27 anụla m olu gị, ebe ọ bụ na ị kpọchighị obi gị, kama, i wedara onwe gị ala n’ihu Chineke mgbe ị nụrụ ihe o kwuru gbasara obodo a na ndị bi na ya, n’ihi na i wedara onwe gị ala n’ihu m ma dọwaa uwe gị, beekwa ákwá n’ihu m.+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.