3 N’afọ nke asatọ n’ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ nwata, ọ malitere ife Chineke Devid nna nna ya.+ N’afọ nke iri na abụọ n’ọchịchị ya, ọ malitekwara ime ka Juda na Jeruselem dị ọcha.+ O bibiri ebe ndị dị elu,+ ogwe osisi arụsị dị iche iche, arụsị ndị a pịrị apị,+ na arụsị ndị a kpụrụ akpụ.