Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwfq isiokwu 54
  • Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ewere Ịgba Alụkwaghịm?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ewere Ịgba Alụkwaghịm?
  • Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndịàmà Jehova, hà na-enyere ndị alụmdi na nwunye ha chọrọ itisa aka?
  • Ndị okenye ọgbakọ, hà ga-akwado Onyeàmà Jehova chọrọ ịgba alụkwaghịm?
  • Olee otú Ndịàmà Jehova si ewere nkewa?
  • Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ịgba Alụkwaghịm na Nkewa
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-ele Alụmdi na Nwunye Anya Dị Ka Ihe Dị Nsọ?
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
ijwfq isiokwu 54
Foto agbamakwụkwọ a dọwara adọwa

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ewere Ịgba Alụkwaghịm?

Anyị ji ihe Baịbụl kwuru gbasara alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm kpọrọ ihe. Mgbe Chineke malitere alụmdi na nwunye, ọ chọrọ ka a ghara inwe mgbe di na nwunye ga-ahapụ ibe ha. Naanị ihe Baịbụl kwuru nwere ike ime ka mmadụ gbaa alụkwaghịm bụ ma di ya ma ọ bụ nwunye ya kwaa iko.—Matiu 19:5, 6, 9.

Ndịàmà Jehova, hà na-enyere ndị alụmdi na nwunye ha chọrọ itisa aka?

Ee, n’ọtụtụ ụzọ:

  • Akwụkwọ Anyị. A na-ebipụta isiokwu ndị nwere ike inyere di na nwunye aka ka alụmdi na nwunye ha ghara itisa ma ndị nke o yiri ka ọ bụ na ha agaghị edozili nsogbu ha. Dị ka ihe atụ, lee ụfọdụ isiokwu ndị a “Ime Ka Obi Gị Dum Dịgide n’Ebe Nwunye Gị Ma Ọ Bụ Di Gị Nọ,” “Ihe Ga-enyere Di na Nwunye Aka Ịna-agbaghara Ibe Ha,” nakwa “Otú Ị Ga-esi Maliteghachi Ịtụkwasị Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Obi.”

  • Ọmụmụ Ihe. N’ọmụmụ ihe anyị nakwa ná mgbakọ anyị dị iche iche, a na-akụziri anyị ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl ga-abara ndị lụrụ dị na nwunye uru.

  • Ndị Okenye. Ndị okenye ọgbakọ na-eji ihe ndị e dere na Baịbụl enyere ndị lụrụ di na nwunye aka. Ụfọdụ ebe ha na-agụrụ ha bụ ihe dị na Ndị Efesọs 5:22-25.

Ndị okenye ọgbakọ, hà ga-akwado Onyeàmà Jehova chọrọ ịgba alụkwaghịm?

Mba. Ọ bụrụ na ndị okenye chọrọ inyere ndị nwere nsogbu na alụmdi na nwunye ha aka, ọ bụghị ndị okenye ga-ekpebiri ha ihe ha ga-eme. (Ndị Galeshia 6:5) Mana, ọ bụrụ na mmadụ ekpebie ịgba alụkwaghịm nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, ọ gaghịzi enwe ihe ùgwù ọ bụla n’ọgbakọ. N’ihi ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, onye ahụ agaghị aga lụọ onye ọzọ.—1 Timoti 3:1, 5, 12.

Olee otú Ndịàmà Jehova si ewere nkewa?

Baịbụl kwuru na di na nwunye ekwesịghị ịhapụ ibe ha ma ọ bụrụgodị na ihe agaghị otú ha tụrụ anya ya. (1 Ndị Kọrịnt 7:10-16) Ọ bụrụ na di na nwunye ana-ekpekọ ekpere ọnụ, na-eme ihe ndị Baịbụl kwuru ma hụ ibe ha n’anya, ọ ga-adịrị ha mfe idozi nsogbu ọ bụla ha nwere.—1 Ndị Kọrịnt 13:4-8; Ndị Galeshia 5:22.

Mana, ụfọdụ Ndị Kraịst ekpebiela ịhapụ dị ma ọ bụ nwunye ha n’ihi ihe ndị a:

  • Di kpachaara anya jụ ilekọta ezinụlọ ya.—1 Timoti 5:8.

  • Di ma ọ bụ nwunye na-akụ ibe ya isi aba okpu.—Abụ Ọma 11:5.

  • Ekweghị di ma ọ bụ nwunye fee Chineke. Dị ka ihe atụ, di ma ọ bụ nwunye nwere ike chọọ ịmanye di ya ma ọ bụ nwunye ya bụ Onyeàmà Jehova ka o nupụrụ Chineke isi. Onyeàmà ahụ a na-amanye imebi Iwu Chineke nwere ike kpebie na nkewa bụ naanị ihe ọ ga-eme ka o nwee ike “irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ Ndịozi 5:29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya