụ “ụwa ọhụrụ” ahụ, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi sonye n’ịkpọ ndị nile nwere obi eziokwu òkù, sị: “Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Ka ha onwe ha ghọọkwa ndị ji obi ụtọ na-agụ akwụkwọ Mkpughe ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, nke na-akpalikwa akpali!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, peji nke 28-29, 136 (nkọwa ala ala peji).

Isi Ihe Ndị A Ga-atụleghachi

◻ Olee usoro Jehova ji mee ihe n’izite Mkpughe, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee obi ụtọ ịgụ ozi ndị ahụ e zigaara ọgbakọ asaa ahụ dị n’Esia?

◻ Olee otú a pụrụ isi chebe anyị “n’oge awa nke ọnwụnwa ahụ”?

◻ Olee obi ụtọ anyị ga-enwe ma ọ bụrụ na anyị edebe okwu ndị dị n’akwụkwọ ahụ Mkpughe dị na ya?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Obi ụtọ na-adịrị ndị matara Isi Iyi nke ozi obi ụtọ ahụ

[Foto dị na peeji nke 18]

Obi ụtọ na-adịrị onye mụ anya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya