24 N’ikpeazụ, ha malitere ịchụ àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ. Jihu gwara ụmụ nwoke iri asatọ ka ha guzoro n’èzí, sịkwa ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu ahapụ nwoke ọ bụla n’ime ndị a m na-enyefe n’aka unu, onye ahụ ga-eji ndụ* ya kwụọ ụgwọ ya.”