3 Ma, ndị isi ndị Filistia sịrị: “Gịnị mere ndị Hibru a ji soro anyị?” Ekish asị ha: “Onye a bụ Devid onye na-ejere Sọl eze Izrel ozi. Mụ na ya anọọkwala kemgbe ihe karịrị otu afọ ugbu a.+ O nweghịkwa ihe ọjọọ ọ bụla m hụrụ o mere malite n’ụbọchị ọ gbakwutere m ruo taa.”