13 Ozugbo ahụ, Devid sịrị ndị agha ya: “Onye ọ bụla kee mma agha ya n’úkwù!”+ Ha niile wee kee mma agha ha n’úkwù. Devid kekwara mma agha nke ya n’úkwù. Ihe dị ka narị ụmụ nwoke anọ (400) esoro ya gawa, ebe narị ụmụ nwoke abụọ (200) nọkwa na-eche nche ebe ahụ ha mara ụlọikwuu.