18 Ndị Filistia+ lụsokwara obodo ndị dị na Shefila+ na Negeb, bụ́ ndị dị na Juda, agha ma weghara Bet-shimesh,+ Aịjalọn,+ Gedirọt, Soko na ime obodo ndị dị ya nso, Timna+ na ime obodo ndị dị ya nso, nakwa Gimzo na ime obodo ndị dị ya nso. Ha gakwara biri ebe ahụ.